Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
Mmụọ nsọ nyere Ndị Kraịst oge gboo ike, nke a mekwara ka ha tinye mgbalị dị nnọọ ukwuu n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile ruo ókè ike kwere ha. (Ọrụ 1:8; Kọl. 1:23) Mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2007, nke isiokwu ya bụ, “Na-ekwusasi Okwu ahụ Ike,” ga-enyere anyị aka iṅomi ihe nlereanya ahụ magburu onwe ya ha setịpụrụ.—Ọrụ 18:5.
Eze Devid kwuru banyere okwu Chineke, sị: “Ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.” (Ọma 19:7) Mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2007 ga-eme ka uru Akwụkwọ Nsọ bara ma a bịa ‘n’ime ka ihe guzozie’ pụta ìhè, ọ ga-agbakwa anyị ume iji Okwu Chineke na-ekwusa ozi ọma ma na-ezi ihe, gbaakwa anyị ume ime ya n’ụzọ na-egosi na anyị ghọtara na ụbọchị Jehova eruwela nnọọ nso. (2 Tim. 3:16, 17) Mgbakọ a ga-egosi otú anyị pụrụ isi zere ịma n’ọnyà na otú anyị pụrụ isi rite uru site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Ọ ga-enyekwara anyị aka iji Okwu Chineke nyere ndị ntorobịa na ndị ọhụrụ aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.
Hụ na ị nọ ya mgbe mgbakọ ahụ ga-amalite, geekwa ntị nke ọma mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Detuo isi ihe ndị e kwuru bụ́ ndị ị pụrụ itinye n’ọrụ n’onwe gị. Gosi na i nwere ekele maka ya site n’ige ntị nke ọma iji nụrụ ntụziaka na ihe ncheta ndị a ga-enye na ya, cheekwa echiche banyere otú ị ga-esi tinye ihe ndị ị mụtara n’ọrụ.
Mgbakọ a pụrụ iche ga-eme ka anyị jirikwuo Okwu Chineke kpọrọ ihe, chetara anyị ka anyị nọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusasi ozi ọma Alaeze ahụ ike, gosikwa anyị otú anyị ga-esi enyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ. Ya mere, kpebisie ike na ị gaghị ekwe ka nke ọ bụla n’ime nduzi na ntụziaka ime mmụọ Jehova si otú a na-enye, kwaa gị!—Aịsa. 30:20b, 21.