Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
“Na-ele Anya Ụbọchị Jehova” bụ isiokwu nke usoro ihe omume mgbakọ sekit ụbọchị abụọ na-amalite na January. (2 Pita 3:12) A haziri ya ịkpali echiche anyị nke ịdị ngwa. N’isi nso ndị bi n’ụwa ga-enweta ikpe Jehova. Olee ndị ga-alanarị “oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile”? Nanị ndị nọgidere na-amụ anya n’ime mmụọ na ndị guzobere ụzọ ndụ nke ‘ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile.’—Mkpu. 16:14; 2 Pita 3:11.
Baptism dị mkpa ka mmadụ wee lanarị ụbọchị Jehova. (1 Pita 3:21) Ndị nkwusa chọrọ ka e mee ha baptism ná mgbakọ ahụ kwesịrị ịgwa onye isi oche ndị nlekọta, bụ́ onye ga-eme ndokwa ndị dị mkpa.
Usoro isiokwu nwere akụkụ anọ, bụ́ “Aha Mmadụ Anyị Kwesịrị Ịbụ,” ga-egosi n’ụzọ doro anya ihe omume ndị a gụnyere n’ịdị na-ele anya mbịarute nke ụbọchị Jehova. Okwu ihu ọha, bụ́ “Jiri Amamihe Mee Ihe Ka Ụbọchị Jehova Na-eru Nso,” ga-akọwa ihe ‘ịchọ Jehova, ezi omume, na ịdị umeala n’obi’ pụtara, iji bụrụ onye lanarịrị.—Zef. 2:3.
Mgbakọ sekit ahụ ga-eji okwu abụọ na-akpali akpali nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ga-ekwu mechie, ndị isiokwu ha bụ: “Ndụ Gị Ọ̀ Na-adabere n’Eziokwu Ahụ?” na “Ime Atụmatụ Maka Ọdịnihu Na-eburu Ụbọchị Jehova n’Uche.” Okwu ndị a ga-akpali anyị inyocha ndụ anyị na ime mgbanwe ndị dị mkpa. Amụma Bible na ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi n’ụzọ doro anya na ụbọchị Jehova dị nso. Usoro ihe omume mgbakọ a ga-agba anyị ume ‘inwe anya udo na ịnọ na nche.’ (1 Pita 5:8) Mee atụmatụ ndị doro anya ịga ụbọchị abụọ ahụ.