Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
“Bụrụnụ Ndị Tozuru Etozu n’Ikike Ịghọta Ihe” bụ isiokwu nke usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na-amalite na March 2001. (1 Kọr. 14:20, NW) Gịnị mere ọ ga-eji baa uru ka anyị gaa ya? Anyị na-ebi n’ime ụwa nke jupụtara n’ihe ọjọọ. Iji guzogide nke a, anyị aghaghị ịzụlite ikike nghọta ime mmụọ anyị ka anyị wee nwee ike iji ihe ọma merie ihe ọjọọ. Nke ahụ bụ ihe usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ahụ ga-enyere anyị aka ime.
Ná nnọkọ a ga-eji meghee, onye nlekọta sekit ga-atụle “Ihe Ndị Na-enye Aka Eme Ka A Ghọọ Onye Tozuru Etozu ná Nghọta Bible.” Ọ ga-egosi anyị ụzọ isi ghọọ ndị kwụsiri ike n’okwukwe ndị Kraịst. Ọkà okwu si esi bịa ga-eme ka ọ pụta ìhè otú iji ụkpụrụ Bible eme ihe n’ezie, ma ọ bụ itinye ha n’ọrụ, si dị oké mkpa n’ịzụlite ezi nghọta, ka ọ na-ekwu okwu n’isiokwu bụ́ “Chebe Ọnọdụ Ime Mmụọ Site n’Ịzụ Ikike Nghọta Gị.”
Ndị na-eto eto kwa aghaghị ịzụlite ikike nghọta. A ga-atụle nke a n’okwu bụ́ “Ihe Mere A Ga-eji Bụrụ Ụmụ Ọhụrụ n’Ebe Ihe Ọjọọ Dị” nakwa “Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-enweta Nghọta Ugbu A.” Nụrụ ka ndị na-eto eto na-akọ ihe ha na-eme iji wusie onwe ha ike n’ụzọ ime mmụọ ka ha wee nwee ike ịchịkwa ọchịchọ ọ bụla nke ịmata ihe banyere ihe omume ọjọọ dị iche iche nke ụwa ma zere nsogbu.
Olee otú anyị ga-esi nweta obi ụtọ kasị ukwuu ná ndụ? Ọkà okwu ahụ si esi bịa ga-akọwa nke a n’okwu mmechi bụ́ “Rite Uru Site N’iji Nghọta Na-etinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ.” Ọ ga-enye ihe atụ dị iche iche iji gosi na itinye Okwu Chineke n’ọrụ na-enyere anyị aka idozi nsogbu, ime mkpebi, na irite uru n’ezie site n’ihe Jehova na-akụziri anyị.
Ndị chọrọ igosipụta nrara ha raara onwe ha nye Chineke site na baptism ime mmiri ná mgbakọ ahụ kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta ngwa ngwa o kwere omume. Kanye ihe na kalenda gị ozugbo a mara ọkwa oge unu ga-enwe ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ahụ, meekwa atụmatụ ndị doro anya iji rite uru n’usoro ihe omume a mara abụba. Ahapụla akụkụ ọ bụla nke ụbọchị mgbakọ ahụ pụrụ iche! Ọ ga-ewusi gị ike ịtachi obi n’ajọ usoro ihe a ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova.