Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Mgbakọ Sekit
1 Na-amalite na January, isiokwu maka mgbakọ sekit ga-abụ “Nụrụ ma Mụta Ime Okwu Chineke.” Isiokwu a, nke dabeere na Deuterọnọmi 31:12, 13 na-enye ihe ndabere kwesịrị ekwesị maka usoro ihe omume ahụ dum iji mee ka ihe mmụta ndị dị anyị mkpa ịmụta na itinye n’ọrụ pụta ìhè.
2 Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị mmadụ taa na-aṅa ndị mmụọ na-eduhie eduhie ntị, e nwere mkpa dị ukwuu ka onye ọ bụla n’ime anyị na-aṅa ntị n’Okwu Chineke na ịmụta ime ya. (Luk 11:28; 1 Tim. 4:1) N’iburu nke a n’uche, e dokwawo usoro ihe omume mgbakọ sekit iji nye ndị nkwusa, ezinụlọ dị iche iche, ndị okenye, na ndị ọsụ ụzọ agbamume na enyemaka. Na Saturday, a ga-enwe usoro isiokwu n’isiokwu dị akụkụ anọ bụ́ “Ịnagide Nsogbu Anyị Nile—Site n’Ige Ntị n’Okwu Chineke.” N’ụtụtụ Sunday kwa, a ga-enwe usoro isiokwu a kpọrọ “Ụzọ Akwụkwọ Nsọ Si Enye Ahụhụ n’Ezi Omume.” Usoro ihe omume ahụ dum ga-enye agbamume ime mmụọ nke na-ekwesịghị ịkwa gị na ezinụlọ gị.
3 Na ma Saturday ma Sunday, a ga-atụ aro ndị dị irè maka ozi ubi, meekwa ihe ngosi ha. A ga-enwekwa ahụmahụ na ajụjụ ọnụ ndị na-agba ume ma na-ezikwa ihe. N’ihi ya, site n’ịnọ ya na ige ntị n’ebumnobi nke itinye ihe ị na-amụta n’ọrụ, ị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma ime iwu nile nke Okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu.
4 Otu n’ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ná mgbakọ sekit ahụ ga-abụ baptism nke ụmụnna nwoke na nwanyị ndị raara onwe ha nye ọhụrụ. Ogologo oge tupu nkwupụta ihu ọha nke a nke nraranye ha, ndị a ga-eme baptism ga-ekwupụta ọchịchọ ha maka baptism gwa onye isi oche ndị nlekọta ka o wee nwee ike idokwa maka ndị okenye isoro ha zukọọ.
5 Isiokwu nke okwu ihu ọha maka usoro mgbakọ sekit nke a bụ “N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Bụrụ Ndị Bible Na-eduzi?” Kpọọ ndị nwere mmasị òkù ịbịa. N’atụmanya nke agbamume na enyemaka dị oké mkpa nke gị na ezinụlọ gị ga-enweta, mee atụmatụ doro anya ịnọ ya maka usoro ihe omume ahụ dum.