Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite March 11
Abụ nke 2
13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi abụọ dị iche iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke March 15 na Teta! nke April 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke April 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. Na nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi merie ihe na-egbochi nkwurịta okwu, “Enweghị m mmasị.”—Lee Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible peeji nke 8.
12 min: Ijigide Nnọpụiche Ndị Kraịst Anyị. Okwu okenye ruru eru ga-ekwu. Site n’oge ruo n’oge ngosipụta nke ịhụ mba n’anya na-ebilite n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, nakwa na gburugburu ógbè. N’ala ụfọdụ, ndị na-akwado ya na-eme otú ahụ dị ka ụzọ isi nagide nchegbu na mwute ha nwere n’ihi ọdachi ndị dakwasịrị mba ha. Ọ bụ ezie na ihe anyị na-ahụ n’ụwa na-ewute anyị, anyị ghọtara ihe iseokwu ka ukwuu nke ọbụbụeze eluigwe na ala ma bụrụ ndị ozi banyere Alaeze ahụ na-akasi obi. Mgbe anyị ji akọ na-akọwara ndị ọzọ ihe mere anyị na-ejighị esonye n’ihe omume ịhụ mba n’anya, anyị kwesịkwara isoro ha kerịta nkasi obi na olileanya anyị nwetaworo n’Okwu Chineke. Broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ, peeji nke 20-24, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Igbuchapụrụ Ọkọlọtọ,” na-akọwa ihe mere anyị na-ejighị ekere òkè n’ememe ndị na-egosi ịhụ mba n’anya. Tụlee isi ihe ndị dị na ya, gbaakwa ndị mụrụ ụmụ ume isoro ụmụ ha tụleghachi ihe ọmụma a nke ọma. Kọọ ahụmahụ ndị dị na peeji nke 20 nke broshuọ ahụ na nke dị na peeji nke 31 nke Teta! (Bekee) nke January 8, 1996. Mesie ike mkpa ọ dị inye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa, ma na-akwanyere ọchịchị ùgwù.
20 min: “Baa Ọgaranya n’Ezi Ọrụ.”a Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-ekwu ya. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu n’ozi iji kwadebe maka Ememe Ncheta na March 28. Tụlee otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù e biri ebi mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. Kpọọ ndị nkwusa ka ha kwuo otú ha si nwee ike mee ka ndị ikwu ha, ndị agbata obi ha, ndị ha na-eduziri ọmụmụ Bible, na ndị ọzọ nwere mmasị bịa Ememe Ncheta n’afọ gara aga na ọṅụ o wetaara ha. Gbaa ndị ọ pụrụ ikwe mee ịsụ ụzọ inyeaka n’April ume, gwakwa ha ka ha nweta akwụkwọ ndejupụta mgbe a gbasara nzukọ.
Abụ nke 82 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 18
Abụ nke 7
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụlee “Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta.” Gbaa mmadụ nile ume ịgbaso usoro ọgụgụ Bible Ememe Ncheta maka March 23-28, dị ka e depụtara ya n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2002.
15 min: “Iji Ọṅụ Soro Jehova na Ọkpara Ya Dị n’Otu.” Okwu na-akpali akpali dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke okenye ga-ekwu. Gbaa mmadụ nile ume itinyekwu mgbalị malite ugbu a ruo March 28 iji kpọọ ọtụtụ ndị òkù ruo ókè o kwere mee isoro anyị bịa Ememe Ncheta.
20 min: “Nọgidesie Ike n’Ozi Ọsụ Ụzọ.”b Ọ bụ okenye ga-ekwu ya, ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ ọsụ ụzọ. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3-5, gbaa ọsụ ụzọ bụ́ onye tachiworo nnọọ obi iji nọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ ajụjụ ọnụ, na-eme ka ụzọ ịnọgidesi ike si baara ya uru pụta ìhè.
Abụ nke 45 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 25
Abụ nke 12
14 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwaa na oge agafebeghị maka itinye akwụkwọ maka ịsụ ụzọ inyeaka n’April. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ka otu okenye mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 1, meekwa ka otu onye ntorobịa gosi ụzọ isi nyefee Teta! nke April 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke April 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, mee ka akụkụ ụfọdụ dị mma n’ihe ngosi ahụ pụta ìhè.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
16 min: Jirinụ Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche Na-eme Ihe Mgbe Unu Na-enye Agbamume. Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Agbamume na-adị onye ọ bụla mkpa site n’oge ruo n’oge. N’ihi ya, anyị nile kwesịrị ịhụ mkpa ọ dị ‘ịgụgụ’ ndị ọzọ, gụnyere ndị dara mbà n’obi bụ́ ndị anyị na-ezute n’ozi. (1 Tesa. 5:14) Site n’iji isiokwu ndị kwesịrị ekwesị sitere n’Ụlọ Nche ndị na-adịbeghị anya mee ihe [ndị dị ka, w01-IB 2/1 p. 22; w01-IB 5/1 p. 8-13; w00-IB 1/1 p. 30-31; w00-IB 3/1 p. 5-7], kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo agbamume dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke ha pụrụ inye onye na-enwe otu n’ime ọnwụnwa ndị e depụtara n’ebe ndị ahụ. Tụọ aro ka onye nke ọ bụla gbalịa ịgba mmadụ ume mgbe ọ bụla ime otú ahụ dị mkpa.—Gal. 6:10.
Abụ nke 131 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 1
Abụ nke 27
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka March.
18 min: “‘Onyinye n’Ụdị Mmadụ’ Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke.” Okwu okenye ga-ekwu. Kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Gosi otú a pụrụ isi rụpụta ihe ọma site n’ileta ndị na-adịghị ejekwa ozi na inyere ndị na-adịkwaghị ike aka ime ihe ha nwere ike ime. Ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya na-egosi ekele maka mgbalị nile sitere n’obi a na-eme iji nọgide n’ozi Jehova.
20 min: “Mụbaa Ọṅụ Gị n’Ime Nkwusa.”c Mgbe ị na-atụle paragraf nke 5, kwuo ka a tụọ aro ndị dị irè banyere ụzọ isi rụzuo ihe kasị mma n’ókèala unu. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ụzọ anyị pụrụ isi bute ụzọ n’ịgakwuru mmadụ iji gbaara ya àmà dị mkpirikpi. Gbaa mmadụ nile ume iwepụta ohere iji gbaa àmà n’izu a.
Abụ nke 15 na ekpere mmechi.
[Footote]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.