Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/04 p. 5
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntụleghachi Maka Usoro Ihe Omume Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Mgbakọ Sekit nke Ga-enyere Anyị Aka Ịghara Imebi Mmekọrịta Anyị na Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 12/04 p. 5

Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit

‘N’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ amamihe sitere n’aka Chineke dị anyị mkpa iji nweta ma nọgide bụrụ ndị nwere ihu ọma Jehova. (2 Tim. 3:1) Usoro ihe omume mgbakọ sekit maka afọ 2005 ga-enye anyị ndụmọdụ na agbamume ndị bara uru ka ọ na-atụle isiokwu bụ́ “Bụrụ Onye ‘Amamihe nke Sitere n’Elu’ Na-eduzi.”—Jems 3:17.

Okwu mbụ ọtụtụ ndị ga-ekwu, bụ́ “Igosipụta ‘Amamihe nke Sitere n’Elu’ ná Ndụ Anyị,” ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ịdị ọcha, ime udo, inwe ezi uche, na ịdị njikere irube isi, pụtara. E mesịa, onye nlekọta sekit ga-eleba anya n’akụkụ atọ ndị ọzọ nke amamihe sitere n’aka Chineke. Onye nlekọta distrikti ga-eweta usoro ihe omume nke ụbọchị mbụ ahụ ná njedebe site n’igosi otú ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst si bụrụ ndị a kwadebere ikwu banyere amamihe Chineke n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-ele ha anya dị ka ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.”—Ọrụ 4:13.

N’ụbọchị nke abụọ, okwu ọtụtụ ndị ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Na-achụso Ihe Ndị Na-ewuli Elu,” ga-enyere anyị aka ịghọta na izere ihe ndị pụrụ ime ka anyị kụdaa aka n’ụzọ ime mmụọ. Ọ ga-egosikwa anyị otú anyị pụrụ isi wulie ndị ọzọ elu ná nzukọ ọgbakọ, n’ozi ubi, nakwa n’ime ezinụlọ. Okwu ihu ọha, bụ́ “Otú Amamihe Chineke Si Abara Anyị Uru,” ga-eme ka anyị nwekwuo ekele maka uru ndị anyị na-erite ka anyị na-etinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị. Okwu mmechi, bụ́ “Itinye Amamihe Chineke n’Ọrụ Na-echebe Anyị,” ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịdị na-agakwuru Jehova maka amamihe n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.

Akụkụ na-ehi ụdụ nke mgbakọ ọ bụla na-abụ baptizim nke ndị ọhụrụ na-eso ụzọ. Usoro ihe omume ahụ ga-agụnyekwa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche dịịrị izu ahụ. Jehova chọrọ ka anyị nile rite uru site n’amamihe ọ na-enye. Ndụmọdụ na agbamume ndị anyị ga-enweta ná mgbakọ sekit anyị ga-ewusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ.—Ilu 3:13-18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya