Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
Ndokwa maka ụbọchị mgbakọ pụrụ iche malitere na 1987. Mgbakọta ndị a na-ewe otu ụbọchị abụrụwo ihe na-ewuli ndị ohu Jehova na ndị nwere mmasị bịaranụ elu. Na-amalite na February 1999, a ga-enwe usoro ihe omume ọhụrụ maka ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. Ị ga-erite uru ime mmụọ site n’okwu itoolu a ga-ekwu na ọtụtụ ajụjụ ọnụ na ahụmahụ.
“Nwee Ekele Maka Tebụl Jehova” bụ isiokwu nke usoro ihe omume ọhụrụ ahụ. (Aịsa. 65:14; 1 Kọr. 10:21) Ọ ga-eme ka mkpebi anyị bụ́ na ofufe anyị na-efe Jehova aghaghị ịbụ ihe mbụ ná ndụ anyị siwanye ike. (Abụ Ọma 27:4) Ihe omume nke onye nlekọta sekit ga-eme ga-ekwu banyere “Inyocha Ọchịchọ Obi Anyị” n’ihe metụtara ịga nzukọ. Onye ọkà okwu si esi bịa ga-egosi anyị ụzọ isi “Nọgide Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe Site n’Ịdị Na-eri Nri na Tebụl Jehova.” A ga-enyekwa ndị na-eto eto nọ ná nzukọ Jehova agbamume dị irè iji nọgide na-eguzosi ike n’ijere Chineke ozi. Okwu bụ́ isi nke onye ọkà okwu si esi bịa ga-ekwu, bụ́ nke a kpọrọ “Ndị E Wusiri Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ Iji Anyaike Na-agba Àmà,” ga-egosi otú ndokwa ndị a na-eme site n’ọgbakọ si akwadebe anyị iji anya ike na-agba àmà banyere Alaeze ahụ. Olee onye na-agaghị achọ irite uru site n’usoro ihe omume a?
Ndị ọhụrụ raara onwe ha nye bụ́ ndị chọrọ ka e mee ha baptism kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta ngwa ngwa o kwere mee. Anyị nwere obi ike na ka anyị na-amalite afọ nke 12 nke ndokwa ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, a ga-ewuli onye ọ bụla ga-aga ya elu n’ụzọ ime mmụọ maka ọrụ dị n’ihu.