Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke September 1 ruo December 22, 1997. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ọpụpụ 21:22, 23 na-enyere anyị aka ịghọta na Chineke na-ele nwa mmadụ a na-amụbeghị amụ anya dị ka ndụ dị oké ọnụ ahịa. [kl p. 128 para. 21]
2. Na Luk 22:30, “ebo iri na abụọ nke Israel” pụtara otu ihe ahụ dị ka na Matiu 19:28, ebe ihe ọ gụnyere gbasapụrụ gabiga ndị nchụàjà nọ n’okpuru e ji mmụọ nsọ mụta nke Jisọs ruo n’ịgụnye ihe nile ọzọ a kpọrọ mmadụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 1/15 p. 26 para. 10; p. 27 para. 12.]
3. Ihe mere ndị na-eso ụzọ Jisọs ji nwee ijuanya maka ya ikwunyere nwanyị Sameria okwu bụ na ọ bụ nwanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ. (Jọn 4:27) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 7/15 p. 15 para. 1-2.]
4. Okwu bụ́ “site na mbụ” na Jọn 6:64 na-egosi na Jisọs maara mgbe a họpụtara Judas dị ka onyeozi na ọ ga-abụ ya ga-arara Ya nye. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee gt isi nke 55 para. 9.]
5. Ịnụ ụtọ ndụ ezinụlọ ndị Kraịst bụ nanị okwu metụtara ịgbahapụ mmekọahụ rụrụ arụ na inwe alụmdi na nwunye e debanyere n’akwụkwọ iwu. [uw p. 139 para. 1]
6. Ma à na-ele ndị ọchịchị obodo anya dị ka ndị ziri ezi ma ọ bụ ndị na-ezighị ezi, ezi ndị Kraịst kwesịrị idebanyere ha alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ nke ọma. [kl p. 122 para. 11]
7. “Ememe ndị Juu” a kpọtụrụ uche na Jọn 5:1 na-ezo aka n’Ememe Ngabiga nke 31 O.A. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee gt isi nke 29.]
8. Ọ bụrụ na onye anyị na ya na-efekọ ofufe emejọọ anyị, ọ gaghị ezi ezi ịkpapụ onye ahụ mejọrọnụ ná ndụ anyị, na-ezere iso ya nwee mmekọ ọ bụla. [uw p. 134 para. 7]
9. Ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị dị anyị nile mkpa. [uw p. 130 para. 12]
10. Ọ bụ Luk dere Ọrụ Ndị Ozi mgbe ọ nọ n’Efesọs. [w90 5/15 p. 24 para. 3, 4]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Olee otú a gaje isi gosipụta ịbụisi ndị Kraịst? [uw p. 142 para. 7]
12. N’ikwekọ n’ihe atụ nke ndị Efesọs bụ́ ndị Kraịst na narị afọ mbụ, olee otu nzọụkwụ dị mkpa a na-aghaghị iwere iji guzogide ndị ajọ mmụọ? (Ọrụ 19:19) [kl p. 114 para. 14]
13. N’ihi gịnị ka Jisọs ji jụ itinye ọnụ n’esemokwu ihe nketa? (Luk 12:13, 14) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 4/1 p. 28.]
14. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ na-amataghị mgbe ha jụrụ Jisọs ma ọ na-aga iweghachiri Israel Alaeze ahụ, dị ka e dekọrọ n’Ọrụ 1:6? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 6/1 p. 11 para. 4.]
15. Kwuo ihe abụọ pụrụ iso mee ka e nwee alụmdi na nwunye na-adịgide adịgide. [uw p. 140 para. 4]
16. Olee otú ụfọdụ ndị mmụọ ozi si mehie n’ụbọchị Noa? [kl p. 109 para. 4]
17. Dị ka akwụkwọ Mkpughe na-ekwu, gịnị bụ njedebe nke “ndị na-agwọ nsí” ma ọ bụrụ na ha echegharịghị ma gbanwee ụzọ ha? [kl p. 111 para. 8]
18. N’ụzọ dị aṅaa ka Iwu Mosis si ‘mee ka mmehie pụta ìhè’? (Gal. 3:19) [uw p. 147 para. 4]
19. Ebe Jisọs bụ nwoke zuru okè, ọ nakwerekwa ọkwá ya dị ka Onye Ozizi, n’ihi gịnị ka ọ na-ekweghị ka a kpọọ ya “Ezi Onye Ozizi”? (Luk 18:18, 19) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 3/1 p. 15 para. 7.]
20. Gịnị dị ọhụrụ banyere iwu e nyere na Jọn 13:34? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 2/1 p. 21 para. 5-6.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi okwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Ọ bụrụ na anyị amata na ọ dị ihe nwanna anyị nwere megide anyị, ọ na-achọ _________________________ na _________________________ iji bute ụzọ ma gbalịa iweghachi _________________________. [uw p. 135 para. 10]
22. ‘Iri pound ise’ ahụ na-anọchite anya _________________________ ndị na-eso ụzọ ahụ e jiri mmụọ nsọ mụọ pụrụ iji mee ihe n’inwetakwu _________________________ nke Alaeze eluigwe. (Luk 19:13) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 10/1 p. 8.]
23. Ebubo ụgha atọ ndị Juu boro Jisọs n’ihu Paịlet, gọvanọ Rom na-achị Judia, gụnyere ikpu _________________________ ihu, ịmachibido ịkwụ _________________________, na ikwu na Ya Onwe Ya bụ _________________________. (Luk 23:2) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 12/1 p. 9 para. 1.]
24. Ịhụnanya anyị maka ụmụnna anyị pụrụ ito ma ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị ileghara obere _________________________ ọ bụla n’akụkụ nke ha anya, chọpụta _________________________ ha ndị dị mma, rịbakwa ama ụzọ _________________________ si na-eji ha eme ihe. [uw p. 137 para. 15]
25. Dị ka ndị mmụta Bible, anyị kwesịrị ịmụta iji akwụkwọ ntụaka ndị e nwere eme nnyocha, anyị ekwesịghị ịdị na-atụ anya azịza _________________________ ma ọ bụ _________________________ nye ajụjụ ọ bụla, anyị kwesịkwara ime _________________________ ndị na-egosipụta ịhụnanya anyị maka _________________________ na maka ndị òtù ezinụlọ anyị. [uw-IB p. 144 para. 13]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Ezi ndị Kraịst adịghị agba Krismas ma ọ bụ ụbọchị ezumike ọ bụla ọzọ dabeere na nkwenkwe okpukpe ụgha n’ihi na ha na-enye Jehova (ofufe a na-ekewaghị ekewa; ofufe miri emi) ha adịghịkwa edebe ụbọchị ezumike ndị (na-efe; na-akwalite; na-asọpụrụ) ụmụ mmadụ na-emehie emehie ma ọ bụ mba dị iche iche. [kl p. 126 para. 16]
27. Eziokwu nke na-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha bụ eziokwu banyere (sayensị; okpukpe ụgha; Jisọs Kraịst) n’ihi na site na ya nanị ka a pụrụ ime ka anyị nwere onye anyị pụọ (n’ozizi ụgha; atụmatụ ụwa; mmehie na-eweta ọnwụ). (Jọn 8:12-36) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 5/1 p. 9 para. 5.]
28. “Atụrụ ọzọ” ahụ a kpọrọ aha na Jọn 10:16 na-ezo aka n’ebe (ndị Jentaịl bụ́ ndị Kraịst; ndị Juu bụ́ ndị Kraịst; ndị ọzọ nile nwere atụmanya nke ndụ na Paradaịs n’elu ụwa) nọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 4/15 p. 31 para. 4.]
29. Mgbe Jisọs jụrụ Pita onyeozi sị, “Ị̀ hụrụ m n’anya karịa ndị a?,” Ọ na-ajụ Pita ma ọ hụrụ Ya n’anya karịa ka (ọ hụrụ ndị ọzọ a na-eso ụzọ; ndị ọzọ a na-eso ụzọ hụrụ Jisọs; ọ hụrụ ihe ndị a, dị ka azụ̀). (Jọn 21:15) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 11/1 p. 31 para. 9.]
30. Ọbụna ka ọnwụ ya na-eru nso, Jisọs dị ka (Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma; Ezi Onye Ozizi; Ezi Vine ahụ) nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ịhụnanya ma kpee ekpere n’ihi ha. (Jọn 10:1-11) [w90 3/15 p. 25 para. 1]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ọpụ. 31:12, 13; Ilu 3:9, 10; Luk 13:4, 5; Rom 7:6, 7; 2 Tim. 3:12
31. Jisọs rụrụ ụka megide nkwenkwe akara aka, na-ezo aka n’otu ọdachi nke ndị na-ege ya ntị maara nke ọma na nke o doro anya na o gosiri na ọ bụ mgbe na ihe ndapụta kpatara ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 9/1 p. 5 para. 5.]
32. Ọ dịghị mgbe e bu n’uche ka Iwu Mosis jigide ihe nile a kpọrọ mmadụ. [uw p. 147 para. 5]
33. Anyị ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke adịghị ekwe nkwa na ndị ọzọ ga-emeso anyị nke ọma mgbe nile. [kl p. 118 para. 2]
34. Mgbe a kagburu Iwu Mosis, Iwu Iri ahụ sokwa ya. [uw p. 147 para. 5]
35. Jehova ga-agọzi anyị ka anyị na-eji oge, ume, na ihe onwunwe anyị ndị ọzọ, gụnyere ego anyị, akwalite ezi ofufe. [kl p. 120 para. 8]