Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/98 p. 7
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 12/98 p. 7

Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit

“Debe Ihe Nile Chineke Nyere n’Iwu, Wee Dị Ndụ” bụ isiokwu nke usoro ihe omume mgbakọ sekit ụbọchị abụọ ga-amalite na January. (Ilu 4:4) Ọ ga-emesi ike ihe mere irubere iwu Chineke isi na-ejighị bụrụ ibu arọ. Ọzọkwa, ọ ga-egosi otú ime uche Chineke si enye ume ọhụrụ na ezi obi ụtọ nakwa olileanya maka ọdịnihu.—Mat. 11:28-30; Jọn 13:17.

Ndị chọrọ ka e mee ha baptism ná mgbakọ ahụ n’irubere iwu Kraịst isi kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta, ọ ga-emekwa ndokwa ndị dị mkpa.—Mat. 28:19, 20.

Otu usoro isiokwu ga-akọwa ụzọ ndị dị irè anyị pụrụ isi gosi ịhụnanya anyị nwere maka Chineke na ụmụnna anyị. (Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 5:3) Ndụmọdụ na-emetụ n’obi nke sitere n’Abụ Ọma nke 19 na 119 ga-eso n’usoro ihe omume ahụ. Ọ bụ ezie na e dere ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ ndị dị n’abụ ọma ndị a ọtụtụ puku afọ gara aga, anyị ga-ahụ otú o si abara anyị uru n’otu n’otu taa.

Isiokwu nke okwu ihu ọha nke onye nlekọta distrikti ga-ekwu bụ “Tụọ Egwu Chineke, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu.” (Ekli. 12:13) Okwu ikpeazụ nke onye nlekọta sekit ga-ekwu ga-egosi otú ndị ntorobịa pụrụ isi nweta ihe kasị mma ná ndụ ugbu a na ihe mere ha pụrụ iji nwee ntụkwasị obi inweta ọdịnihu ebighị ebi. Onye nlekọta distrikti ga-eweta usoro ihe omume ahụ ná njedebe site n’ịgụpụtasị ọtụtụ uru ndị a na-enweta site n’ibi ndụ kwekọrọ ‘n’iwu Eze’ ahụ nke bụ ịhụnanya. (Jes. 2:8) N’ezie, nke a bụ usoro ihe omume mgbakọ nke ọ na-adịghị onye ga-achọ ka ọ kwaa ya!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya