Iji Ọṅụ Soro Jehova na Ọkpara Ya Dị n’Otu
A Ga-eme Ihe Omume Kasị Mkpa n’Afọ A na March 28
1 Site n’ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị mgbe anyanwụ dasịrị na March 28, 2002, anyị ga-egosi na anyị ji ọṅụ soro Jehova Chineke na Jizọs Kraịst na-adị n’otu. N’ememe ahụ pụrụ nnọọ iche, ihe ahụ fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-anụ ụtọ ‘nkerịta òkè’ pụrụ iche nke ha na ndị ọzọ bụ́ ndị so ná ndị nketa Alaeze ahụ, Nna ahụ, na Ọkpara ya nwere. (1 Jọn 1:3; Efe. 1:11, 12) Ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” ga-atụgharị uche n’ohere pụrụ iche ha nwere isoro Jehova na Ọkpara ya na-adị n’otu, soro ha nwee otu obi na uche n’ịrụzu ọrụ Chineke!—Jọn 10:16.
2 Ịrụkọ Ọrụ ná Mmekọrịta Chiri Anya: Jehova na Jizọs ejiwo ọṅụ na-adị n’otu mgbe nile. Ha nwere mmekọrịta chiri anya ruo afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ tupu e kee mmadụ. (Maị. 5:2) N’ihi ya, ha abụọ nwere nkekọ siri ike nke mmekọrịta ịhụnanya. Dị ka amamihe a kọwara dị ka mmadụ, Ọkpara a e bu ụzọ mụọ kwuru n’oge ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, sị: “M wee bụrụ ihe na-atọ [Jehova] ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile.” (Ilu 8:30) Isoro Isi Iyi nke ịhụnanya na-akpachi anya ruo afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe Ọkpara Chineke nọ!—1 Jọn 4:8.
3 N’iburu mgbapụta dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa n’uche, Jehova họọrọ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ onye ihe na-amasị ya karịsịa bụ ụmụ mmadụ, ịchụ àjà mgbapụta ahụ, bụ́ nke na-enye anyị nanị otu olileanya anyị nwere. (Ilu 8:31) Dị nnọọ ka Jehova na Ọkpara ya dị n’otu n’imezu otu nzube, anyị na-anọgide na-eso ha nakwa ibe anyị na-adị n’otu ná nkekọ nke ịhụnanya siri ike, na-eji ọṅụ eme uche Chineke.
4 Igosi Ekele Anyị Sitere n’Obi: Site n’ịnọ n’Ememe Ncheta ahụ na iji nkwanye ùgwù gee ntị nke ọma, anyị pụrụ igosi ezi ekele anyị nwere maka ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ nakwa maka àjà Ọkpara ya chụrụ n’ihi anyị. Ihe ndị a ga-eme ka ha pụta ìhè bụ́ ihe nlereanya ịhụnanya nke Jizọs, ikwesị ntụkwasị obi ya ruo ọnwụ n’inye ihe mgbapụta ahụ, na ịchịisi ya dị ka Eze nke Alaeze Chineke guzobere, nakwa ngọzi ndị Alaeze ahụ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ. A ga-echetakwara anyị mkpa ọ dị ịnọgide na-egosipụta okwukwe anyị, na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Jehova dị ka ‘ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ n’eziokwu.’—3 Jọn 8; Jems 2:17.
5 Inyere Ndị Ọzọ Aka Isoro Anyị Kere Òkè: Òtù ndị okenye kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji gbaa Ndịàmà nile na-adịghị ejekwa ozi bụ́ ndị nọ n’ókèala ha ume ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. (Mat. 18:12, 13) Depụtanụ aha ndị a ga-akpọtụrụ ka a ghara ileghara onye ọ bụla anya, ka unu wee kpọọkwa ha nile òkù kpọmkwem.
6 Ị̀ maara ndị ọzọ pụrụ ịbịa Ememe Ncheta ahụ? Bute ụzọ n’ime ka ha nwee ekele maka ememe a. Kpọọ ha òkù n’ụzọ na-ekpo ọkụ, meekwa ka ha nwee mmetụta nke ịbụ ndị a nabatara. Ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji kpọọ ndị nile anyị na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị, nakwa ndị òtù ezinụlọ anyị na ndị anyị maara òkù ka ha bịa ihe omume a kasị mkpa n’afọ a. Ndị nile na-amụta banyere “abamuru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs” ka pụrụ inweta uru nke ihe mgbapụta ahụ. (Fil. 3:8) Ndị na-egosipụta okwukwe n’àjà Kraịst pụrụ inwe olileanya siri ike nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.
7 Elelịla ma ọlị mmetụta nke Ememe Ncheta ahụ pụrụ inwe n’ebe ndị nwere obi eziokwu nọ. Afọ abụọ gara aga ná mba àgwàetiti bụ́ Papua New Guinea, mmadụ 11 nwere mmasị ji obere ụgbọ mmiri mee njem awa 17 gabiga oké osimiri na-ebigbọ ebigbọ iji nọrọ n’ememe ahụ. N’ihi gịnị? Ha kwuru, sị: “Anyị chọrọ isoro ndị anyị na ha na-efekọ Jehova mee Ememe Ncheta Kraịst; n’ihi ya njem ahụ kwesịri mgbalị anyị tinyere.” Cheedị banyere ịnụ ọkụ n’obi nke ndị ahụ nwere mmasị gosiri na ekele ha nwere maka ịbụ ndị ji ọṅụ soro Jehova, Ọkpara ya, na òtù ụmụnna Ndị Kraịst na-adị n’otu!
8 Tụọrọ ndị nile nwere mmasị aro ka e duziere ha ọmụmụ Bible. Gbaa ha ume ịgachi nzukọ ọgbakọ anya na ịgwa ndị ọzọ eziokwu ahụ ha na-amụta. Nyere ha aka ‘ije ije n’ìhè ahụ’ na ‘ime eziokwu ahụ eme’ site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha. (1 Jọn 1:6, 7) Nyere ha aka isoro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya nakwa ịnọgide na-eji ihe ùgwù nke ime uche ya n’ịdị n’otu akpọrọ ihe.
9 Lee ihe ùgwù magburu onwe ya ọ bụ ịbụ ndị na-eji ọṅụ na-adị n’otu “n’otu mmụọ, jiri otu mkpụrụ obi na-agbakọ mbọ ọnụ maka okwukwe nke ozi ọma”! (Fil. 1:27, 28) Ka anyị na-atụ anya mkpakọrịta dị mma anyị ga-enwe n’Ememe Ncheta ahụ na March 28, na-enwe ekele mgbe nile n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ!—Luk 22:19.