Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999
1 Mgbe ụmụ Israel na-akwado ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Mosis rịọrọ ha ka ha jiri ntụziaka Chineke kpọrọ ihe. Ọ sịrị ha: “Ọ bụghị ihe efu ka ọ bụ n’ebe unu nọ; n’ihi na nke a bụ ndụ unu.” (Deut. 32:45-47) Ọ̀ bụ na anyị adịghị ekele Jehova na ndụ anyị dị oké ọnụ ahịa nye ya nke na ọ nọgidere na-eji Okwu ya dị oké ọnụ ahịa na-eduzi anyị? N’ihi ya anyị na-atụsi anya ike maka Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke ga-ewe ụbọchị atọ na maka ihe Jehova kwadebeere anyị.
2 N’afọ a, e mere atụmatụ inwe mgbakọ distrikti n’ebe 22 ga-adịrị anyị mfe ịga gburugburu Nigeria. E wezụga Igbo, a ga-enwe usoro ihe omume ahụ n’Abụa, Bekee, Edo, Efịk, Esan, Gokana, Gun, Hausa, Ijaw, Isoko, Khana, Tiv, Ụdị Asụsụ Ogbi nke America, Urhobo, na Yoruba.
3 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i meworị ndokwa ịga ụbọchị nke ọ bụla nke mgbakọ ahụ n’ihi na i kwenyere na Jehova na-atụ anya ka ị gaa. Jide n’aka na ọ na-ahụ mgbalị na àjà ndị ohu ya na-achụ n’otu n’otu iji gaa, ọ na-ejikwa mmasị echeta ihe ndị ahụ. (Hib. 6:10) Site n’ịga ụbọchị nke ọ bụla nke mgbakọ ahụ malite n’abụ mmeghe ruo n’ekpere mmechi, anyị na-egosi Jehova na anyị ji okwu ọ na-agwa anyị kpọrọ ihe. (Deut. 4:10) Anyị na-egosikwa ekele maka ịrụsị ọrụ ike nke ọtụtụ ụmụnna anyị ndị keere òkè n’ịkwadebe maka mgbakọ ahụ.
4 Ime ndokwa ka ọtụtụ puku ndị Chineke zukọta n’ebe ọ bụla e nwere mgbakọ na-achọ ime atụmatụ na ezi nhazi tupu oge eruo. Ịmata na e jiriwo ịhụnanya mee ndokwa dị iche iche maka mgbakọ kwesịrị ịkpali anyị irube isi, ka e wee “mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.” (1 Kọr. 14:40) A na-enye ihe ọmụma na ihe ncheta ndị na-esonụ ka i wee dị njikere nke ọma ịnụ ụtọ nri ime mmụọ na mkpakọrịta ndị Kraịst mgbe ị bịarutere ná mgbakọ gị.
Tupu Mgbakọ
5 Enyemaka ọ̀ dị ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị mkpa iji mee ndokwa nke ha iji gaa mgbakọ ahụ? Ihe ha ga-ahụ na ihe ha ga-anụ mgbe ha nọ n’ebe ahụ pụrụ ịkpali ha ịghọ ndị na-efe Jehova. (1 Kọr. 14:25) Ndị okenye kwesịrị ịma banyere onye ọ bụla chọrọ enyemaka n’ihe banyere ebe obibi ma ọ bụ ego iji mee njem, karịsịa ndị meworo okenye karị nọ n’ọgbakọ, ma jiri ịhụnanya hụ na e gboro mkpa ha.—Gal. 6:10.
6 Ì mesịwo ndokwa maka ebe obibi unu? Ugbu a, odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị izigaworị fọm Room Request ọ bụla maka mkpa ndị pụrụ iche, bụ́ ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro, n’adres mgbakọ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na e nyewo gị ebe obibi ná ndokwa nke mkpa ndị pụrụ iche ma ị ghaghị ịkagbu ha, biko gwa Ngalaba Ụlọ Obibi nke ebe ahụ ozugbo ka e wee nwee ike inye onye ọzọ ebe obibi ahụ. A pụrụ ịchọta adres ha n’ala ala peji nke 2 na fọm Room Request.
7 Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa inweta ihe ọmụma banyere otu mgbakọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị adres nke otu ebe kpọmkwem, dị ka a na-achọta ya n’azụ fọm Room Request ahụ.
8 Ebe ọ bụ na e guzobere Ebe Ịnara Ọgwụ ná mgbakọ ahụ nanị iji hụ maka ọnọdụ mberede, anyị na-atụ aro ka i jiri aspirin, bandeeji, ihe e ji ekuru ọgwụ, ihe ndị na-enye aka maka nri ịgbari, na ihe ndị yiri ha nke gị bịa mgbakọ ma ọ bụrụ na i chere na ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị gị mkpa. Ọ bụrụ na gị ma ọ bụ onye ị hụrụ n’anya nwere nsogbu siri ike nke dị adị, dị ka nsogbu obi, ọrịa shuga, ma ọ bụ nọrọ n’ihe ize ndụ nke ihe ọdịdọ ịdọ gị ma ọ bụ ya, biko jiri ọgwụ ndị dị mkpa gaa mgbakọ iji gboo mkpa ndị a. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ka otu onye ezinụlọ ma ọ bụ ezigbo enyi nke ghọtara ọnọdụ ahụ soro onye ahụ nọrọ mgbe nile, ebe onye ahụ ga-akasị nye aka dị mkpa.
9 Ohere ịgba àmà yiri ka ha ga-apụta mgbe ị na-eje ma ọ bụ na-ala mgbakọ. Ị̀ ga-adị njikere isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ahụ? Anyị nile, gụnyere obere ụmụaka, pụrụ ikere òkè site n’inyefe ndị na-ere mmanụ ụgbọala, ndị na-anakọta ego n’okporo ụzọ, na ndị ọzọ ị na-ezute ka ị na-eme njem, traktị. Ohere ga-apụtakwa inyefe ndị nwere mmasị magazin, broshuọ, ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ. Dị njikere ịgba àmà mberede nye ndị a pụrụ ịhapụ n’ụzọ ime nkwusa anyị na-ejikarị eme ihe.
N’oge Mgbakọ
10 Ihe omume ga-amalite n’elekere anya 9:20 nke ụtụtụ na Friday, na n’elekere anya 9:00 nke ụtụtụ na Saturday na Sunday. Ị pụrụ ịchọta oche nanị maka ndị ezinụlọ gị kpọmkwem ma ọ bụ ndị so gị n’ụgbọala. A ga-ahapụrụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị meworo agadi oche ndị dị ntụsara ahụ. Ọ gaghị ekwe omume idebe ọnụ ụlọ ndị pụrụ iche ná mgbakọ maka ndị nwere ọrịa ndị ọ bụ gburugburu ebe obibi ma ọ bụ ihe ndị ahụ na-anabataghị na-akpata. Kwa ụbọchị ka ị na-esi n’ebe ị nọdụrụ ala na-apụ, biko legharịa anya iji hụ na i buuru ngwongwo gị nile.
11 Ị̀ ga-eme baptism ná mgbakọ distrikti ahụ? Maka nnọkọ ụtụtụ Saturday, a ga-edebe otu akụkụ pụrụ iche maka ndị a ga-eme baptism, ndị atendantị ga-egosikwa gị ebe a. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwetụ omume, biko nọrọ oche n’ebe ahụ tupu ihe omume amalite. Jiri Bible gị, akwụkwọ abụ gị, ákwà nhicha ahụ, na ákwà ịsa ahụ kwesịrị ekwesị bịa. Uwe e gbubiri egbubi (nịka ndị bụ́ traụza jeans e bepụrụ ụkwụ ogologo ya n’ikpere ma ọ bụ ebe na-erughị n’ikpere), polo ndị e dere ihe na ha, na uwe ndị yiri ha ekwesịghị ekwesịghị maka ihe omume ahụ dị ùgwù. Ndị okenye so ndị a ga-eme baptism na-atụleghachi ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ Ozi Anyị kwesịrị ijide n’aka na onye nke ọ bụla ghọtara isi ihe ndị a. Ebe baptism bụ ngosipụta nke nrara mmadụ raara onwe ya nye Jehova Chineke, ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ka ndị a ga-eme baptism jide aka mgbe a na-eme ha baptism.
12 Ị pụrụ iji kamera, camcorder, ígwè tepu mee ihe ná mgbakọ ahụ. Otú ọ dị, ebe e debere ha ma ọ bụ otú e si jiri ha na-eme ihe ekwesịghị ịnọchi ụzọ ngafe, nọchie ndị ọzọ ihu, ma ọ bụ dọpụ uche n’ihe omume ahụ. Ha aghaghị inwe ike ịrụ ọrụ n’onwe ha—ya bụ, n’akwụnyeghị ha n’usoro eletrik ma ọ bụ nke ígwè okwu. O kwesịghị ekwesị mmadụ ịkpọsa achụmnta ego ise foto ya ma ọ bụ ịchọ ndị ahịa ná mgbakọ.
13 N’ihi oge na ime ka ihe dị mfe, Society agwawo anyị ka anyị jiri nri ehihie nke anyị na-abịa mgbakọ kwa ụbọchị. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụnna agbasowo ntụzi a, ha achọpụtawokwa na mgbe a gbasasịrị maka ezumike ehihie, ha pụrụ isoro ezinụlọ ha nọdụ ma rie ihe ha jiri bịa n’ụbọchị ahụ. Ọtụtụ ekwuwo na ohere nke ịtụsara ahụ n’oge ezumike ehihie na inwekwu oge iji soro ụmụnna ha nwoke na nwanyị nọkọọ abụrụwo nke na-atọ ụtọ. Nke a na-achọ isi n’ụlọ jiri ihe oriri nke anyị bịa. Anyị na-arịọ ka ndị nile bịaranụ gbasoo ntụziaka a.
14 Ị̀ pụrụ iwepụta onwe gị n’afọ ofufo iji nye aka debe ihe owuwu ahụ ọcha mgbe nnọkọ mechisịrị kwa ụbọchị? Ka ị̀ pụrụ ịrụ ọrụ n’otu n’ime ngalaba mgbakọ? Ọ bụrụ na ị pụrụ inye aka, biko bịa ná Ngalaba Ije Ozi Afọ Ofufo ná mgbakọ ahụ. A na-anabata obere ụmụaka iso nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye okenye ọzọ ji ihe akpọrọ ihe rụkọọ ọrụ. N’ezie, onye ọ bụla pụrụ inye aka idebe ihe owuwu ahụ ọcha site n’ịhụ na a tụtụlitere ahịhịa ọ bụla ma tụfuo ya n’ebe kwesịrị ekwesị.
15 Anyị enwetawo nduzi ndị dị mma banyere ihe bụ uwe na ejiji dị mma ná mgbakọ anyị dị iche iche. Dị ka ihe atụ: Anyị nwere ihe nduzi n’okwu a n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị dị iche iche, anyị nwere foto na ihe osise ndị dị n’akwụkwọ anyị dị iche iche, nke kasịkwa mkpa, anyị nwere ihe Jehova kwuru n’ime Bible. (Rom 12:2; 1 Tim. 2:9, 10) Ndị mmadụ maara ndị anyị bụ na ihe mere anyị ji zukọta n’obodo ha. N’ihi ya, uwe na ejiji anyị bụ àmà dị ike n’onwe ya. Ihe ka ukwuu ná ndị Jehova na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ anyị na-ahụ ka a na-egosipụta mmụọ nke ụwa n’uwe na ejiji nke ụfọdụ ndị na-abịa mgbakọ anyị. Ụdị uwe ọ bụla na-adịghị ekpuchicha ahụ nke ọma na-eme ka a na-enyo nzọrọ onye ahụ na-azọrọ na ya bụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe enyo. Ejiji kwesịrị ekwesị, nke dị ọcha, ma dị mma n’anya bụ ihe na-akasị mma. Ya mere, ndị isi ezinụlọ kwesịrị ilebara ihe ndị ezinụlọ ha na-eme atụmatụ iyi anya. Nke a kwesịkwara ịdị otú a mgbe anyị na-anọghị n’ebe a na-enwe mgbakọ. Iyi baaji anyị tupu na mgbe nnọkọ nke ụbọchị ahụ gasịrị na-emekwu ka a mata anyị dị ka ndị nke Jehova na ndị ya na-adị ọcha.—Tụlee Mak 8:38.
16 E nyere Eze Solomọn maara ihe ike mmụọ nsọ ikwu na “uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata” nakwa na “nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 22:15; 29:15) N’oge nnọkọ na-aga n’ihu, Ndịàmà na-eto eto na-enweghị onye na-elekọta ha akpataworo ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-agbalị irite uru n’ihe omume ahụ mkpaghasị uche. O doro anya na ndị ntorobịa a adịghị erite uru n’ihe omume ime mmụọ ahụ e bu ha n’uche kwadebe. Ebe ndị mụrụ ụmụ ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova maka àgwà ụmụ ha, nne ma ọ bụ nna pụrụ ijide n’aka na ụmụ ya na-akpa ezi àgwà ma na-aṅa ntị ná ntụziaka Jehova nanị ma ọ bụrụ na ya na ụmụaka ahụ nọ. Ndị atendantị ga-agakwuru ndị ọ bụla na-akpata mkpaghasị uche ma rịọ ha ka ha kwụsị ime otú ahụ, jiri obiọma na-echetara ha ka ha na-aṅa ntị n’ihe omume ahụ.
17 N’ihi na anyị na-anabata ọha na eze ná mgbakọ anyị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịkpachara anya banyere ụmụaka na ihe onwunwe anyị. Ụmụ anyị bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa si n’aka Jehova bịa. Ma anyị maara na ụwa nwere àgwà Setan nke iji ndị ọzọ mere anụ oriri. N’ihi ya, biko mara ebe ụmụ gị nọ mgbe nile. Ọzọkwa, i kwesịrị iji kamera, pọọsụ, na ihe ndị ọzọ bara uru nọrọ ebe ị nọ mgbe nile n’ahapụghị ha n’oche gị. Jide n’aka na ị kpọchiri ụgbọala gị, ma tinye ihe onwunwe gị n’azụ ụgbọala ebe a na-etinye ibu ma ọ bụ buru ha mgbe ị na-apụ. Nke a na-ebelata ọnwụnwa nke mmadụ ịkpaka ụgbọala gị.
18 Ngalaba Ụlọ Obibi nke ebe ahụ nwere oké mmasị inyere gị aka ma ọ bụrụ na nsogbu ebilite n’ihe banyere ebe obibi gị. Biko gwa Ngalaba Ụlọ Obibi nsogbu ọ bụla i nwere mgbe ị ka nọ ná mgbakọ ahụ. Ụmụnna ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka idozi nsogbu ahụ ka i wee nwee ike ịnọgide na-anụ ụtọ mgbakọ ahụ.
19 Ọ bụ ihe na-agba ume ịhụ ụmụnna nwoke na nwanyị ka ha na-edetu ihe mgbe nnọkọ mgbakọ na-aga n’ihu. Idetu ihe ndị dị mkpirikpi ga-enyere gị aka itinye uche n’ihe na ichetaghachi isi ihe dị iche iche. Gị na ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị ịtụleghachi ihe ndị i deturu mgbe e mesịrị na-enye gị ohere ịtụgharị uche n’isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ka ị ghara ichefu ha.
20 Ndị Jehova bụ ndị na-emesapụ aka mgbe nile n’inye onyinye maka ọdịmma ọchịchị Chineke. (Ọpụ. 36:5-7; 2 Ihe 31:10; Rom 15:26, 27) A na-eji onyinye afọ ofufo i nyere maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ akwụ ụgwọ mmefu ndị e jikọtara ha na ilekọta ihe owuwu ndị buru ibu a na-anọ enwe mgbakọ. Ọ bụrụ na i ji akwụkwọ ndọrọ ego dee onyinye gị, biko dee ka a kwụnyere ya “Watch Tower.”
21 Dị ka e dekọrọ n’Emọs 3:7, Jehova sịrị na ya “agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma.” Dị ka “Onye na-ekpughe ihe nzuzo nile,” Jehova emewo ka e detuo n’ime Bible ọtụtụ narị amụma ndị e mezuworo n’ụzọ zuru ezu na n’ụzọ ziri ezi. (Dan. 2:28, 47) A ka ga-emezu nkwa ndị dị ebube. Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999 ga-ewusi okwukwe i nwere ná nkwa Chineke ike. Gee ntị nke ọma n’okwu Jehova na-agwa gị. Jiri ihe ndị ị ga-ahụ ma nụ mee ihe—n’ozi, n’ọgbakọ, na ná ndụ ị na-adị. Anyị na-arịọ ka ngọzi Jehova dịkwasị ná ndokwa nile ị na-eme iji gaa oriri ime mmụọ a jupụtara n’ihe ndị dị mma kwa ụbọchị n’ụzọ bara ụba!
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Mee atụmatụ ịga ụbọchị nile Friday, Saturday, na Sunday!