Mgbakọ Sekit nke Ga-enyere Anyị Aka Ịghara Imebi Mmekọrịta Anyị na Chineke
1. Olee otu ụzọ Jehova si enyere anyị aka izisa ozi ọma ọ gwara anyị zisawa?
1 Jehova na-enye anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka izisa ozi ọma ọ gwara anyị zisawa. Ọ na-agwakwa anyị otú anyị ga-esi mee ya, na-azụ anyị ma na-agba anyị ume ime ya. (Mat. 24:14; 2 Tim. 4:17) Otu ụzọ o si eme nke a bụ site ná mgbakọ sekit anyị na-enwe kwa afọ. Isiokwu mgbakọ sekit nke afọ 2010, nke si ná Ndị Rom 8:5 na Jud 17-19, bụ “Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mebie Mmekọrịta Gị na Chineke.” Ọ ga-amalite na January 2, 2010.
2. (a) Olee uru ndị anyị ga-erite ná mgbakọ sekit a? (b) Olee otú mgbakọ sekit ndị gara aga si nyere gị aka n’ozi ọma?
2 Uru Ndị Anyị Ga-erite: Okwu ndị a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ ga-enyere anyị aka ịmata ihe ndị na-adọpụ uche, bụ́ ndị nwere ike iri oge anyị ma mee ka uche anyị ghara ịdị n’ihe ndị dị mkpa n’ezie. Anyị ga-amụta otú anyị ga-esi lụsoo mmụọ ime ihe otú o si masị anyị ọgụ, anyị ga-atụlekwa ihe e ji ama onye mmụọ nsọ na-achị. N’okwu mmadụ atọ ga-ekwu na Sunday, a ga-eme ka a mara ihe onye ọ bụla nakwa ezinụlọ ọ bụla nwere ike ime iji hụ na mmekọrịta ha na Chineke sikwuru ike, nke ka nke, mgbe ndị ọzọ na-akwanye ha ọkụ n’ahụ́ ime ihe ha na-achọghị ime na mgbe ule tara akpụ bịaara ha. Okwu ndị a ga-ekwu ga-enyere anyị aka ichebe obi anyị, mee ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma, meekwa ka anyị buru n’obi ngọzi ndị ga-abịara ndị na-anaghị ekwe ka ihe ọ bụla mebie mmekọrịta ha na Chineke.
3. Olee mgbe unu ga-aga mgbakọ sekit unu, oleekwa ihe i kwesịrị ikpebi ime?
3 Ozugbo a gwara ọgbakọ unu ebe unu ga-aga mgbakọ sekit ọzọ na mgbe unu ga-aga ya, malite mewe ndokwa ịgazucha ụbọchị abụọ ahụ dum, hụkwa na i gere ntị. Ka obi sie gị ike na Jehova na-agọzi onye dị uchu.—Ilu 21:5.
4. Olee ihe anyị ji n’aka na anyị ga-enweta ná mgbakọ sekit anyị na-abịanụ?
4 N’eziokwu, Jehova bụ Onye nyere anyị onyinye a mara mma. Okwu ndị a ga-ekwu ná mgbakọ sekit a, nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwadebere, bụ nnọọ ihe ndị ga-enyere anyị aka imekwu nke ọma. Anyị na-ekele Jehova maka ihe niile o ji ịhụnanya na-enye anyị iji nyere anyị aka ‘ijidesi nkwupụta ihu ọha nke olileanya anyị ike n’amaghị jijiji.’—Hib. 10:23-25; Jems 1:17.