Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
1 “Bụrụnụ Ndị Mmụta Jehova” bụ isiokwu maka usoro ihe omume ọhụrụ nke ụbọchị mgbakọ pụrụ iche malite na March. (Jọn 6:45) Izi ihe Chineke nke sitere n’aka Jehova na-enyere anyị aka n’ezie ibi ndụ na-eju afọ. Ọ na-azụlite n’ime anyị ezi ekele maka ihe nketa ime mmụọ anyị. Mgbalị anyị na-eme inyere ndị ọzọ aka ịnụ ozi ọma ahụ na-eme ka anyị bụrụ ndị bara uru n’ọha mmadụ. Ụbọchị mgbakọ pụrụ iche a ga-eme ka ngọzi ndị ndị Jehova ziri ihe na-enweta pụta ìhè.
2 Usoro ihe omume ahụ ga-egosi ọdịiche dị n’uru dị n’izi ihe Chineke na ihe ize ndụ nke mmụta ụwa. Anyị ga-ahụ n’ụzọ ka doo anya otú Jehova si na-enye ụdị mmụta kasị mma—mmụta dabeere n’Okwu ya, bụ́ Bible. A ga-ekwusi okwu ike n’akụkụ atọ nke ife ofufe ebe ndị anyị na-enweta obi ụtọ n’ịbụ ndị Chineke ziri ihe. Ọzọkwa, a ga-agba ndị ntorobịa ume iṅomi ihe nlereanya Bible ndị pụtara ìhè dị ka Devid na Timoti na iwulite ndụ ha gburugburu ihe omume ime mmụọ. A ga-ewusi okwukwe anyị ike ka a na-emekwa ka iguzosi ike n’ihe nke ndị meworo okenye karị pụta ìhè. Ndị ọhụrụ raara onwe ha nye bụ́ ndị ruru eru ga-enwe ike ịbụ ndị e mere baptism. N’ezi oge tupu ụbọchị mgbakọ ahụ, ha kwesịrị ịgwa onye isi oche ndị nlekọta banyere ọchịchọ ahụ.
3 Okwu bụ isi n’ụbọchị mgbakọ ahụ pụrụ iche nwere isiokwu bụ́ “Ịbụ Ndị Jehova Ziri Ime Uche Ya.” Ọ ga-emesi ike ihe ndị mere o ji dị anyị nile mkpa ịnọgide na-amụ ihe, ịbụ ndị siri ike n’okwukwe, na ịnọgide na-enwe ọganihu. A ga-agba anyị ume iṅomi Jehova site n’izi ndị ọzọ eziokwu ahụ nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi. A ga-agụnye ahụmahụ ndị na-ewuli elu iji gosi otú mbipụta dị iche iche nke Society siworo nyere ọtụtụ ndị aka ịbụ ndị Jehova ziri ihe. A ga-eme ka ihe ndị bara uru a na-arụzu site n’usoro izi ihe zuru ụwa ọnụ nke Jehova pụta ìhè.
4 Mee ndokwa doro anya ịga. Gbaa ndị nile nwere mmasị ume ịnọ ya. Lepụ anya n’ihu ịbụ onye Onye Nkụzi Ukwu anyị ziri ọtụtụ ihe ọma.—Aịsa. 30:20.