Ndokwa Ọhụrụ Maka Ịtụleghachi Usoro Ihe Omume Mgbakọ
Ka ụwa Setan na-ajọwanye njọ, Jehova na-ewusikwu anyị ike “ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa na ibi ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.” (Taị. 2:12) Mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị a na-enwe kwa afọ so ná ndokwa ndị ọ na-eme site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Mat. 24:45) Lee nnọọ ka mgbakọta ndị a a na-enwe maka ihe ime mmụọ si ewusi okwukwe anyị ike!
Iji nyere anyị aka icheta na itinye ndụmọdụ ndị anyị nwetara n’ọrụ, a ga-agbaso ndokwa ọhụrụ e mere maka ịtụleghachi usoro ihe omume mgbakọ ndị a n’afọ 2005. Peeji nke 5 ruo 6 nke ihe ntinye a bu isiokwu ndị na-atụle ihe ụfọdụ a ga-amụ ná mgbakọ sekit nakwa n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na ajụjụ ndị a ga-eji tụleghachi ha. Ọgbakọ dị iche iche ga-atụle ihe ọmụma a ná Nzukọ Ije Ozi obere oge tupu ha agaa mgbakọ nakwa n’oge na-adịghị anya ha lọtasịrị. Olee otú a ga-esi dokwaa nke a?
Otu izu ma ọ bụ abụọ tupu ọgbakọ unu agaa mgbakọ sekit, a ga-ekwu okwu ga-ewe minit iri ná Nzukọ Ije Ozi, bụ́ nke ga-adabere n’isiokwu bụ́ “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit,” iji kpalie mmasị ndị mmadụ maka usoro ihe omume ahụ. Ọkà okwu ahụ ga-adọrọkwa uche gaa n’ajụjụ maka ntụleghachi ma gbaa mmadụ nile ume idetu ihe ná mgbakọ ahụ iji kwadebe maka ntụleghachi a ga-eme n’izu ole na ole mgbe a lọtasịrị mgbakọ.
N’ime izu ole na ole a lọtasịrị mgbakọ, a ga-agbakwụnye ntụleghachi ga-ewe minit 15 nke ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ ná Nzukọ Ije Ozi. N’izu na-esochi ya, a ga-ewepụta minit 15 iji tụleghachi usoro ihe omume nke ụbọchị nke abụọ. A ga-agbaso ajụjụ ntụleghachi ndị e depụtara n’ihe ntinye a mgbe a na-eme nke ahụ. Ntụleghachi ahụ kwesịrị ihiwe isi n’ụzọ a pụrụ isi tinye ihe ọmụma ndị e nwetara n’ọrụ n’ụzọ bara uru. Ndị okenye pụrụ ime ndokwa igbubilata, iwepụ, ma ọ bụ iyigharị ihe omume ndị ọzọ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi iji wepụta oge maka ntụleghachi ndị a.
A ga-agbasokwa ndokwa ahụ n’ịtụleghachi usoro ihe omume nke ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, nanị na a ga-enwe otu akụkụ ga-ewe minit 15 maka usoro ihe omume ahụ dum. Anyị nile kwesịrị ichekwa ihe ntinye a ma jiri ya mee ihe iji rite uru ná ntụziaka magburu onwe ya Jehova ga-enye.—Aịsa. 48:17, 18.