Ndịàmà Na-Anụ Ọkụ N’obi Nke Jehova Na-Azọ Ije!
NDỊÀMÀ Jehova nke narị afọ mbụ bụ ndị na-eji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi rụzuo ọrụ ahụ Jisọs nyere ha, nke bụ: “Gaanụ, . . . mee [ndị nke, NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Matiu 28:19, 20.
Ma olee otú anyị si mara na ndị na-eso ụzọ Kraịst n’oge mbụ ahụ jiri ọrụ ahụ kpọrọ ihe? Leenụ, akwụkwọ Bible bụ Ọrụ Ndị Ozi gosipụtara na ha bụ ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi, ndị na-azọ ije n’ezie!
URU NDỊ A NA-ERITE NA AKỤKỤ YA NDỊ ỌZỌ
Otú Oziọma nke atọ ahụ na akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi si yie onwe ha n’asụsụ na otú e si dee ha gosiri na ọ bụ otu onye dere ha—bụ́ Luk, “dibịa nke a hụrụ n’anya.” (Ndị Kọlọsi 4:14) Nkwurịta okwu nile na ekpere ndị e depụtara n’Ọrụ Ndị Ozi so n’akụkụ ya ndị pụrụ iche. Ihe karịrị 20 pasenti nke akwụkwọ ahụ bụ okwu ihu ọha dị iche iche mejupụtara ya, dị ka ndị Pita na Pọl kwuru iji kwadoo ezi okpukpe ahụ.
E dere akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na Rom n’ihe dị ka afọ 61 O.A. Ọ pụrụ ịbụ ya mere na o kwughị ihe ọ bụla banyere nguzo Pọl guzoro n’ihu Siza, ma ọ bụ mkpagbu nke Nero ji wakwasị ndị Kraịst n’ihe dị ka 64 O.A.—2 Timoti 4:11.
Dị ka Oziọma Luk si dị, ọ bụ Teofilọs ka e degaara akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi. E dere ya iji mee ka okwukwe sie ike ma kọọ akụkọ banyere mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst. (Luk 1:1-4; Ọrụ 1:1, 2) Akwụkwọ ahụ gosipụtara na aka Jehova dịnyeere ndị ozi ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ na-eme ka anyị mara banyere ikike nke mmụọ ya, meekwa ka obi ike anyị nwere n’amụma nke sitere n’aka Chineke siwanye ike. Ọrụ Ndị Ozi na-enyekwara anyị aka ịnagide mkpagbu, na-akwali anyị ịbụ Ndịàmà Jehova na-eji onwe ha achụ àjà, na-ewulitekwa okwukwe anyị n’olileanya nke Alaeze ahụ.
IZI EZI N’ỤZỌ AKỤKỌ IHE MERE EME
Dị ka onye so Pọl na-agagharị, Luk dekọrọ njem ha. O sokwa ndị ji anya ha hụ ihe merenụ kwurịta okwu. Ihe ndị a na nnyocha e leziri anya mee mere ka ihe odide ya bụrụ nke mara oké mma n’ihe banyere izi ezi nke akụkọ ihe mere eme.
Ya mere, onyeọkà mmụta bụ William Ramsay pụrụ ikwu, sị: “Luk bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme n’enweghị atụ: ọ bụghị nanị na a pụrụ ịtụkwasị okwu eziokwu ndị o kwuru obi, o nwekwara ezi echiche nke akụkọ ihe mere eme . . . E kwesịrị ịgụnye onye odeakwụkwọ nke a n’etiti ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme a kasị mara amara.”
PITA—ONYEÀMÀ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI
A pụrụ ịrụ ọrụ ịkpọsa ozi ọma nke Chineke nyere nanị n’ike nke mmụọ nsọ Jehova. Otụ́ a, mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs natara mmụọ nsọ, ha ga-abụ ndịàmà ya na Jerusalem, Judia, na Sameria, “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Na Pentikọst 33 O.A., ha jupụtara ná mmụọ nsọ. Ebe ọ bụ nanị elekere itoolu nke ụtụtụ, ọ bụghị mmanya ka ha ṅụrụ ma ọlị dị ka ụfọdụ ndị chere. Pita gbara àmà na-akpali akpali, e mekwara 3,000 mmadụ baptism. Ndị okpukpe na-emegide ha gbalịrị ikpuchi ndị mkpọsa Alaeze ahụ ọnụ, ma n’azịza nye ekpere ha, Chineke nyere ndịàmà ya ikike iji nkwuwa okwu kwuo okwu ya. Mgbe e yiri ha egwu ọzọ, ha zaghachiri, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke [dị ka onye na-achị anyị, NW] karịa mmadụ.” Ọrụ ahụ gara n’ihu ka ha nọgidere na-ekwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.—1:1-5:42.
Idabere ná mmụọ Jehova na-enyere ndịàmà ya aka ịnagide mkpagbu. Ya mere, mgbe e jisịrị nkume tụgbuo onyeàmà ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ Stifen, a chụsasịrị ndị na-eso ụzọ Jisọs, ma nanị ihe nke a mere bụ ịgbasa okwu ahụ. Filip onye na-ezisa ozi ọma rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ na Sameria. N’ụzọ dị ịtụnanya, a tọghatara onye mkpagbu ahụ na-eme ihe ike bụ Sọl onye Tasọs. Dị ka Pọl onyeozi, ikuku nke mkpagbu kusara ya na Damaskọs ma ọ gbanarịrị atụmatụ ndị Juu mere igbu ya. Ruo nwa mgbe, Pọl sonyeere ndị ozi nọ na Jerusalem ma mesịa gaa n’ihu n’ozi ya.—6:1-9:31.
Aka Jehova dịnyeere ndịàmà ya, dị ka Ọrụ Ndị Ozi gara n’ihu igosi. Pita kpọlitere Dọkas (Tabita) site n’ọnwụ. Ná nzaghachi nye otu òkù a kpọrọ ya, na Sizaria o kwusara ozi ọma nye Kọniliọs, ezinụlọ ya, na ndị enyi ya. E mere ha baptism dị ka ndị Jentaịl mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs. ‘Iri izu asaa’ ahụ si otú a bịa ná ngwụsị ya, na-ewerute anyị na 36 O.A. (Daniel 9:24) Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, Herọd Agrịpa nke Mbụ gburu Jemes onyeozi ma hụkwa na e jidere Pita. Ma mmụọ ozi napụtara onyeozi ahụ site n’ụlọ mkpọrọ, ‘okwu Jehova nọgidekwara na-aga n’ihu ma na-agbasa.’—9:32-12:25.
NJEM ATỌ NKE OZI ALA ỌZỌ PỌL JERE
Ngọzi na-abịara ndị tinyere onwe ha kpam kpam n’ozi Chineke, dị ka Pọl mere. Njem ozi ala ọzọ ya mbụ malitere n’Antiọk, Siria. N’agwaetiti Saịprọs, onye ọchịchị bụ Sajiọs Pọlọs na ọtụtụ ndị ọzọ ghọrọ ndị kwere ekwe. Na Pega nke dị na Pamfilia, Jọn Mak hapụrụ gaa Jerusalem, ma Pọl na Banabas gara n’ihu ruo Antiọk nke Pisidia. Na Listra, ndị Juu kpaliri mkpagbu. Ọ bụ ezie na a tụrụ ya nkume ma hapụ ya na-eche na ọ nwụwo, Pọl nwetaghachiri onwe ya ma nọgide n’ozi ahụ. N’ikpeazụ, ya na Banabas laghachiri Antiọk nke Siria, na-emechi njem nke mbụ ahụ.—13:1-14:28.
Dị ka ihe nọchiri anya ya nke narị afọ mbụ, Òtù Na-achị Isi nke oge a na-eji nduzi nke mmụọ nsọ na-aza ajụjụ nile. Ibi úgwù esoghị ‘n’ihe ndị dị mkpa,’ nke gụnyere ‘ịhapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsi, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko.’ (15:28, 29) Ka Pọl malitere njem ozi ala ọzọ nke abụọ, Saịlas sonyeere ya, e mesịakwa Timoti esonyere ha. E mere ihe ngwa ngwa iji zaghachi n’òkù a kpọrọ ịbanye Masedonia. Na Filipaị, ịgba àmà kpatara ọgba aghara na ịtụ mkpọrọ. Ma e ji ala ọma jijiji tọhapụ Pọl na Saịlas, ha wee kwusaara onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ na ezinụlọ ya ozi ọma, ndị a ghọkwara ndị kwere ekwe e mere baptism.—15:1-16:40.
Ndị ohu Jehova kwesịrị ịbụ ezi ndị mmụta nke Okwu ya, dị ka Pọl na ndị Beria ahụ na-enyocha Akwụkwọ nsọ mere. N’elu Areọpagọs ahụ dị n’Atens, ọ gbara àmà banyere ọbụbụ Jehova bụ onye okike, ụfọdụ ghọkwara ndị kwere ekwe. Ọtụtụ ndị gosiri mmasị na Kọrint nke na ọ nọgidere n’obodo ahụ ruo ọnwa iri na asatọ. Mgbe ọ nọ n’ebe ahụ, o dere akwụkwọ Ndị Tesalọnaịka nke Mbụ na nke Abụọ. Mgbe ya na Saịlas na Timoti kewasịrị, onyeozi ahụ sooro ụgbọ mmiri gaa Efesọs, ma nọgide ná njem gaa Sizaria, wee gaa Jerusalem. Mgbe ọ laghachiri Antiọk nke dị na Siria, njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ gwụsịrị.—17:1-18:22.
Dị ka Pọl gosiri, ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ akụkụ dị mkpa nke ozi ndị Kraịst. Njem nke atọ nke onyeozi ahụ (52-56 O.A.) bụkarịrị ịgaghachi ebe ndị ọ gara na nke abụọ. Ozi Pọl kpaliri mmegide n’Efesọs, bụ́ ebe ọ nọ dee Ndị Kọrint nke Mbụ. E dere Ndị Kọrint nke Abụọ na Macedonia, o degakwaara ndị Rom akwụkwọ mgbe ọ nọ na Kọrint. Na Militọs, Pọl na ndị okenye nke Efesọs zukọrọ, o wee gwa ha okwu banyere otú o si zie ha ihe n’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Njem ozi nke atọ ya gwụsịrị mgbe o rutere Jerusalem.—18:23-21:14.
MKPAGBU ADỊGHỊ ADỊ IRÈ
Mkpagbu adịghị emechi ọnụ ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova. Ya mere mgbe ìgwè ndị na-eme ihe ike biliri megide Pọl n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, o ji nkwuwa okwu gwa ndị ọgba aghara ahụ iwe jupụtara obi okwu. A ghasasịrị atụmatụ e mere iji gbuo ya mgbe e ji onye nche bụ onye agha ziga ya n’ihu Onye ọchịchị bụ Filiks na Sizaria. A hapụrụ Pọl n’agbụ ruo afọ abụọ mgbe Filiks nọ na-eche ka e nye ya ihe iri ngó, bụ́ nke ọ na-enwetaghị. Onye nọchiri ya, bụ́ Festọs nụrụ ka Pọl rịọrọ ka e zigara ya Siza. Otú ọ dị, tupu ọ gawa Rom, onyeozi ahụ kwuru okwu na-akpali akpali iji zọrọ isi onwe ya n’ihu Eze Agripa.—21:15-26:32.
N’agbanyeghị ule nile, ndị ozi Jehova na-anọgide na-eme nkwusa. Nke a dị otú ahụ n’ezie n’ebe Pọl nọ. N’ihi arịrịọ ọ rịọworo ka a kpọgara ya Siza, onyeozi ahụ na Luk malitere njem ịga Rom n’ihe dị ka 58 O.A. Na Mira, nke dị na Lisia, ha gafere n’ụgbọ ọzọ. Ọ bụ ezie na ụgbọ ha kpuru ha kwụsịkwa n’agwaetiti bụ Malta, ụgbọ ọzọ mesịrị bịa buru ha gaa Itali. Ọ bụ ezie na e ji ndị agha na-eche ya nche na Rom, Pọl kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa, o wee kpọsaara ha ozi ọma ahụ. N’oge a tụrụ ya mkpọrọ a, o degaara ndị Efesọs akwụkwọ, ndị Filipaị, ndị Kọlọsi, Faịlimọn, na ndị Hibru.—27:1-28:31.
ỊNỌGIDE NA-AZỌ IJE
Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-egosipụta na ndịàmà nke Jehova na narị afọ mbụ ji ikwesị ntụkwasị obi jiri ọrụ ahụ nke Ọkpara Chineke malitere gaa n’ihu. Ee, site n’ikike nke mmụọ Chineke, ha ji ịnụ ọkụ n’obi gbaa àmà.
N’ihi na ndị na-eso ụzọ Jisọs n’oge mbụ ahụ ji ekpere dabere n’ebe Chineke nọ, aka Ya dịnyeere ha. Ọtụtụ puku mmadụ si otú a ghọọ ndị kwere ekwe, ‘e kwusakwara ozi ọma ahụ nye ihe nile e kere eke n’okpuru eluigwe.’ (Ndị Kọlọsi 1:23) N’ezie, ma mgbe ahụ ma ugbu a, ezi ndị Kraịst egosiwo na ha bụ ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi nke Jehova ndị na-azọ ije!
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 25]
ỌCHIAGHA AHỤ NA-ACHI NARỊ NDỊ AGHA ḄỤ KỌNILIỌS: Kọniliọs bụ ọchịagha, ma ọ bụ onye na-achị otu narị ndị agha. (10:1) Ụgwọ a na-akwụ ọchịagha n’afọ bụ ihe dị ka okpukpu ise nke ihe a na-akwụ ndị agha nkịtị, ma ọ bụ ihe dị ka 1,200 denarii, ma ọ pụrụ ịkarị otú ahụ nke ukwuu. Mgbe ọ lara ezumike nká, a na-enye ya onyinye ego ma ọ bụ ala. Uwe agha ya na-ama mma, site n’okpu e ji ọlaọcha mee ruo uwe úkwù yiri kilt, uwe elu e ji ogho mee, na ihe mkpuchi ụkwụ a chọrọ mma. Ndị ọchịagha na-elekọtakarị 100 ndị ikom, ma mgbe ụfọdụ ha na-abụ ihe dị ka nanị 80. O yikarịrị ka ndị agha e webatara ‘n’òtù Itali’ na-esite n’ụmụ amaala Rom na ndị e mere ka ha nwere onwe ha n’Itali.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 25]
EKPERE N’ELU ỤLỌ: Pita adịghị achọ ime ka o were onwe ya gosi ndị ọzọ mgbe ọ nọ n’elu ụlọ na-ekpe ekpere nanị ya. (10:9) O yikarịrị ka ihe mgbochi dị gburugburu elu ụlọ zopụrụ ya ka ndị mmadụ ghara ịhụ ya anya. (Deuterọnọmi 22:8) Elu ụlọ bụkwa ebe a pụrụ ịtụsara ahụ ma nwere onwe onye pụọ ná mkpọtụ a na-eme n’okporo ámá n’oge uhuruchi.
[Igbe ndị dị na peeji nke 25]
NDỊ E CHERE NA HA BỤ CHI N’ỤDỊ MMAḌỤ: Ọgwụgwọ Pọl gwọrọ onye ngwụrọ mere ka ndị bi na Listra chee na ndị bụ chi egosiwo ha onwe ha dị ka ndị mmadụ. (14:8-18) Jupita, bụ́ chi bụ isi nke ndị Grik, nwere ụlọ nsọ n’obodo ahụ, nwa ya nwoke bụkwa Makuri, bụ nke na-ejere chi nile ozi, ka e ji nkwuwa okwu mara. Ebe ndị ahụ chere na Pọl bụ Makuri n’ihi na ọ butere ụzọ n’ikwu okwu, ha lere Banabas anya dị ka Jupita. Ọ bụ ihe a na-eme n’omenala iji ùkwù okooko osisi dị iche iche ma ọ bụ akwụkwọ osisi cypress ma ọ bụ pine kpube chi ụgha dị iche iche ọkpueze, ma Pọl na Banabas jụrụ ịbụ ndị e mesoro omume ikpere arụsị dị otú ahụ.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 25]
ONYE NLEKỌTA ỤLỌ MKPỌRỌ AHỤ EKWERE: Mgbe ala ọma jijiji meghere ụzọ nile nke ụlọ mkpọrọ ma tọghesịa agbụ nile nke ndị nọ n’ime ya, onye nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ bụ onye Filipaị chọrọ igbu onwe ya. (16:25-27) N’ihi gịnị? N’ihi na iwu ndị Rom kwuru na onye nlekọta ụlọ mkpọrọ ga-ata ahụhụ ndị e nyere onye gbapụrụ agbapụ. O doro anya na onye nlekọta ahụ họọrọ igbu onwe ya kama ịnwụ ọnwụ site n’ahụhụ a ga-enye ya, bụ́ nke na-echere ụfọdụ ndị a tụrụ mkpọrọ ma eleghị anya. Otú ọ dị, ọ nakweere ozi ọma ahụ, e mekwara ‘ya na ndị ya baptism n’egbughị oge.’—16:28-34.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26]
ỊRỊỌ KA A KPỌGARA YA SIZA: Dị ka nwa amaala Rom site n’ọmụmụ, Pọl nwere ikike ịrịọ ka a kpọgara ya Siza ka e wee kpee ya ikpe na Rom. (25:10-12) A gaghị atụ nwa amaala Rom mkpọrọ, pịa ya ụtarị, ma ọ bụ taa ya ahụhụ n’ebughị ụzọ kpee ya ikpe.—16:35-40; 22:22-29; 26:32.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Musei Capitolini, Roma
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26]
ONYE NLEKỌTA ỤLỌ NSỌ ATEMIS: Ebe nkwusa Pọl kpasuru ya iwe, onye ọkpụ ụzụ ọlaọcha bụ Dimitriọs kpaliri ọgba aghara. Onye odeakwụkwọ obodo ahụ chụsasịrị ìgwè mmadụ ahụ. (19:23-41) Ndị ọkpụ ụzụ ọlaọcha na-eji ọlaọcha mee ọgba ndị dị nta nke akụkụ kasị nsọ n’ụlọ nsọ ahụ ebe e nwere ihe ọkpụkpụ nke chi nwanyị ọmụmụ nwa ahụ nwere ọtụtụ ara bụ Atemis. Obodo dị iche iche na-ama ibe ha aka maka onye ga-enwe ihe ùgwù nke ịbụ ne·o·koʹros, ma ọ bụ “odozi ụlọ nso.”
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26]
NSOGBU N’OKÉ OSIMIRI: Mgbe ajọ ifufe ahụ a kpọrọ Yurakwilo kụjasịrị ụgbọ mmiri bu Pọl, ‘ha enweghị ike ijide ụgbọ nta ha bu.’ (27:15, 16) Ụgbọ nta bụ obere ụgbọ nke nnukwu ụgbọ na-adọkpụkarị. Nnukwu ụgbọ mmiri na-ebu oké eriri dị iche iche a pụrụ iji kee gburugburu ala ụgbọ iji jidesie ya ike n’okpuru ha ka a ghara ịkụkpọsị ya mgbe a na-efegharị ákwà ifufe ma e nwee ebili mmiri. (27:17) Ndị a na-anya ụgbọ mmiri tụdara arịlịka anọ ma tọhapụ eriri ndị e ji kegide ụmara, ma ọ bụ ákwà ifufe nke ọnụ ụgbọ mmiri, ndị e ji anyagharị ụgbọ. (27:29, 40) Ụgbọ Aleksandria nwere ihe ịrịba ama bụ “Ụmụ Zeus”—bụ́ Castor na Pollux, ndị e lere anya dị ka ndị nchebe nke ndị ọrụ ụgbọ mmiri. —28:11, NW.