Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
Isiokwu usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ a dabeere nnọọ n’Akwụkwọ Nsọ: “Doonụ Onwe Unu n’Okpuru Chineke—Guzogidenụ Ekwensu.” (Jems 4:7) Nke a bụ nduzi ziri ezi maka oge ndị a dị egwu! Anyị irubere iwu Chineke isi na-eme ka anyị na Setan nọrọ n’esemokwu. Usoro ihe omume ahụ ga-akụziri anyị ụzọ isi guzosie ike megide ajọ atụmatụ Ekwensu ndị na-ebibi okwukwe. Olee ụfọdụ n’ime ihe ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa anyị ga-enweta ná mgbakọ a?
Onye nlekọta sekit ga-eme ka ọ pụta ìhè otú “Igosi Ido Onwe Onye n’Okpuru Chineke Dị Ka Ndị Òtù Ezinụlọ” si eme ka ezinụlọ sikwuo ike iji guzogide nrụgide nke ụwa. Okwu mbụ ọkà okwu si esi bịa ga-ekwu n’ụbọchị ahụ, bụ́ “Ihe Iguzogide Ekwensu Pụtara,” ga-akọwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị jiri obi ike mee ihe iji guzogide nzube Setan na-ezube ibibi ọnọdụ ime mmụọ anyị na otú anyị ga-esi mee ya. A ga-eme ka akụkụ ihe omume abụọ kwesị ndị ntorobịa karịsịa, bụ́ ndị na-aghaghịkwa ịnọ na nche megide atụmatụ dị iche iche nke Ekwensu. Ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị toworo eto ugbu a jụrụ ime ihe dị ka ọchịchọ ụwa si dị mgbe ha na-eto eto. Anyị ga-enwe obi ụtọ ịnụ ụfọdụ n’ime ahụmahụ ha.
A chọrọ ka ọha mmadụ na-edo onwe ha n’okpuru ịbụisi. N’ihi ya, okwu mmechi nke ọkà okwu si esi bịa ga-eme ka ebe atọ anyị na-aghaghị igosipụta ido onwe onye n’okpuru Chineke pụta ìhè: (1) nye gọọmenti, (2) n’ọgbakọ, (3) n’ọrụ ego, nakwa (4) n’ime ezinụlọ. Lee usoro ihe omume bara uru ọ bụ!
Ọ dị mkpa ka ndị chọrọ ka e mee ha baptizim n’ụbọchi mgbakọ pụrụ iche a mee ka onyeisi oche ndị nlekọta mara ngwa ngwa o kwere mee. Anyị nile kwesịrị ịkanye akara n’ụbọchị ahụ na kalenda anyị ma mee atụmatụ ịnọ ya maka usoro ihe omume mgbakọ ahụ dum. Ngọzi ndị anyị ga-enweta ga-adịru ebighị ebi ka anyị na-edo onwe anyị n’okpuru Jehova ruo mgbe ebighị ebi.