Okwu Chineke Na-akpa Ike
1. Gịnị bụ isiokwu mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga n’afọ ọzọ?
1 Baịbụl adịghị ka akwụkwọ ndị ọzọ ụmụ mmadụ dere. Ọ na-agbanwe ndụ anyị, meekwa ka anyị na-eche echiche otú Jehova chọrọ. Ọ na-enyekwara anyị aka ime uche ya. Ma, olee otú Okwu Chineke na-akparu ike? Olee otú anyị ga-esi kwe ka ọ na-akpa ike ná ndụ anyị? Oleekwa otú anyị ga-esi eji ya na-enyere ndị mmadụ aka? A ga-aza ajụjụ ndị a ná mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga n’afọ ọzọ. Obi siri anyị ike na onye ọ bụla n’ime anyị ga-erite uru ná mgbakọ ahụ. Isiokwu ya ga-abụ “Okwu Chineke Na-akpa Ike.” O si ná Ndị Hibru 4:12.
2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-agba mbọ dee azịza ha?
2 Ajụjụ Ndị A Ga-aza: Ị gaa mgbakọ ahụ, gee ntị nke ọma ka i nwee ike ide azịza ajụjụ ndị a n’akwụkwọ gị.
• Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Okwu Jehova ga-abara anyị uru? (Ọma 29:4)
• Olee ihe anyị ga-eme ka Okwu Chineke na-akpa ike ná ndụ anyị? (Ọma 34:8)
• Olee otú ị ga-esi jiri Okwu Chineke na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ya ana-akpa ike n’ahụ́ ha? (2 Tim. 3:16, 17)
• Olee ihe ga-enyere anyị aka ka ụwa Setan ghara ịghọgbu anyị? (1 Jọn 5:19)
• Ugbu a ị bụ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, olee ihe ga-enyere gị aka ịna-eme nke ọma n’ozi ị na-ejere Jehova? (Jere. 17:7)
• Olee ihe ga-eme ka anyị dị ike mgbe anyị na-adịghị ike? (2 Kọr. 12:10)
• Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-agbanwe ndụ anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị ririla anyị ahụ́? (Efe. 4:23)
3. E wezuga ige ntị n’ihe omume ndị a ga-eme ná mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga n’afọ ọzọ, olee otú ọzọ anyị ga-esi rite uru ma anyị gaa ya?
3 Ihe niile anyị ga-amụta ná mgbakọ ahụ ga-abara anyị ezigbo uru. Ọ na-abụ anyị gaa mgbakọ sekit ma ọ bụ nke distrikti, anyị na ụmụnna anyị ndị si ọgbakọ dị iche iche anọrịa, anyị agbarịta ibe anyị ume. Anyị na ha ga-anọrịkwa ma anyị gaa mgbakọ a pụrụ iche. (Ọma 133:1-3; 2 Kọr. 6:11-13) N’ihi ya, wepụta oge ka gị na ndị enyi gị nọrịa, gbalịakwa meta ndị ọhụrụ. Ọ bụrụ na ọ bụ onye nlekọta distrikti ma ọ bụ onye si na Betel bịara ikwuru unu okwu, ọ ga-adị mma ma ị gaa kelee ya na nwunye ya. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-ejikere mgbakọ pụrụ iche anyị ga-aga n’afọ ọzọ.