Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/01 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite November 12
  • Izu Na-amalite November 19
  • Izu Na-amalite November 26
  • Izu Na-amalite December 3
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 11/01 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite November 12

Abụ nke 43

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Dabere na Jehova Maka Ume.”a Gbakwụnye okwu dị nkenke sitere n’Ụlọ Nche nke October 1, 1999, peeji nke 18-19, paragraf nke 6-8.

22 min: “Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ n’Ozi Gị.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee nke onye okenye ga-eme. Gbakwụnye ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke onye ka malitere nnọọ nkwusa ọhụrụ kwadebere nke ọma, na-enyefe Ụlọ Nche nke November 15, n’iji aro dị n’igbe bụ́ “Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ” eme ihe.

Abụ nke 191 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 19

Abụ nke 172

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

22 min: Guzogide Ọdịnala Ndị Na-adịghị Asọpụrụ Chineke! Okwu onye okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke August 15, 1995, peeji nke 28-30. Mee ka omenala ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ ndị jupụtara n’ógbè unu pụta ìhè. Jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị ekwesị gosi ihe mere ha na-ejighị kwesị ndị Kraịst.

Abụ nke 195 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 26

Abụ nke 177

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka November. N’iji aro ndị dị ‘n’Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ’ mee ihe, mee ihe ngosi abụọ a kwadebere nke ọma nke ụzọ iche magazin n’ihu mmadụ—a ga-eji Ụlọ Nche nke December 1 mee otu ma jiri Teta! nke December 8 mee nke ọzọ. E mesịa, kọwaa otú a pụrụ isi chọta ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ nke a pụrụ iji mee ihe mgbe a na-enyefe akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu ma ọ bụ otu n’ime akwụkwọ ndị ọzọ a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ ya na December. Nye otu ihe atụ ma ọ bụ abụọ. (Lee Ozi Alaeze Anyị nke December 1994, peeji nke 4; June 1993, peeji nke 4.)

15 min: “Olee Ebe M Pụrụ Isi Nweta Oge?” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Gbakwụnye isi ihe ndị dị n’Ụlọ Nche nke October 1, 2000, peeji nke 20-21, paragraf nke 9-10, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Otú Ụfọdụ Si Ewepụta Oge Maka Ịmụ Ihe.” Kpọọ ndị na-ege ntị ịkọ ụzọ ndị dị irè ha siworo nweta oge maka ihe ndị ka mkpa site n’iwepụ nchụso ndị na-adịghị mkpa. Mesie ike mkpa ọ dị mmadụ iwepụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ, nzukọ ọgbakọ, ozi ubi, na ọgụgụ Bible kwa ụbọchị.

15 min: Ndị Na-eto Eto Na-enye Jehova Otuto. Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Ọtụtụ ọgbakọ karị nwere ndị na-eto eto bụ́ ndị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. O kwesịrị ekwesị ka ha na-eme otú ahụ, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ pụtara ịgbara ndị toworo eto àmà karịsịa. (Ọma 148:12, 13; Mat. 21:15, 16) Mgbe ndị nne na nna na ndị nkwusa ndị ọzọ gosiri mmasị, na-enye ọzụzụ na agbamume, ndị na-eto eto na-enweta ọṅụ dị ukwuu n’ozi ubi. Kpọọ ndị na-ege ntị ịtụ aro ụzọ dị iche iche a pụrụ isi mee ka ndị na-eto eto na-ekere òkè n’ọrụ site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ nakwa ná nletaghachi. Gwa ndị nne na nna ka ha kọọ ihe ha meworo iji nyere ụmụ ha aka ịmụta ụzọ isi nyefee magazin, iji Bible mee ihe mgbe ha na-eche ihe n’ihu mmadụ, na iji obi ike kwuo okwu n’ọnụ ụzọ. Mesie ike abamuru nke ịja ụmụaka mma. Gbaa otu ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ na-eto eto ajụjụ ọnụ, meekwa ka ha kwuo ihe na-amasị ha banyere ọrụ nkwusa ahụ na ihe mere o ji amasị ha.

Abụ nke 198 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 3

Abụ nke 179

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

17 min: Akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible. Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Tụlee otú a pụrụ isi jiri akụkụ dị iche iche sitere n’akwụkwọ nta ahụ mee ihe n’ịmalite nkwurịta okwu nakwa n’ịzaghachi okwu mgbochi. Dị ka ihe atụ, “Alaeze” (peeji nke 2); “Bible/Chineke” (peeji nke 3); “Ọmụmụ Bible Ebe Obibi” (peeji nke 6). Jiri ihe atụ atọ ma ọ bụ anọ gosi otú a pụrụ isi jiri peeji nke 7 ruo 16 mee ihe n’ịzaghachi okwu mgbochi ndị a na-enwetakarị n’ókèala ebe unu na-eje ozi ubi. Gbaa ndị nkwusa ume iji ihe enyemaka a dị mma maka izi ihe na-eme ihe mgbe ọ bụla ohere dapụtara maka ya n’ozi ubi.

20 min: “Ngọzi Ndị Na-esite n’Igosi Ekele Maka Ịhụnanya Jehova—Akụkụ nke 1.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 3-6, kpọọ ọgbakọ ịkọ ahụmahụ ndị na-agba ume ha nweworo n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, ịgba àmà okporo ámá, ná nletaghachi nakwa ọmụmụ Bible.

Abụ nke 200 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya