Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
Olee uru ndị pụtara ìhè ị na-erite ugbu a site n’iso Jehova na-eje ije? Olee otú ị pụrụ isi guzogide ọnwụnwa nke ikwe ka nchụso nke ihe ndị na-emetụtaghị ọchịchị Chineke mee ka ọdịmma nke Alaeze ahụ ghara inwe ọnọdụ mbụ ná ndụ gị? (Mat. 6:33) Ọ̀ na-esiri gị ike ịtụle ọdịiche dị n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ n’ime ụwa nke na-eme ka ihe ọjọọ yie ihe ọma? (Hib. 5:14) A ga-atụle okwu ndị a ná mgbakọ sekit bụ́ “Rite Uru Ugbu A Site n’Ije Ije n’Ụzọ Chineke,” nke ga-amalite na January 2000.—Abụ Ọma. 128:1.
Ihe ọhụrụ a ga-enwe n’ụbọchị Saturday nke mgbakọ sekit a ga-abụ Nzukọ Ije Ozi nke a ga-egosi dị ka ihe nlereanya. Onye nlekọta sekit unu ga-agwa ọgbakọ dị iche iche banyere ihe a na-eme atụmatụ ya ka mmadụ nile wee nwee ike ijikere mgbe ha na-abịa iji rite uru zuru ezu n’ihe omume ahụ.
Akụkụ a kpọrọ “Ndị Ọsụ Ụzọ—Lezienụ Anya nke Ọma Otú Unu Si Ejegharị” ga-egosi anyị ụzọ isi jiri amamihe na ezi uche na-eme ihe iji zụchapụta oge maka ozi ọsụ ụzọ. (Efe. 5:15-17) Isiokwu bụ́ “Lezie Anya Maka Ụzọ Ndị Yiri Nanị Ka Ha Ziri Ezi” ga-akụziri anyị ụzọ isi mara ihe dị Chineke ụtọ n’akụkụ nile nke ndụ. Okwu bụ́ “Ụzọ Amụma Mezuru Emezu Si Emetụta Anyị” ga-enye aka ime ka uche na obi anyị jupụta n’ịhụnanya maka Okwu Chineke. Okwu ihu ọha bụ́ “Ụzọ Chineke—Lee Ka O Si Baa Uru!” ga-emesi ike uru ndị pụtara ìhè anyị na-erite ugbu a site n’ime ihe ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova.
Ọ̀ bụ ọchịchọ gị igosipụta n’ihu ọha site na baptism ime mmiri na ị chọrọ ije ije n’ụzọ Chineke dị ka otu n’ime ndị ohu ya raara onwe ha nye? Mgbe ahụ soro onyeisi oche ndị nlekọta kwurịta okwu ka e wee nwee ike ime ndokwa ndị dị mkpa.
Kpebisie ike na mgbakọ sekit a bịara n’ezi oge agaghị akwa gị. Nọrọ ya n’usoro ihe omume ahụ dum ga-ewe ụbọchị abụọ, n’ihi na “onye ihe na-agara nke ọma ka onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova bụ, nke na-eje ije n’ụzọ Ya nile.”—Abụ Ọma 128:1.