Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche nke Afọ 2010
1. (a) Olee isiokwu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị anyị gatụrụla? (b) È nwere ihe ndị e kwuru n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị gara aga, bụ́ ndị nyeere gị aka n’ozi gị?
1 “Jide Ihe Ndị Ka Mkpa n’Aka,” “Iguzosi Ike dị ka Otu Ìgwè Atụrụ,” “Nọgide Na-agbara Eziokwu ahụ Àmà,” na “Anyị Bụ Ụrọ—Jehova Na-akpụ Anyị.” (Fil. 1:9, 10, 27; Jọn 18:37; Aịza. 64:8) Ndị a bụ isiokwu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ole na ole ndị anyị garala. Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịga ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2010? Isiokwu ya bụ “Oge Fọdụrụ Dị Ntakịrị.” O sikwa ná 1 Ndị Kọrịnt 7:29.
2. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka ịga mgbakọ a gụwa anyị agụụ?
2 Iji mee ka ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2010 gụwa gị agụụ, gị na ndị ọzọ kparịtawa banyere ya ozugbo a maara unu ọkwa mgbe unu ga-aga ya. Ụfọdụ ndị nne na nna na-akanye ihe n’ụbọchị ha ga-aga mgbakọ ahụ na kalenda dị n’ụlọ ha, ka ụmụ ha nwee ike na-echeta ụbọchị ahụ. Ha na-edetukwa ihe ndị dị mkpa a ga-eji aga mgbakọ ahụ ma dewe ya n’ebe a ga-ahụ ya. Ime ihe ndị a na-eme ka ha na-echeta ụbọchị ole ọ fọrọ. Mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ, unu nwere ike ịtụle ihe ndị unu dere mgbe unu gara ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị gara aga. Unu nwekwara ike ịkwadebe obi unu maka mgbakọ a ma unu tụlee akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 13-16. Unu ga-amụta ihe ga-enyere unu aka ‘ilezi anya n’otú unu si aṅa ntị.’—Luk 8:18.
3. Olee otú anyị nwere ike isi rite ezigbo uru n’ihe ndị a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ?
3 Mee Ihe Ndị Ị Mụtara: Ihe ndị mmadụ na-ekwukarị ma a lọta mgbakọ bụ, “Mgbakọ a tọrọ ezigbo ụtọ!” Nke ahụ bụ eziokwu, n’ihi na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche bụ otu n’ime ngọzi ndị Jehova na-enye anyị. (Ilu 10:22) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe ndị anyị nụrụ mịa mkpụrụ ná ndụ anyị, anyị kwesịrị ịtụgharị uche na ha ma jigide okwu ndị ahụ n’obi anyị. (Luk 8:15) Mgbe unu si mgbakọ ahụ na-ala, gị na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị gị na ha so n’otu ụgbọala kparịta ihe ndị e kwuru. Unu kwurịta ihe ndị unu kpebiri ime na ihe ndị ga-enyere unu aka n’ozi unu. Ọ bụrụ na unu emee ihe ndị a, ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ ga-abara unu uru ruo ogologo oge.—Jems 1:25.
4. Gịnị ga-eme ka mgbakọ a ghọọrọ anyị nke pụrụ iche?
4 Ọ na-atọkarị anyị ụtọ ma mmadụ nye anyị onyinye ga-abara anyị uru, karịchaa ma e nye anyị ya mgbe o ji anyị n’olu. Ọ́ naghị agụsi anyị agụụ ike ịga nụrụ ihe Jehova kwadebeere anyị n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ọzọ anyị ga-enwe? Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-abara anyị ezigbo uru. Anyị kwesịrị ịtụ anya na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, ga-enye anyị ihe ndị dị anyị ezigbo mkpa, ma ịgba anyị ume ma ịkụziri anyị otú anyị ga-esi rụọ ọrụ o nyere anyị.—2 Tim. 4:2; Jems 1:17.