Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị ka onye Kraịst kwesịrị ime mgbe a kpọrọ ya maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe?
N’ala ụfọdụ, usoro ikpe na-eji òtù nnọkọ ikpe a họtara n’etiti ụmụ amaala eme ihe. N’ebe a na-eme nke a, onye Kraịst aghaghị ikpebi ụzọ ọ ga-esi meghachi omume mgbe e nyere ya ntụziaka ịbịa maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe. Ọtụtụ ndị Kraịst ekpebiwo n’ezi akọ na uche na ụkpụrụ Bible akagbughị ịpụta, ọbụna dị ka Shedrak, Mishak, na Abednego si kwenye ná ntụziaka nke ọchịchị Babilọn ịpụta ná ndagwurugwu Dura na dị ka Josef na Meri si jee Betlehem ná ntụziaka nke ndị ọchịchị Rom. (Daniel 3:1-12; Luk 2:1-4) Otú ọ dị, e nwere ihe ezi ndị Kraịst pụrụ ịtụle.
Iji òtù nnọkọ ikpe eme ihe adịghị n’ebe nile. N’ala ụfọdụ, onye ọrụ ọkàikpe ma ọ bụ ìgwè ndị ọkàikpe na-ekpebi okwu ikpe obodo na nke ime mpụ. N’ebe ndị ọzọ, e nwere ihe a maara dị ka iwu a na-edeghị ede, òtù nnọkọ ikpe na-abụkwa akụkụ usoro ikpe ahụ. Ma, ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ nwere nanị echiche dị inyoghị inyoghị banyere otú e si ahọrọ òtù nnọkọ ikpe na ihe ha na-eme. Ya mere ntụle dị mkpirikpi ga-enye aka ma ọrụ nnọkọ ikpe ọ̀ na-eche gị ihu ma ọ bụ na o cheghị gị.
Ndị Chineke matara Jehova dị ka Onye Ikpe Kasị Elu. (Aịsaịa 33:22) N’Israel oge ochie, ndị ikom nwere ahụmahụ bụ́ ndị ziri ezi, na-adịghị elekwa mmadụ anya n’ihu jere ozi dị ka ndị ikpe idozi esemokwu na ikpebi ajụjụ banyere iwu. (Ọpụpụ 18:13-22; Levitikọs 19:15; Deuterọnọmi 21:18-21) N’oge Jisọs nọ n’ụwa, Sanhedrin, ụlọikpe dị elu ndị Juu, hụrụ maka ọrụ ikpe. (Mak 15:1; Ọrụ 5:27-34) E nweghị ndokwa ọ bụla maka onye Juu nkịtị iso n’òtù nnọkọ ikpe obodo.
Mba ndị ọzọ jiri òtù nnọkọ ikpe nke ụmụ amaala mejupụtara mee ihe. Ndị nnọkọ ikpe dị mmadụ 501 kpere Socrates ikpe. E nwekwara ikpe òtù nnọkọ ikpe kpere na Roman Republic, ọ bụ ezie na a kagburu nke a n’okpuru ndị eze ukwu. Mgbe e mesịrị, Eze Henry nke Atọ nke England dokwara ka ndị agbata obi nke onye e boro ebubo kpe ya ikpe. E chere na ebe ha maara onye ahụ e boro ebubo, ikpe ha ga-aka zie ezi karịa usoro ndị ahụ nke ọ ga-agbalị igosipụta na aka ya dị ọcha site n’ọgụ ma ọ bụ site n’ịlanarị ule ụfọdụ siri ike. Ka oge na-aga, usoro òtù nnọkọ ikpe gbanwere gaa ná ndokwa ebe otu ìgwè nke ụmụ amaala ga-anụ okwu ikpe ma mee mkpebi dabeere n’ihe àmà. Onye ọrụ ọkàikpe ga-eduzi ha n’ihe àmà ndị ahụ.
E nwere ụdị dị iche iche nke òtù nnọkọ ikpe, ọnụ ọgụgụ nke ndị so n’òtù nnọkọ ikpe, na ihe iru ná mkpebi gụnyere. Dị ka ihe atụ, na United States, òtù nnọkọ ikpe ukwu nke site ná ndị òtù 12 ruo 23 na-ekpebi ma è nwere ihe àmà zuru ezu maka ibo mmadụ ebubo ịda iwu ime mpụ; ọ dịghị ekpebi amamikpe ma ọ bụ aka ịdị ọcha. N’ụzọ yiri nke ahụ, n’òtù nnọkọ ikpe nke na-achọpụta ihe gburu mmadụ (òtù nnọkọ ikpe nke na-agba ajụjụ ọnụ), ndị ahụ so n’òtù na-eleba ikpe anya ga-atụle ihe àmà iji kpebie ma e mere mpụ.
Mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ chere echiche banyere òtù nnọkọ ikpe, ha na-ebu n’obi ìgwè nke ụmụ amaala 12 nọ n’ikpe—ma ọ́ bụghị esemokwu obodo ọ bụrụ okwu ikpe ime mpụ—ndị na-anụ akaebe iji kpebie amamikpe ma ọ bụ aka ịdị ọcha. Nke a bụ obere òtù nnọkọ ikpe (dị nta), n’ụzọ dị iche n’òtù nnọkọ ikpe ukwu. N’ozuzu, ụlọikpe na-ezipụrụ ndị mmadụ ozi ịpụta maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe bụ́ ndị a họtara n’etiti ndị na-atụ vootu, ndị ọkwọ ụgbọala nwere akwụkwọ ikike, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha. A pụrụ ikwu na ụfọdụ erughị eru ozugbo ahụ, dị ka ndị a maworo ikpe ime arụ na ndị ike iche echiche ha dị nta. Na-adabere n’iwu obodo, ndị ọzọ—dị ka ndị dọkịta, ndị ụkọchukwu, ndị ọkàiwu, ma ọ bụ ndị nwere obere azụmahịa—pụrụ ikwu ka a gụpụ ha. (A pụrụ ịgụpụ ụfọdụ n’ihi na ha jụwapụrụ isi ije ozi nnọkọ ikpe n’ihi akọ na uche ha.) Ma, ndị ọchịchị na-akwụsị ime ngụpụ n’ụzọ na-arị elu nke mere na ọ bụ iwu na mmadụ nile ga-abịa maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe, ikekwe ugboro ugboro n’ọtụtụ afọ.
Ọ bụghị ndị nile na-abịa maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe na-anọrịrị dị ka ndị so n’òtù nnọkọ ikpe n’ikpe. Site n’ime ìgwè a kpọrọ maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe, a na-ahọrọ ụfọdụ aghara aghara dị ka ndị pụrụ iso n’òtù nnọkọ ikpe maka otu ikpe kpọmkwem. Mgbe ahụ ọkàikpe ahụ na-akọwa òtù abụọ ahụ na ndị ọkàiwu ha, ma na-akọwa ụdị okwu ikpe ọ bụ. Ya na ndị ọkàiwu ahụ na-enyocha nke ọ bụla pụrụ iso n’òtù nnọkọ ikpe. Nke a bụ oge ikwuwa okwu ma ọ bụrụ na mmadụ nwere ihe dabeere n’akọ na uche ya mere ọ na-agaghị eje ozi n’ihi ụdị nke okwu ikpe ahụ.
Ọ dị mkpa iwebilata ìgwè ndị ahụ ruo n’ọnụ ọgụgụ ga-anọ ya n’oge okwu ikpe ahụ dum. Ọkàikpe ahụ ga-achụ onye ọ bụla a pụrụ inwe obi abụọ n’eleghị mmadụ anya n’ihu ya n’ihi mmasị ọ pụrụ inwe n’okwu ikpe ahụ. Ọzọkwa, ndị ọkàiwu nọ n’akụkụ nke ọ bụla nwere ikike ịchụla ndị òtù nnọkọ ikpe ole na ole. Onye ọ bụla a chụpụrụ n’òtù nnọkọ ikpe na-alaghachi n’ìgwè òtù nnọkọ ikpe ịga chere maka nhọrọ aghara aghara maka okwu ikpe ndị ọzọ. Ụfọdụ ndị Kraịst nọ n’ọnọdụ a ejiriwo oge ahụ gbaa àmà mberede. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gafere, ọrụ òtù nnọkọ ikpe nke mmadụ na-agwụ, ma ọ̀ rụwo ọrụ n’ezie dị ka onye òtù nnọkọ ikpe ma ọ bụ na ọ rụghị.
Ndị Kraịst na-agba mbọ ‘ime ihe nile nke aka ha,’ ghara itinye aka ‘n’ihe na-abụghị nke aka ha.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11; 1 Pita 4:15) Mgbe onye Juu gwara Jisọs ka o kpee ikpe banyere ihe nketa, ọ zaghachiri: “Nwoke, ònye mere m ka M bụrụ onye ikpe ma ọ bụ onye okike n’ebe unu nọ?” (Luk 12:13, 14) Jisọs bịara ịkpọsa ozi ọma Alaeze ahụ, ọ bụghị ikpebi okwu ikpe. (Luk 4:18, 43) Ọ pụrụ ịbụ na nzaghachi Jisọs akwaliworị nwoke ahụ iji usoro idozi esemokwu nke e setịpụrụ n’Iwu Chineke mee ihe. (Deuterọnọmi 1:16, 17) Ọ bụ ezie na ihe ndị ahụ ziri ezi, ịgbaso ntụziaka ịga maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe dị iche pụọ n’itinye onwe onye n’ihe nke aka ndị ọzọ. O yikarịrị ọnọdụ nke ndị enyi Daniel atọ. Ọchịchị Babilọn nyere ha iwu ịga ndagwurugwu Dura, ha ime otú ahụ emebighịkwa Iwu Chineke. Ihe ha mesịrị mee bụkwa ihe ọzọ, dị ka Bible na-egosi.—Daniel 3:16-18.
Mgbe ndị ohu Chineke kwụsịrị ịnọ n’okpuru Iwu Mosis, ha aghaghị ịgbaso ọtụtụ ụlọikpe obodo dị n’ala dị iche iche mgba. Pọl onyeozi gbara “ndị nsọ” nọ na Kọrint ume idozi esemokwu n’ime ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ọ kpọrọ ndị ikpe nke ụlọikpe obodo “ndị ajọ omume,” Pọl agọnarịghị na ihe ndị dị otú ahụ nwere ọnọdụ n’ịhụ maka ihe omume obodo. (1 Ndị Kọrint 6:1) Ọ gọpụrụ onwe ya n’usoro ikpe Rom, ọbụna na-ekwu ka Siza kpegharịa ikpe ya. Ọ bụghị dị ka a ga-asị na ụlọikpe obodo ajọka.—Ọrụ 24:10; 25:10, 11.
Ụlọikpe obodo bụ ngalaba ọrụ dịịrị “ndị na-achị isi.” Ndị dị otú ahụ “bụkwa ndị Chineke doworo,” ha na-emekwa iwu, ma hụ na e tinyere ha n’ọrụ. Pọl dere, sị: “Ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi n’ebe ị nọ iwetara gị ezi ihe. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu; n’ihi na ọ bụghị n’efu ka ọ na-ebu mma agha: n’ihi na ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi, onye ọ́bọ̀ iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe.” Ndị Kraịst adịghị ‘emegide onye ahụ na-achị isi’ ka ọ na-arụ ọrụ ndị dị otú ahụ iwu kwadoro, n’ihi na ha achọghị ‘iguzogide ya’ ma nata amamikpe.—Ndị Rom 13:1-4; Taịtọs 3:1.
N’ime ka ihe dị iche iche nwee nguzozi, ndị Kraịst kwesịrị ịtụle ma ha ga-edo onwe ha n’okpuru ihe ụfọdụ Siza chọrọ. Pọl dụrụ ọdụ, sị: “Na-akwụghachinụ mmadụ nile [ndị na-achị isi] ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: tụọnụ ụtụ nye onye unu ji ụgwọ ụtụ; tụọnụ ụtụ ahịa nye onye unu ji ụgwọ ụtụ ahịa; tụọnụ egwu onye unu ji ụgwọ egwu.” (Ndị Rom 13:7) Nke ahụ doro anya n’ihe metụtara ụtụ e ji ego akwụ. Ọ bụrụ na Siza ekwuo na ụmụ amaala aghaghị inye oge na mgbalị ha iji debe okporo ụzọ ọcha ma ọ bụ rụọ ọrụ ọzọ nke so n’ọrụ ndị Siza na-arụ, onye Kraịst ọ bụla aghaghị ikpebi ma ọ̀ ga-erube isi.—Matiu 5:41.
Ụfọdụ ndị Kraịst elewo ije ozi òtù nnọkọ ikpe anya dị ka inye Siza ihe nke Siza. (Luk 20:25) N’ọrụ òtù nnọkọ ikpe, ọrụ ahụ bụ ịnụ ihe àmà ma jiri ịkwụwa aka ọtọ kwuo echiche ya n’ihe ndị bụ eziokwu ma ọ bụ iwu. Dị ka ihe atụ, n’òtù nnọkọ ikpe ukwu, ndị so n’òtù na-eleba ikpe anya na-ekpebi ma ihe àmà ọ̀ ga-akpata ịkpụpụ mmadụ n’ụlọikpe; ha adịghị ekpebi ma ikpe ọ̀ mara mmadụ. Olee maka ikpe nkiti? N’okwu ikpe obodo, òtù nnọkọ ikpe pụrụ ikwu ka a kwụọ nhá ma ọ bụ nye ihe iti aka n’obi. N’okwu ikpe ime mpụ, ha ga-ekpebi ma ihe àmà ọ̀ na-akwado mkpebi amamikpe. Mgbe ụfọdụ ha na-atụ aro amamikpe iwu setịpụrụ e kwesịrị iji mee ihe. Mgbe ahụ ọchịchị na-eji ikike ya mee ihe “iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe,” ma ọ bụ “bọọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:14.
Olee ma ọ bụrụ na onye Kraịst echeghị na akọ na uche ya nyere ya ohere ije ozi n’otu òtù nnọkọ ikpe kpọmkwem? Bible akpọtụghị ọrụ òtù nnọkọ ikpe aha, n’ihi ya ọ pụghị ikwu sị, ‘O megidere okpukpe m ije ozi n’òtù nnọkọ ikpe ọ bụla.’ Na-adabere n’okwu ikpe ọ bụ, ọ pụrụ ikwu na ije ozi n’òtù nnọkọ ikpe maka otu okwu ikpe kpọmkwem megidere akọ na uche ya. Ọ pụrụ ịdị otú ahụ ma ọ bụrụ na otu okwu ikpe metụtara omume mmekọahụ rụrụ arụ, nsikwopụ afọ ime, igbu mmadụ, ma ọ bụ okwu ọzọ ndị ihe ọmụma Bible kpụziworo echiche ya na ha, ọ bụghị site nanị n’iwu obodo. Otú ọ dị, n’ezie, ọ pụrụ nnọọ ikwe omume na ikpe nke a họọrọ ya maka ya agaghị emetụta ụdị okwu ndị ahụ.
Onye Kraịst tozuru okè ga-atụlekwa ma ọ̀ ga-ekere òkè n’ibu ọ bụla maka amamikpe ndị ọkàikpe kwupụtara. (Tụlee Jenesis 39:17-20; 1 Timoti 5:22.) Ọ bụrụ na mkpebi amamikpe ezighị ezi, ọ bụrụkwa na e kwupụtara amamikpe ọnwụ, onye Kraịst nọ n’òtù nnọkọ ikpe ọ̀ ga-ekere òkè n’ikpe ọmụma ọbara? (Ọpụpụ 22:2; Deuterọnọmi 21:8; 22:8; Jeremaịa 2:34; Matiu 23:35; Ọrụ 18:6) N’oge ikpe Jisọs Paịlet chọrọ ka ‘ikpe ọbara Onye ezi omume a ghara ịma ya.’ Ndị Juu ji ngwa kwuo, sị: “Ọbara Ya dị anyị n’isi, dịkwa n’isi ụmụ anyị.”—Matiu 27:24, 25.
Ọ bụrụ na onye Kraịst gara maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe, dị ka ọchịchị nyere ntụziaka ya, ma n’ihi akọ na uche onwe ya jụ ije ozi n’otu okwu ikpe kpọmkwem n’agbanyeghị isi ọnwụ nke ọkàikpe ahụ, onye Kraịst ahụ kwesịrị ịdị njikere iche ihe ndị ga-esi na ya pụta ihu—ma nke ahụ ọ̀ bụ nhá ma ọ bụ ịga mkpọrọ.—1 Pita 2:19.
Ná nkwubi okwu, onye Kraịst ọ bụla chere ọrụ òtù nnọkọ ikpe ihu aghaghị ikpebi ụzọ ọ ga-agbaso, na-adabere ná nghọta ya nke Bible na n’akọ na uche nke ya. Ụfọdụ ndị Kraịst agawo maka ọrụ òtù nnọkọ ikpe, ha ejewokwa ozi n’òtù nnọkọ ikpe ụfọdụ. Ndị ọzọ abụwo ndị echiche ha manyere ịjụ ọbụna n’agbanyeghị ntaramahụhụ. Onye Kraịst ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme, ndị ọzọ ekwesịghịkwa ịkatọ mkpebi ya.—Ndị Galetia 6:5.