Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 1 p. 3-5
  • Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ịmata Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ịmata Eziokwu
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì NWERE IKE ỊMATALI EZIOKWU?
  • IHE Ị GA-EME KA Ị MATA EZIOKWU
  • AKWỤKWỌ PỤRỤ ICHE NKE NA-AKỤZI EZIOKWU
  • Gịnị Mere M Na-apụghị Ịmụta Ihe?
    Teta!—1996
  • Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 1 p. 3-5
Ebe otu nwoke na-ele akwụkwọ ndị juru n’otu ọ́bá akwụkwọ

Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ịmata Eziokwu

Ịmata eziokwu ga-eme ka anyị dịrị ndụ. Dị ka ihe atụ, chegodị uru ịmata azịza ajụjụ a baarala anyị: Olee otú ọrịa na-efe efe si agbasa?

Ruo ọtụtụ puku afọ, o nweghị onye ma azịza ajụjụ ahụ. N’oge ndị ahụ, ọrịa na-efe efe nọkwa na-egbu ọtụtụ nde mmadụ. Ma, ndị sayensị mechara chọpụta nke bụ́ eziokwu. Ha chọpụtara na ihe na-akpatakarị ọrịa bụ ụmụ nje dị iche iche. Eziokwu a ha chọpụtara enyerela ndị mmadụ aka igbochi ọrịa na ịgwọ ọtụtụ ọrịa. O meekwala ka ahụ́ gbasikwuo ọtụtụ ijeri mmadụ ike, ha ana-adịkwu ogologo ndụ.

Gịnịkwanụ gbasara ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa? Olee uru i chere ịmata nke bụ́ eziokwu gbasara azịza ajụjụ ndị a ga-abara gị?

  • Ònye bụ Chineke?

  • Ònye bụ Jizọs Kraịst?

  • Gịnị bụ Alaeze Chineke?

  • Olee otú ihe ga-adị n’ọdịnihu?

Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtala azịza ajụjụ ndị ahụ. O meekwala ka ndụ ha kakwuo mma. Azịza ndị ahụ nwekwara ike ịbara gị uru.

Ì NWERE IKE ỊMATALI EZIOKWU?

I nwere ike ịna-eche sị, ‘Olee otú m ga-esi amatali nke bụ́ eziokwu n’ihe ọ bụla?’ A sị kwuwe, ịmata nke bụ́ eziokwu gbasara ọtụtụ ihe yiri ka ọ̀ na-esiwanye ike. N’ihi gịnị?

Ọtụtụ mmadụ atụkwasịghị ndị ọchịchị, ndị ahịa ma ọ bụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi obi ka ha gwa ha eziokwu. Ọ naghị adịrị ha mfe ịmata mgbe mmadụ na-ekwu eziokwu, mgbe ọ na-ekwu ihe o chere, mgbe ọ na-ezochiri ha ihe ụfọdụ ma ọ bụ mgbe ọ na-aghara ha ụgha. N’oge anyị a, ndị mmadụ anaghịzi atụkwasị ibe ha obi, ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu anaghịkwa abụ eziokwu. O meela ka ndị mmadụ gharazie ịna-ekweta nke bụ́ eziokwu, ha anaghịkwa achọ ịma otú o si gbasa ha.

N’agbanyeghị ihe ndị a, ị ga-amatali azịza ajụjụ ndị kacha echu ndị mmadụ ụra. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ ime otu ihe ahụ ị na-eme ma ị chọọ ịmata azịza ajụjụ ndị na-adịchaghị mkpa.

IHE Ị GA-EME KA Ị MATA EZIOKWU

Kwa ụbọchị, o nwere ihe ụfọdụ ị na-agba mbọ ịmata eziokwu banyere ha. Chegodị gbasara ihe Jessica mere. Ọ sịrị: “Ahụekere anatụghị adị nwa m nwaanyị mma n’ahụ́, nke na o nwere ike ịnwụ ma o rie nri ọ bụla nwere obere protin si n’ahụekere.” Jessica kwesịrị ịma ma nri ọ chọrọ ịzụtara nwa ya, ọ̀ ga-adị ya mma n’ahụ́. O kwuru sị: “Ihe mbụ m na-eme bụ iji nwayọọ gụọ ihe a mapawara n’ahụ́ nri ahụ ka m mata ihe ndị e ji mee ya. M na-emezi nchọnchọ, jụọkwa ụlọ ọrụ mepụtara nri ahụ ajụjụ, iji jide n’aka na e nwetụghị protin si n’ahụekere a gwakọtara na ya mgbe a na-emepụta ya. M na-emekwu nchọchọ n’ebe ndị m ma ga-agwa m eziokwu iji mee ka obi sie m ike na otú ụlọ ọrụ ahụ si emepụta nri ha dị mma.”

Ebe nwoke ahụ na-ele ihe e dere n’otu akwụkwọ o weere n’ọ́bá akwụkwọ ahụ ma jiri ya na-atụnyere nke dị na tablet ya

O nwere ike ịbụ na ajụjụ ndị ị na-agba mbọ ịmata azịza ha kwa ụbọchị adịchaghị mkpa ka nke Jessica. Ma, i nwere ike ime ihe ndị na-esonụ ka ị mata azịza ajụjụ ndị na-echu gị ụra otú ahụ Jessica mere:

  • Chọpụta nke bụ́ eziokwu.

  • Mekwuo nchọnchọ.

  • Jide n’aka na a naghị enyo ebe i si amata nke bụ́ eziokwu enyo.

Ime ihe ndị a nwere ike inyere gị aka ịchọpụta azịza ajụjụ ndị ahụ na-echu gị ụra. Olee otú ị ga-esi eme ya?

AKWỤKWỌ PỤRỤ ICHE NKE NA-AKỤZI EZIOKWU

Mgbe Jessica na-achọ ịmata eziokwu Baịbụl, o mekwara ihe ndị ahụ ọ na-eme iji chọpụta nri ndị na-agaghị enye nwa ya nsogbu n’ahụ́. Ọ sịrị: “Iwetu obi gụọ Baịbụl na ime ezigbo nchọnchọ nyeere m aka ịmata eziokwu Baịbụl.” Ọtụtụ nde mmadụ emeela ka Jessica. Ha amụtala ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Chineke bu n’obi kee anyị?

  • Olee ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ?

  • Gịnị mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ?

  • Olee ihe Chineke na-eme iji kwụsị ahụhụ ndị mmadụ na-ata?

  • Olee otú anyị nwere ike isi na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị?

Ebe nwoke ahụ na-agụ Baịbụl ma mepee laptọp ya

I nwere ike inweta azịza ajụjụ ndị a nakwa ndị ọzọ ma ị gụọ Baịbụl, mekwuokwa nchọnchọ na www.jw.org/ig.

A ga-atụle ajụjụ ndị a n’Ụlọ Nche a:

  • Ònye bụ Chineke?

  • Ònye bụ Jizọs Kraịst?

  • Gịnị bụ Alaeze Chineke?

  • Olee otú ihe ga-adị n’ọdịnihu?

Ma, ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Baịbụl ga-agwali anyị eziokwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya