Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite July 10
Abụ nke 7
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu banyere akụkọ ozi March maka mba a na ọgbakọ unu. Dọrọ uche gaa n’igbe bụ́ “Lee Anya n’Azụ Peeji,” meekwa ihe ngosi nke otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha, ndị ga-adị irè n’ókèala unu.
15 min: “Anyị Apụghị Ịghara Ikwu Okwu.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Mesie ike ihe ndị mere anyị ji eji nnọọ ọrụ nkwusa anyị akpọrọ ihe. Gụnye isi ihe ndị dabara adaba site n’Ụlọ Nche nke January 15, 1997, peeji nke 23-24.
18 min: “Ka E Mee Ihe Nile Ka E Wee Wulie Mmadụ Nile Elu Dị Ka Ụlọ.” Ndị okenye abụọ ekwurịta isiokwu a. Gụpụta paragraf nke ọ bụla na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha. Mee ka ụkpụrụ ndị dị na ha pụta ìhè. Mesie ike mkpa nghọta dị mgbe a na-ekwu okwu azụmahịa ma ọ bụ mgbe a na-eme atụmatụ achụmnta ego. Tụleghachi ndụmọdụ dị n’Ụlọ Nche nke March 15, 1997, peeji nke 18-19, 22.
Abụ nke 15 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 17
Abụ nke 23
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Kọwaa ná mkpirikpi ụzọ isi jiri broshuọ bụ́ Aha Nsọ nyere onye nwere mmasị aka ịghọta mkpa ọ dị ịmara na iji aha Chineke na-eme ihe.—Lee akwụkwọ Reasoning, peeji nke 196-197.
13 min: “Soro Ndị Ọzọ Kerịta Ihe Dị Ka Mkpa Ha Si Dị.” Okwu onye okenye ga-ekwu.
20 min: Ònye Kwesịrị Ịbụ Onye Nlereanya Gị? Otu nna eduzie ọmụmụ ihe ezinụlọ ya, ya na otu ma ọ bụ ụmụ ya abụọ nọ n’afọ iri na ụma. Ọ chọpụtawo n’oge na-adịbeghị anya na mkparịta ụka ha na-abụkarị banyere ndị ọkà n’egwuregwu, ndị ọkà n’ime ihe nkiri sịnịma, ndị na-eme ihe nkiri TV, na ndị na-eti egwú. O kwupụta nchegbu ya n’ihi na ụdị mmasị a bụ ngosipụta nke mmụọ nke ụwa. Ha atụlee mbipụta June 8, 1998, nke Teta!, peeji nke 23-25. Ndị ntorobịa ahụ aghọta na e nwere ihe ize ndụ dị n’inwe mmasị gabigara ókè n’ebe ndị a ma ama n’ụwa nọ ma kweta na ịbụ ndị a maara aha ha n’ụwa enweghị uru ọ ga-abara ndị Kraịst. Ha atụlee uru ndị dị n’iwere ndị nne na nna, ndị okenye, na ndị ọzọ na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ—karịsịakwa Jisọs Kraịst—dị ka ndị nlereanya ha.
Abụ nke 34 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 24
Abụ nke 45
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: Ime Ka A Mara Anyị Dị Ka Ndị Ozi Chineke. Ndị ohu na-eje ozi abụọ atụlee ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’Ụlọ Nche, nke December 15, 1998, peeji nke 19-20. Ha aghọta mkpa ọ dị iru eru n’ụzọ dị mma dị ka ndị ohu na-eje ozi ma tụleghachi ihe ndị ha pụrụ ime n’onwe ha iji gosi na ha na-arụzu ọrụ ha. Ha ahụ mkpa ọ dị ịbụ ndị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ozi ubi ma kwurịta ụzọ ndị ha pụrụ isi baara ndị okenye uru n’inyere ndị ọzọ aka n’onwe ha. Ha ekweta na ha chọrọ ime ihe nile ha pụrụ ime iji nyere ọgbakọ aka ịghọta ịdị ngwa nke oge a na ito eto na ịga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ.
10 min: Idegara Ndị Anyị Na-enweghị Ike Ịkpọtụrụ Akwụkwọ Ozi. Okwu na ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Ebe ọ na-esiwanye ike ịhụ ndị mmadụ n’ụlọ, ụfọdụ ndị nkwusa na-arụpụta ihe ndị dị mma site n’ide akwụkwọ ozi. Tụlee ụkpụrụ nduzi ndị a. Akwụkwọ ozi ahụ kwesịrị ịdị nkenke, dabere n’Akwụkwọ Nsọ, ma dị ùgwù. Ezigala akwụkwọ ozi a na-edeghị aha na ya. Dee ihe ma ọ bụ jiri ígwè typewriter dee ihe nke ọma n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Denye adres Ụlọ Nzukọ Alaeze na oge ọgbakọ ji enwe nzukọ gụnyere ọkpụkpọ òkù ịbịa. Ejila adres Society ezipụ ozi. Tụleghachi aro ndị a tụrụ n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ peeji nke 102-103, na Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke November 1996.
15 min: Jiri Okwu Mmeghe Ndị Dị Irè Na-eme Ihe. Họrọ otu ma ọ bụ okwu mmeghe abụọ site na peeji nke 2-7 n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, ma tụlee otú a pụrụ isi jiri ndị a mee ihe n’ụzọ dị irè n’ókèala unu. Jụọ ndị na-ege ntị, sị, “Okwu mmeghe ndị dị aṅaa ka unu na-eji eme ihe mgbe unu na-agakwuru mmadụ n’okporo ámá, n’ịgba àmà mberede, ma ọ bụ n’ọnọdụ ndị ọzọ?” Mee ihe ngosi nke otu okwu mmeghe ma ọ bụ abụọ dị ka oge nyere ohere ya.
Abụ nke 54 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 31
Abụ nke 66
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi maka July. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịkọ ahụmahụ ndị ha nwere n’ọnwa a mgbe ha na-ekesa broshuọ.
12 min: Mkpa ọgbakọ.
18 min: “Ì Nwere Ekele Maka Ndidi Jehova?” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị dabara adaba banyere ogologo ntachi obi Jehova.—Lee Insight, Mpịakọta nke 2 peeji nke 263-264.
Abụ nke 75 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 7
Abụ nke 88
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
17 min: “Ị̀ Bụ Onye Ihere?” Ajụjụ na azịza. Kọọ otu ahụmahụ na-agba ume sitere na 1997 Yearbook peeji nke 43-44.
20 min: Mara Ihe n’Ọdịnihu Gị. Okwu okenye ga-ekwu. Ndị na-eto eto chọrọ isoro ndị ha hụrụ n’anya nwee ọdịnihu obi ụtọ. Ọ bụ ezie na nke a bụ ihe e bu pụta ụwa, ha aghaghị itinye ndụmọdụ Chineke n’ọrụ ma ọ bụrụ na ha ga-enwe ihe ịga nke ọma. (Ilu 19:20) Mmasị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe mmadụ nọ na-esi ike n’oge ntorobịa. Ọ bụrụ na a chịkwaghị mmetụta a achịkwa, ihe ndị ga-esi na ya pụta pụrụ ịdị oké njọ. Ọtụtụ ajụjụ na-ebilite banyere amamihe dị ná ndị nọ n’afọ iri na ụma inwe mmetụta ịhụnanya miri emi n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha nọ, ịmalite mkpakọrịta ịhụnanya nke na-eduje n’iyi oge. Tụleghachi ndụmọdụ dị n’akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, peeji nke 231-235. Mee ka isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’Ụlọ Nche nke November 15, 1999, peeji nke 18-23 pụta ìhè, bụ́ ndị na-egosi mkpa ọ dị ndị na-eto eto ịrụzu ibu ọrụ ha nile n’ebe Chineke nọ. Gbaa ndị nọ n’afọ iri na ụma ume ka ha tụgharịa uche na ndụmọdụ a ma soro ndị mụrụ ha kwurịta ya ma ọ bụrụ na ha nwere ajụjụ.
Abụ nke 101 na ekpere mmechi.