Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2002
Ntụziaka
N’afọ 2002, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi [kl-IB], na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ [ fy-IB] ga-abụ ebe ndị a ga-esi na-enye ihe omume.
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata dị nkenke malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE. Ọ dịghị mkpa ikwu ihe ndị a ga-atụ anya ha n’usoro ihe omume ahụ. Ka onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-akpọlite ihe omume nke ọ bụla, ọ ga-ekwu isiokwu a ga-ekwu okwu na ya. Gaa n’ihu n’usoro a:
IHE OMUME NKE 1: minit 15. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ime nke a, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche. E kwesịrị ime ihe omume a dị ka okwu izi ihe nke ga-ewe minit 15 n’enweghị ajụjụ ọnụ. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe dị n’akwụkwọ ahụ kama ilekwasị anya n’abamuru nke ihe ọmụma ahụ a na-atụle, na-eme ka ihe ga-akasị baara ọgbakọ uru pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe.
Ụmụnna e kenyere okwu a kwesịrị ilezi anya ka ha ghara ịgabiga oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha ma ọ dị mkpa ma ọ bụ ọ bụrụ na ọkà okwu ekwuo ka e nye ya.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: minit 6. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ime nke a, bụ́ onye ga-atụle isiokwu ahụ n’ụzọ dị irè n’ikwekọ ná mkpa ọgbakọ. Ọ dịghị mkpa ka e nwee isiokwu. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe ọgụgụ ahụ e kenyere ka a gụọ. A pụrụ ịgụnye ntụleghachi nke isiakwụkwọ Bible nile e kenyere bụ́ nke ga-ewe sekọnd 30 ruo 60. Otú ọ dị, nzube ya bụ́ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere na ụzọ ihe ọmụma ahụ si baara anyị uru. Mgbe ahụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwa ndị mmụta ka ha gaa na klas ha dị iche iche.
IHE OMUME NKE 2: minit 5. Nke a bụ ọgụgụ Bible nke ebe e kenyere ka a gụọ, nke nwanna nwoke ga-agụ, ma onye mmụta ahụ ọ̀ nọ n’ụlọ akwụkwọ nke mbụ ma ọ bụ n’ìgwè ndị ọzọ. Ọgụgụ ihe ahụ na-adịkarị nkenke iji nye ndị mmụta ahụ ohere ikwu okwu nkọwa dị mkpirikpi ná mmalite na ná mmechi okwu ha. A pụrụ iwebata akụkọ ihe mere eme, nghọta nke okwu amụma ma ọ bụ ozizi, na ụzọ a pụrụ isi jiri ụkpụrụ dị iche iche mee ihe. E kwesịrị ịgụ amaokwu nile ahụ e kenyere n’akwụsịtụghị akwụsị. Otú ọ dị, mgbe amaokwu ndị a gaje ịgụ na-esochighị onwe ha, onye mmụta ahụ pụrụ ịkpọ amaokwu ebe ọgụgụ ihe ahụ gafere.
IHE OMUME NKE 3: minit 5. A ga-ekenye nwanna nwanyị nke a. Isiokwu nke okwu a ga-adabere n’Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A pụrụ iji ọnọdụ okwu ọ bụla kwesịrị ekwesị maka ókèala unu mee ihe, ndị na-eme ya pụkwara ịnọdụ ala ma ọ bụ iguzo ọtọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta ahụ si kọwaa isiokwu ahụ e kenyere ya ma nyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche. Onye mmụta e kenyere ihe omume a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye otu onye inyeaka, ma a pụrụ ijikwu onye inyeaka ọzọ mee ihe. Ọ bụghị ọnọdụ okwu ahụ kama ụzọ e si jiri Bible mee ihe n’ụzọ dị irè bụ ihe e kwesịrị ichebara echiche karịsịa.
IHE OMUME NKE 4: minit 5. Isiokwu nke ihe omume a ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. A pụrụ ikenye nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị Ihe Omume nke 4. Mgbe ọ bụla e kenyere ya nwanna nwoke, o kwesịrị ịbụ okwu. Mgbe e kenyere ya nwanna nwanyị, e kwesịrị ime ya dị ka a kọwapụtara maka Ihe Omume nke 3. Ọzọkwa, mgbe ọ bụla e nwere akara bụ́ # n’ihu Ihe Omume nke 4, a ga-ekenye ya nwanna nwoke.
USORO ỌGỤGỤ BIBLE: A na-agba onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ume igbaso usoro ọgụgụ Bible kwa izu, bụ́ nke pụtara ịgụ ihe dị ka otu peeji kwa ụbọchị.
RỊBA AMA: Iji nwetakwuo ihe ọmụma na ntụziaka banyere ndụmọdụ, idebe oge, ntụleghachi odide, na ịkwadebe ihe omume, biko lee peeji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996.
USORO IHE OMUME
Jan. 7 Ọgụgụ Bible: Eklisiastis 1-6
Abụ nke 59
Nke 1: “Tụọ Egwu Chineke, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu”—Akụkụ nke 1 (w87 9/1 p. 30 para. 1–p. 31 para. 1)
Nke 2: Eklisiastis 4:1-16
Nke 3: Chineke Chọrọ Ka I Nwee Ọdịnihu Obi Ụtọ (kl p. 6-7 para. 1-5)
Nke 4: #Ezinụlọ Nọ n’Ọgba Aghara ( fy p. 5-9 para. 1-14)
Jan. 14 Ọgụgụ Bible: Eklisiastis 7-12
Abụ nke 25
Nke 1: “Tụọ Egwu Chineke, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu”—Akụkụ nke 2 (w87 9/1 p. 31 para. 2-20)
Nke 2: Eklisiastis 8:1-17
Nke 3: Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs—Ọ Bụghị Nrọ (kl p. 7-9 para. 6-10)
Nke 4: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ( fy p. 10-12 para. 15-23)
Jan. 21 Ọgụgụ Bible: Abụ nke Abụ 1-8
Abụ nke 11
Nke 1: Ezi Ịhụnanya Na-enwe Mmeri (w87 12/15 p. 22-23)
Nke 2: Abụ nke Abụ 5:1-16
Nke 3: Otú Ndụ Ga-adị n’Ime Paradaịs (kl p. 9-10 para. 11-16)
Nke 4: #Ị̀ Dị Njikere Maka Alụmdi na Nwunye? ( fy p. 13-15 para. 1-6)
Jan. 28 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 1-6
Abụ nke 204
Nke 1: Nṅụrị Ọṅụ Nye Ndị Na-aga Ije n’Ìhè (w01 3/1 p. 12-17)
Nke 2: Aịsaịa 2:1-17
Nke 3: Ihe Mere Ihe Ọmụma Chineke Ji Dị Oké Mkpa (kl p. 10-11 para. 17-19)
Nke 4: Ihe Mere Ị Ga-eji Mara Onwe Gị ma Nwee Ezi Uche ( fy p. 16-18 para. 7-10)
Feb. 4 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 7-11
Abụ nke 89
Nke 1: Nzukọ Jehova Dị Anyị Mkpa (w00 1/1 p. 30-31)
Nke 2: Aịsaịa 8:1-22
Nke 3: Akwụkwọ nke Na-ekpughe Ihe Ọmụma Chineke (kl p. 12-13 para. 1-6)
Nke 4: #Ihe Ị Ga-ele Anya Ya n’Onye Ị Ga-alụ ( fy p. 18-22 para. 11-15)
Feb. 11 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 12-19
Abụ nke 177
Nke 1: Olee Otú I Si Ele Onwe Gị Anya? (w00 1/15 p. 20-22)
Nke 2: Aịsaịa 17:1-14
Nke 3: Ihe Bible Na-ekpughe Banyere Chineke (kl p. 14-15 para. 7-9)
Nke 4: Ihe Ndị Ị Ga-atụle Tupu I Mee Nkwekọrịta Na-adịgide Adịgide ( fy p. 22-23 para. 16-19)
Feb. 18 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 20-26
Abụ nke 225
Nke 1: Soro Jehova Na-akpachi Anya (w00 1/15 p. 23-26)
Nke 2: Aịsaịa 22:1-19
Nke 3: Ihe Mere Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Bible Obi (kl p. 15-16 para. 10-13)
Nke 4: #Mee Ka Mbedo Unu Dị Nsọpụrụ, Leekwa Anya Gabiga Ụbọchị Agbamakwụkwọ Ahụ ( fy p. 24-26 para. 20-23)
Feb. 25 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 27-31
Abụ nke 192
Nke 1: Onye Mkpagbu ahụ Ahụ Oké Ìhè (w00 1/15 p. 27-29)
Nke 2: Aịsaịa 29:1-14
Nke 3: Bible Ziri Ezi, Kwesịkwa Ndabere (kl p. 17 para. 14, 15)
Nke 4: Ụkpụrụ Bible Ndị Pụrụ Inyere Gị Aka Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Ga-aga nke Ọma ( fy p. 26 igbe ntụleghachi)
Mar. 4 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 32-37
Abụ nke 98
Nke 1: Ihe Ịga nke Ọma Site n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe (w00 2/1 p. 4-6)
Nke 2: Aịsaịa 33:1-16
Nke 3: Bible Bụ Akwụkwọ Amụma (kl p. 17-18 para. 16-18)
Nke 4: #Mkpịsị Ugodi nke Mbụ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide ( fy p. 27-29 para. 1-6)
Mar. 11 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 38-42
Abụ nke 132
Nke 1: Ndụmọdụ Amamihe nke Otu Nne (w00 2/1 p. 30-31)
Nke 2: Aịsaịa 42:1-16
Nke 3: Amụma Bible Banyere Jisọs (kl p. 19-21 para. 19, 20)
Nke 4: Mkpịsị Ugodị nke Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide ( fy p. 30-31 para. 7-10)
Mar. 18 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 43-47
Abụ nke 160
Nke 1: Si n’Ógbè ahụ Dị Ize Ndụ Pụọ (w00 2/15 p. 4-7)
Nke 2: Aịsaịa 44:6-20
Nke 3: Ka Agụụ Na-agụ Gị Maka Ihe Ọmụma Chineke (kl p. 21-22 para. 21-23)
Nke 4: #Ịbụisi Nwoke Kwesịrị Iyi nke Kraịst ( fy p. 31-33 para. 11-15)
Mar. 25 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 48-52
Abụ nke 161
Nke 1: Ike nke Ekpere (w00 3/1 p. 3-4)
Nke 2: Aịsaịa 49:1-13
Nke 3: Ezi Chineke ahụ na Aha Ya (kl p. 23-24 para. 1-5)
Nke 4: Otú Nwunye Ga-esi Bụrụ Onye Kwesịrị Di Ya ( fy p. 34-35 para. 16-19)
Apr. 1 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 53-59
Abụ nke 210
Nke 1: Iji Obi E Doziri Edozi Achọ Jehova (w00 3/1 p. 29-31)
Nke 2: Aịsaịa 54:1-17
Nke 3: Ihe Mere I Kwesịrị Iji Jiri Aha Chineke Na-eme Ihe (kl p. 24-25 para. 6-8)
Nke 4: #Ihe Nkwurịta Okwu Dị Mma Pụtara n’Ezie ( fy p. 35-38 para. 20-26)
Apr. 8 Ọgụgụ Bible: Aịsaịa 60-66
Abụ nke 111
Nke 1: Nzọpụta Nye Ndị Na-ahọrọ Ìhè Ahụ (w01 3/1 p. 17-22)
Nke 2: Aịsaịa 61:1-11
Nke 3: Otú Jehova Si Mee Ka Aha Ya Dị Ukwuu (kl p. 25-27 para. 9-13)
Nke 4: Ụkpụrụ Bible Ndị Pụrụ Inyere Gị Aka Ịnụ Ụtọ Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide, nke Obi Ụtọ ( fy p. 38 igbe ntụleghachi)
Apr. 15 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 1-4
Abụ nke 70
Nke 1: Jeremaịa—Onye Amụma Na-adịghị Ọha Mma nke Ihe Chineke Kpere n’Ikpe (w88 4/1 p. 10-15)
Nke 2: Jeremaịa 2:4-19
Nke 3: Àgwà Dị Iche Iche nke Ezi Chineke Ahụ (kl p. 27-28 para. 14-16)
Nke 4: #Konye Akpa Gị Ebe Aka Gị Ga-eru ( fy p. 39-41 para. 1-6)
Apr. 22 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 5-8
Abụ nke 205
Nke 1: Ihe Mere Onye Inyeaka Ji Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa (w00-IB 3/15 p. 3-4)
Nke 2: Jeremaịa 7:1-20
Nke 3: Jehova Chineke Nwere Obi Ebere ma Na-eme Amara (kl p. 28-29 para. 17-19)
Nke 4: Ilekọta Ebe Obibi Bụ Ọrụ nke Ezinụlọ ( fy p. 42-44 para. 7-11)
Apr. 29 Ntụleghachi Odide. Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 9-13
Abụ nke 46
May 6 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 14-18
Abụ nke 224
Nke 1: Otú Jisọs Kraịst Pụrụ Isi Nyere Anyị Aka (w00 3/15 p. 5-9)
Nke 2: Jeremaịa 17:1-18
Nke 3: Jehova Adịghị Ewe Iwe Ọsọ Ọsọ, Ọ Dịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu, Ọ Bụ Onye Ezi Omume (kl p. 30 para. 20, 21)
Nke 4: #Ihe Mere Jehova Ji Chọọ Ka Anyị Na-adị Ọcha ( fy p. 45-49 para. 12-20)
May 13 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 19-23
Abụ nke 73
Nke 1: Obi Umeala—Àgwà Na-akwalite Udo (w00 3/15 p. 21-24)
Nke 2: Jeremaịa 19:1-15
Nke 3: Jehova Chineke Bụ Otu (kl p. 30-31 para. 22, 23)
Nke 4: Ihe Ezi Ịja Mma na Inwe Ekele Pụrụ Imere Ezinụlọ ( fy p. 49-50 para. 21-22)
May 20 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 24-28
Abụ nke 140
Nke 1: Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi (w00 3/15 p. 25-28)
Nke 2: Jeremaịa 25:1-14
Nke 3: Jisọs Kraịst Bụ Mkpịsị Ugodị nke Ihe Ọmụma Chineke (kl p. 32 para. 1-3)
Nke 4: #Echiche Bible Banyere Ụmụaka na Ibu Ọrụ Ezinụlọ ( fy p. 51-52 para. 1-5)
May 27 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 29-31
Abụ nke 42
Nke 1: Olee Otú Mmụọ Chineke Si Arụ Ọrụ Taa? (w00 4/1 p. 8-11)
Nke 2: Jeremaịa 30:1-16
Nke 3: Mesaịa ahụ E Kwere ná Nkwa (kl p. 33 para. 4, 5)
Nke 4: Ihe Imezu Mkpa Nwatakịrị Pụtara ( fy p. 53-55 para. 6-9)
June 3 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 32-35
Abụ nke 85
Nke 1: Nweta Nkasi Obi n’Ike Jehova (w00 4/15 p. 4-7)
Nke 2: Jeremaịa 34:1-16
Nke 3: Osuso Ọmụmụ Jisọs Na-eme Ka A Mata Ya Dị Ka Mesaịa Ahụ (kl p. 34 para. 6)
Nke 4: #Kụnye Eziokwu ahụ n’Ime Nwa Gị ( fy p. 55-57 para. 10-15)
June 10 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 36-40
Abụ nke 159
Nke 1: Ị̀ Na-ele Ndị Na-eme Ihe Ike Anya Dị Ka Chineke Si Ele Ha? (w00 4/15 p. 26-29)
Nke 2: Jeremaịa 37:1-17
Nke 3: Amụma E Mezuru Emezu Na-eme Ka A Mata Jisọs Dị Ka Mesaịa Ahụ (kl p. 34-36 para. 7, 8)
Nke 4: Kụziere Nwa Gị Ụzọ Jehova ( fy p. 58-59 para. 16-19)
June 17 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 41-45
Abụ nke 26
Nke 1: “Chebe Obi Gị” (w00 5/15 p. 20-24)
Nke 2: Jeremaịa 41:1-15
Nke 3: Ihe Àmà Ọzọ Na-egosi na Jisọs Bụ Mesaịa Ahụ (kl p. 36 para. 9)
Nke 4: #Mkpa Gbara Ọkpụrụkpụ nke Ịdọ Aka ná Ntị n’Ụdị Ya Dị Iche Iche ( fy p. 59-61 para. 20-23)
June 24 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 46-49
Abụ nke 15
Nke 1: Ndụ Zuru Okè Abụghị Nrọ Nkịtị! (w00 6/15 p. 5-7)
Nke 2: Jeremaịa 49:1-13
Nke 3: Jehova Agbaara Ọkpara Ya Àmà (kl p. 38 para. 10, 11)
Nke 4: Chebe Nwa Gị Pụọ ná Mmerụ Ahụ ( fy p. 61-63 para. 24-28)
July 1 Ọgụgụ Bible: Jeremaịa 50-52
Abụ nke 100
Nke 1: A Ghaghị Ịkpọsa Ihe Chineke Kpere n’Ikpe (w88 4/1 p. 21-26)
Nke 2: Jeremaịa 50:1-16
Nke 3: Ịdị Adị Jisọs Tupu Ọ Ghọọ Mmadụ (kl p. 39 para. 12-14)
Nke 4: Ndị Mụrụ Ụmụ—Meenụ Ka Ụzọ Nkwụrịta Okwu Ghere Oghe ( fy p. 64-66 para. 1-7)
July 8 Ọgụgụ Bible: Abụ Ákwá 1-2
Abụ nke 8
Nke 1: Jehova Na-enye Olileanya n’Oge Iru Újú (w88 9/1 p. 26 para. 1-27 para. 5)
Nke 2: Abụ Ákwá 1:1-14
Nke 3: Oge Ndụ Jisọs n’Elu Ala (kl p. 40 para. 15-17)
Nke 4: Kụziere Ụmụaka Ụkpụrụ Omume Ọma na Iji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe ( fy p. 67-70 para. 8-14)
July 15 Ọgụgụ Bible: Abụ Ákwá 3-5
Abụ nke 145
Nke 1: Ihe Mmụta Ndị Sitere n’Abụ Ákwá (w88 9/1 p. 27 igbe)
Nke 2: Abụ Ákwá 3:1-30
Nke 3: Jisọs Dị Ndụ ma Na-achị Dị Ka Eze (kl p. 41-42 para. 18-20)
Nke 4: Ihe Ịdọ Aka ná Ntị na Nkwanye Ùgwù Ji Dị Oké Mkpa ( fy p. 71-72 para. 15-18)
July 22 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 1-6
Abụ nke 94
Nke 1: Gee Ntị—Onye Nche Jehova Na-ekwu Okwu! (w88 9/15 p. 10-15)
Nke 2: Ezikiel 4:1-17
Nke 3: Ofufe nke Chineke Na-anakwere (kl p. 43-45 para. 1-5)
Nke 4: Kụziere Ụmụaka Ile Ọrụ na Egwuregwu Anya Otú Chineke Si Ele Ha Anya ( fy p. 72-75 para. 19-25)
July 29 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 7-12
Abụ nke 221
Nke 1: Rite Uru Site n’Aka Ndị Nlereanya Ọma (w00 7/1 p. 19-21)
Nke 2: Ezikiel 10:1-19
Nke 3: Ime Ihe Chineke Na-achọ (kl p. 46-47 para. 6-10)
Nke 4: Nnupụisi Ụmụaka na Ihe Ndị Na-akpata Ya ( fy p. 76-79 para. 1-8)
Aug. 5 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 13-16
Abụ nke 106
Nke 1: Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa nke Rụrụ Arụ (w00 7/15 p. 28-31)
Nke 2: Ezikiel 13:1-16
Nke 3: Fee Chineke n’Ụzọ nke Ya (kl p. 48 para. 11-13)
Nke 4: #Anabatabigala Ihe Ókè Ma Ọ Bụ Na-egbochibiga Ókè ( fy p. 80-81 para. 9-13)
Aug. 12 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 17-20
Abụ nke 214
Nke 1: Gịnị Mere A Ga-eji Na-akwanyere Ịbụisi Ùgwù? (w00 8/1 p. 4-7)
Nke 2: Ezikiel 17:1-18
Nke 3: Nọrọ na Nche Megide Imejọ Chineke (kl p. 49-50 para. 14-17)
Nke 4: Igbo Mkpa Ndị Bụ́ Isi nke Nwatakịrị Pụrụ Igbochi Nnupụisi ( fy p. 82-84 para. 14-18)
Aug. 19 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 21-23
Abụ nke 86
Nke 1: Olee Otú I Si Edozi Esemokwu? (w00 8/15 p. 23-25)
Nke 2: Ezikiel 22:1-16
Nke 3: Debe Ụkpụrụ Ndị Dị Elu nke Chineke (kl p. 50-51 para. 18, 19)
Nke 4: #Ụzọ Dị Iche Iche Isi Nyere Nwatakịrị Mehierenụ Aka ( fy p. 85-87 para. 19-23)
Aug. 26 Ntụleghachi Odide. Ọgụgụ Bible: Ezikiel 24-28
Abụ nke 18
Sept. 2 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 29-32
Abụ nke 40
Nke 1: N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-achụ Onwe Onye n’Àjà? (w00 9/15 p. 21-24)
Nke 2: Ezikiel 30:1-19
Nke 3: Fee Jehova Ofufe Si n’Obi Dum (kl p. 51-52 para. 20-22)
Nke 4: #Ịhụ Maka Onye Nnupụisi Kpọrọ Ekwo Nkụ ( fy p. 87-89 para. 24-27)
Sept. 9 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 33-36
Abụ nke 49
Nke 1: Ụzọ Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso (w00 10/15 p. 4-7)
Nke 2: Ezikiel 33:1-16
Nke 3: E Keghị Mmadụ Ịnwụ Anwụ (kl p. 53-55 para. 1-3)
Nke 4: Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi ( fy p. 90-92 para. 1-7)
Sept. 16 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 37-40
Abụ nke 34
Nke 1: Gịnị Ka Ị Na-ewere Dị Ka Inwe Ihe Ịga nke Ọ̇ma? (w00 11/1 p. 18-21)
Nke 2: Ezikiel 39:1-16
Nke 3: Nkata Arụrụala (kl p. 55-56 para. 4-7)
Nke 4: #Echiche Chineke Banyere Mmekọahụ ( fy p. 92-95 para. 8-13)
Sept. 23 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 41-45
Abụ nke 50
Nke 1: Were Ọchịchọ Obi Na-ejere Chineke Ozi (w00 11/15 p. 21-23)
Nke 2: Ezikiel 42:1-20
Nke 3: Ụzọ Setan Si Gaa n’Ihu na Nkata Ya (kl p. 56-58 para. 8-12)
Nke 4: Nyere Ụmụ Gị Aka Ịhọrọ Ezi Ndị Enyi ( fy p. 95-97 para. 14-18)
Sept. 30 Ọgụgụ Bible: Ezikiel 46-48
Abụ nke 112
Nke 1: ‘Ha Ga-amarakwa na Mụ Onwe M Bụ Jehova’ (w88 9/15 p. 22-27)
Nke 2: Ezikiel 46:1-15
Nke 3: Ụzọ Mmehie na Ọnwụ Si Gbasaa (kl p. 58-59 para. 13-15)
Nke 4: #Ịhọrọ Ntụrụndụ Dị Mma Maka Ezinụlọ ( fy p. 97-102 para. 19-27)
Oct. 7 Ọgụgụ Bible: Daniel 1-4
Abụ nke 10
Nke 1: Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke Maka Oge Anyị (w00 5/15 p. 10-14)
Nke 2: Daniel 1:1-17
Nke 3: Lezie Anya Maka Ụzọ Aghụghọ Setan (kl p. 59-60 para. 16-18)
Nke 4: Nghọta Sitere n’Akwụkwọ Nsọ Maka Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna ( fy p. 103-105 para. 1-8)
Oct. 14 Ọgụgụ Bible: Daniel 5-8
Abụ nke 191
Nke 1: Ị̀ Ga-ekwenyerịrị Mgbe Nile n’Ihe Ndị “Maara Ihe” Kwuru? (w00 12/1 p. 29-31)
Nke 2: Daniel 5:1-16
Nke 3: Nwee Okwukwe ma Jikere Maka Mmegide (kl p. 60-61 para. 19-21)
Nke 4: Ihe Ịma Aka nke Ịkpata Ihe E Ji Ebi Obi Dị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ ( fy p. 105-107 para. 9-12)
Oct. 21 Ọgụgụ Bible: Daniel 9-12
Abụ nke 108
Nke 1: Nwee Okwukwe n’Okwu Amụma Chineke! (w00 5/15 p. 15-19)
Nke 2: Daniel 10:1-21
Nke 3: Ụzọ Chineke nke Isi Zọpụta Ihe A Kpọrọ Mmadụ (kl p. 62-63 para. 1-5)
Nke 4: Ịnọgide Na-enye Ịdọ Aka ná Ntị n’Ezinụlọ E Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna ( fy p. 107-110 para. 13-17)
Oct. 28 Ọgụgụ Bible: Hosea 1-14
Abụ nke 23
Nke 1: Jehova Chineke Anyị Bụ Onye Ebere (w89 3/1 p. 14-15)
Nke 2: Hosea 4:1-19
Nke 3: Ihe Mere Mesaịa ahụ Ga-eji Nwụọ (kl p. 63-65 para. 6-11)
Nke 4: Imeri n’Ọgụ Megide Owu Ọmụma ( fy p. 110-113 para. 18-22)
Nov. 4 Ọgụgụ Bible: Joel 1-3
Abụ nke 166
Nke 1: Kpọkuo Aha Jehova ma Nwee Nzọpụta! (w89 3/15 p. 30-31)
Nke 2: Joel 1:1-20
Nke 3: Ụzọ E Si Kwụọ Ihe Mgbapụta Ahụ (kl p. 65-68 para. 12-16)
Nke 4: #Ụzọ Isi Kwadoo Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna ( fy p. 113-115 para. 23-27)
Nov. 11 Ọgụgụ Bible: Emọs 1-9
Abụ nke 80
Nke 1: Ọdịda nke Otu Mba (w89 4/1 p. 22-23)
Nke 2: Emọs 1:1-15
Nke 3: Ihe Mgbapụta Kraịst na Gị (kl p. 68-69 para. 17-20)
Nke 4: #Uru Ndị Dị n’Iji Àgwà Nsọpụrụ Chineke Eche Ọrịa Ihu ( fy p. 116-119 para. 1-9)
Nov. 18 Ọgụgụ Bible: Obadaịa 1–Jona 4
Abụ nke 96
Nke 1: Ịdọ Aka ná Ntị Chineke Ndị Metụtara Gị (w89 4/15 p. 30-31)
Nke 2: Obadaịa 1:1-16
Nke 3: Ọ̀ Bụ Chineke Kpatara Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ? (kl p. 70-72 para. 1-5)
Nke 4: Uru Mmụọ nke Ọgwụgwọ Bara ( fy p. 120-121 para. 10-13)
Nov. 25 Ọgụgụ Bible: Maịka 1-7
Abụ nke 138
Nke 1: E Buliri Ikpe Ziri Ezi na Aha Jehova Elu (w89 5/1 p. 14-15)
Nke 2: Maịka 1:1-16
Nke 3: Mmalite Zuru Okè na Ịma Aka Obi Ọjọọ (kl p. 72-73 para. 6-10)
Nke 4: Hazie Ihe n’Usoro Ịdị Mkpa Ha ma Nyere Ụmụaka Aka Ịnagide Ọrịa n’Ezinụlọ ( fy p. 122-123 para. 14-18)
Dec. 2 Ọgụgụ Bible: Nehum 1–Habakuk 3
Abụ nke 137
Nke 1: A Pụrụ Inwe Nzọpụta Mgbe Chineke Bọrọ Ọ́bọ̀ (w89 5/15 p. 24-25)
Nke 2: Nehum 3:1-19
Nke 3: Ihe Ndị Na-ese Okwu n’Ezie na Ụzọ Jehova Ga-esi Dozie Ha (kl p. 74-76 para. 11-15)
Nke 4: #Ụzọ Isi Lee Iji Ọgwụ Agwọ Ọrịa Anya ( fy-IB p. 124-127 para. 19-23)
Dec. 9 Ọgụgụ Bible: Zefanaịa 1–Hagaị 2
Abụ nke 146
Nke 1: Chọọ Jehova ma Jiri Obi Gị Nile Fee Ya (w89 6/1 p. 30-31)
Nke 2: Zefanaịa 2:1-15
Nke 3: Ihe Nkwere Chineke Kwere Ka Ajọ Omume Dịrị Nwapụtaworo (kl p. 76-77 para. 16-19)
Nke 4: Olee Otú Nwunye Kwere Ekwe Pụrụ Isi Mee Ka A Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Kewara Ekewa? ( fy p. 128-132 para. 1-9)
Dec. 16 Ọgụgụ Bible: Zekaraịa 1-8
Abụ nke 1
Nke 1: Jehova Akpalie Mmụọ nke Ndị Ya (w89 6/15 p. 30-31)
Nke 2: Zekaraịa 6:1-15
Nke 3: N’akụkụ Ònye Ka Ị Na-eguzo? (kl p. 78-79 para. 20-23)
Nke 4: #Olee Otú Di Kwere Ekwe Pụrụ Isi Mee Ka A Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Kewara Ekewa? ( fy p. 132-133 para. 10-11)
Dec. 23 Ọgụgụ Bible: Zekaraịa 9-14
Abụ nke 176
Nke 1: Ihe Mmụta Ndị Sitere na Zekaraịa (w89 6/15 p. 31 igbe)
Nke 2: Zekaraịa 9:1-17
Nke 3: Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ? (kl p. 80-82 para. 1-6)
Nke 4: Inye Ụmụaka Ọzụzụ Akwụkwọ Nsọ n’Ezinụlọ Kewara Ekewa ( fy p. 133-134 para. 12-15)
Dec. 30 Ntụleghachi Odide. Ọgụgụ Bible: Malakaị 1-4
Abụ nke 118