Ndịàmà Jehova Ga-enwe Mgbakọ Mba Nile
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eme atụmatụ inwe mgbakọ mba nile na 1998. Ọkwa a nwetara nnabata na-ekpo obi ọkụ ná nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, nke e nwere n’Ụlọ Mgbakọ dị na Jersey City na Saturday, October 5, 1996.
Tinyere mgbakọ distrikti ndị a na-enwebu, a ga-enwe ọtụtụ mgbakọ mba nile n’Ebe Ugwu America n’etiti 1998. A na-atụ anya na mgbakọ ndị a ga-achịkọta ọtụtụ narị puku Ndịàmà site n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Iji mee ka a nọchite anya ọtụtụ ala dị ka o kwere omume, nke ọ bụla n’ihe karịrị alaka 100 nke Watch Tower Society ga-enwe òkè ha nke ndị ga-aga maka obodo ukwu a họpụtara maka mgbakọ mba nile n’Ebe Ugwu America.
N’ụzọ doro anya, ọ bụghị ndị nile chọrọ ịga Ebe Ugwu America ga-enwe ike ime otú ahụ. Otú ọ dị, ọ pụrụ ikwe omume ka ọtụtụ puku gaa otu mgbakọ mba nile dị ebe obibi ha nso karị. A na-eme ndokwa maka inwe mgbakọ mba nile na mba abụọ ma ọ bụ atọ na Europe, na ndị ọzọ n’Africa, Esia, Latin America, Ndịda Pacific, na Caribbean.
N’oge kwesịrị ekwesị, alaka dị iche iche nke Society ga-agwa ọgbakọ nile nọgasị n’ókèala ha banyere obodo ma ọ bụ obodo dị iche iche a ga-enwe mgbakọ ebe a kpọrọ ha òkù. A ga-enye ihe ọmụma banyere ụbọchị mgbakọ na ndokwa maka ịhọrọ ndị ga-aga. Ndị bu n’uche idejupụta akwụkwọ maka ịhọrọ ndị ga-aga pụrụ ịmalite ichekwa ego ha n’atụmanya nke ihe omume ndị a pụrụ iche.
Ndịàmà Jehova nile gburugburu ụwa pụrụ ilepụ anya n’ihe na-echere anyị ná mgbakọta mba nile ndị a maka 1998. Mgbakọ distrikti nile a ga-enwe ná mba nile ga-enwe otu usoro ihe omume ahụ.