‘Nri E Nyere n’Oge Kwesịrị Ekwesị’
1. Olee otú ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ikpeazụ unu gara si nyere ma gị ma ndị ọzọ aka?
1 Ihe anyị na-ekwukarị ma anyị si ụbọchị mgbakọ pụrụ iche lọta bụ, “O yiri nnọọ ka è bu m n’obi kwuo ihe ndị e kwuru ná mgbakọ a!” Otu onye nlekọta sekit kwuru na mgbe a gachara ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke ikpeazụ a a gara, ụfọdụ ndị nọ na sekit ya kwuru na ha ga-ebido jechiwe ozi ọma anya. Onye ọzọ bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, sịrị, “Ihe ndị e kwuru ụbọchị ahụ nyeere anyị aka ichebara ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ echiche, karịchaa ma anyị cheta na anyị nọ n’oge ikpeazụ.” Onye ọzọ sịrị, “Ọtụtụ ndị nkwusa ekwuola na ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ chetaara ha na ọrụ kacha mkpa ha kwesịrị ịrụ n’oge a bụ ikwusa ozi ọma.” Olee otú ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ikpeazụ unu gara si nyere gị aka?
2. Olee ihe ndị a ga-atụle n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2011?
2 N’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2011, a ga-ekwukwa ihe ndị ga-abara anyị uru. Isiokwu ya bụ ‘Gbaba n’Ime Jehova.’ E si n’Abụ Ọma 118:8, 9 nweta ya. Isiokwu ụfọdụ a ga-ekwu bụ: “Otú Jehova Si Abụ Ebe E Wusiri Ike n’Oge Nsogbu,” “Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịgbaba na Nku Jehova,” “Ṅomie Jehova ma Ghọọrọ Ndị Ọzọ Ebe Mgbaba,” “Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Jehova Bụrụ Obi Ike Unu!” nakwa “Paradaịs Ime Mmụọ Anyị Bụ Ebe Mgbaba Jehova Nyere Anyị.”
3. Olee otú anyị ga-esi rite uru zuru ezu ma anyị gaa mgbakọ ahụ?
3 Otú Ị Ga-esi Rite Uru na Ya: A mahaala ọkwa mgbe ọgbakọ unu ga-aga ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, bido ozugbo ahụ mewe ndokwa ịga, gwakwa ndị gị na ha na-amụ Baịbụl na ị ga-achọ ka ha soro gị gaa. Ka anyị nwee ike ‘iji ntachi obi na-amị mkpụrụ,’ anyị agaghị ekwe ka ihe a na-akụziri anyị si n’otu ntị banye, ya esi na nke ọzọ pụọ. (Luk 8:15) N’ihi ya, gee ntị nke ọma ná mgbakọ ahụ, detuokwa ihe ndị ga-abara gị uru ná ndụ ma ọ bụ n’ozi gị. Unu lọta mgbakọ ahụ, gị na ndị ezinụlọ gị wepụta oge tụlee ihe ndị e kwuru, unu kwuokwa otú unu ga-esi mewe ihe ndị unu mụtara.
4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-atụ anya ụbọchị mgbakọ pụrụ iche anyị na-abịa abịa?
4 Okwu ndị a ga-ekwu n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2011 dị ka nri dị ụtọ nke na-edozi ahụ́. E chebaara ya ezigbo echiche kwadebe ya. A kwadebekwara ya n’ihi na a hụrụ anyị n’anya. Ka Jehova gọzie mgbalị niile ị na-eme iji hụ na ị gara ma rite uru ná ‘nri a e nyere n’oge kwesịrị ekwesị,’ nke ga-enyere anyị aka ime nke ọma n’ozi anyị.—Mat. 24:45.