Ntụleghachi Maka Usoro Ihe Omume Mgbakọ Sekit
A ga-eji ajụjụ ndị dị n’ebe a tụlee ihe ndị a ga-amụ ná mgbakọ sekit maka afọ 2005, jirikwa ha tụleghachi ha mgbe a lọtara. Isiokwu bụ́ “Ndokwa Ọhụrụ Maka Ịtụleghachi Usoro Ihe Omume Mgbakọ,” bụ́ nke pụtara na peeji nke 4 n’ihe ntinye a, na-akọwa otú a ga-esi mee nke a. N’oge a na-eme ntụleghachi a, kegasịa oge otú ị ga-enwe ike ịjụ ajụjụ ahụ nile. Ntụleghachi ahụ kwesịrị ihiwe isi n’ụzọ anyị pụrụ isi tinye ihe ọmụma e nyere n’ọrụ.
NNỌKỌ ỤTỤTỤ [MA Ọ BỤ EHIHIE] NKE ỤBỌCHỊ MBỤ
1. Gịnị ga-enyere anyị aka inweta amamihe n’aka Chineke?
2. Mgbalị dị aṅaa ka ndị nọ na sekit anyị meworo iji kwusaara ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu ozi ọma ahụ?
NNỌKỌ EHIHIE [MA Ọ BỤ UHURUCHI] NKE ỤBỌCHỊ MBỤ
3. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka Ndị Kraịst nọgide na-abụ ndị a na-emerụghị emerụ? Gịnị ka nke a chọrọ anyị n’aka?
4. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị bụ ndị udo n’etiti ụmụnna anyị?
5. Gịnị bụ inwe ezi uche, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosipụta ya n’ụzọ anyị si eji oge anyị eme ihe?
6. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe atụ nke Sọl na Noa? Olee ụzọ ndị anyị pụrụ isi gosi na anyị “dị njikere irube isi”? (Jems 3:17)
7. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi zere ibi ụdị ndụ abụọ?
8. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Pọl n’ikwu banyere amamihe Chineke?
NNỌKỌ ỤTỤTỤ NKE ỤBỌCHỊ NKE ABỤỌ
9. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji nlezianya họrọ ihe omume ndị anyị ga-achụso, gịnị ga-enyekwara anyị aka ime otú ahụ?
10. Mgbalị dị aṅaa ka ndị nọ na sekit anyị na-eme iji na-agachi nzukọ anya, oleekwa otú ha siworo rite uru n’ime otú ahụ?
11. Olee otú ndị isi ezinụlọ pụrụ isi wulite ezinụlọ ha?
12. Mkpa ndị dị aṅaa e nwere na sekit anyị ka e mere ka anyị mara?
NNỌKỌ EHIHIE NKE ỤBỌCHỊ NKE ABỤỌ
13. Dị ka e mere ka ọ pụta ìhè n’okwu ihu ọha, ihe ọma ndị dị aṅaa ka amamihe sitere n’elu rụpụtaworo?
14. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe nzuzu ịtụkwasị onwe anyị ma ọ bụ ndị amamihe Chineke na-adịghị eduzi obi? Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịnọrọ na nche maka ha?
15. Ọnyà ndị dị aṅaa ka amamihe Chineke na-echebe anyị pụọ na ha?
16. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị tinye ndụmọdụ e nyere n’usoro ihe omume mgbakọ sekit ahụ n’ọrụ?