Anyị Kwesịrị Ịbụ Ndị Nkụzi, Ọ Bụghị Nanị Ndị Nkwusa
1 A chọpụtawo na “Ndịàmà Jehova ejiriwo ịgba àmà ha jezuo nnọọ ụwa dum.” Olee otú nke a siworo kwe omume? Ọ bụghị site n’ike mmadụ, kama site na mmụọ Chineke nke na-arụ ọrụ n’isi ndị ohu ya ka ha na-eji ihe dị iche iche arụ ọrụ iji rụzuo ọrụ nkwusa na izi ihe e nyere ha.—Zek. 4:6; Ọrụ 1:8.
2 Akwụkwọ bụ ụzọ dị irè isi rụzuo ọrụ nkwusa anyị. N’afọ ndị gafeworonụ, Ndịàmà Jehova ebiwo ma kesaa ọtụtụ ijeri akwụkwọ, akwụkwọ nta, broshuọ, magazin, na traktị iji nye aka ime ka a nụ ozi ọma Alaeze ahụ. Akụkọ ndị dị na 1997 Yearbook na-egosi na mbipụta akwụkwọ eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị. Ka ọ dị taa, e biwo ihe karịrị nde 91 nke New World Translation. N’ime otu afọ ọnụ ọgụgụ magazin Ụlọ Nche na Teta! e biri na United States ji 7.1 pasent rịa elu. Na Germany, mbipụta magazin ji 35 pasent rịa elu. Ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke magazin e biri n’ebe ahụ bụ maka ubi Russia.
3 Gịnị mere e ji chọọ ọtụtụ akwụkwọ otú a? Gburugburu ụwa, e nwewo nzaghachi dị nnọọ mma nye agbamume e nyere anyị ịgba àmà n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ. Ka ọtụtụ n’ime anyị karị na-agbasapụ ọrụ ịgba àmà anyị—n’ebe ọha mmadụ na-anọ, n’okporo ámá, na n’ókèala azụmahịa—a na-etinye ọtụtụ akwụkwọ karị n’aka ndị na-egosi mmasị. Ọtụtụ n’ime ndị a enwetachabeghị ohere, ma ọ bụrụ na ha enwetụla ma ọlị, ịnụ ozi Alaeze ahụ na mbụ. Iji gboo mkpa a, ọgbakọ na-enwe ụdị akwụkwọ dị iche iche iji mee ihe n’akụkụ nile nke ozi ahụ.
4 Gịnị Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ Anyị n’Ikesa Akwụkwọ? Ihe mgbaru ọsọ anyị abụghị nanị itinye akwụkwọ. Ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nwere akụkụ abụọ—ime nkwusa na ịkụzi ihe. Nke mbụ, anyị nwere ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ, na-eme ka ndị mmadụ mara na ọ bụ ya bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. (Mat. 10:7; 24:14) Akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible bụ ụzọ a nwaleworo na nke dị irè isi na-akpali mmasị ma na-enyefe ndị ọzọ ihe ọmụma banyere Alaeze ahụ.
5 Nke abụọ, ọ bụrụ na anyị ga-eme ndị na-eso ụzọ, anyị aghaghị ịkụzi ihe nile Jisọs nyere n’iwu. (Mat. 11:1; 28:19, 20) Ọzọ, akwụkwọ na-ekere òkè dị mkpa n’anyị ịkụmi eziokwu ahụ n’ime obi ndị a na-amụrụ ihe, na-enyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ.
6 Ndị natara akwụkwọ nwere ike ịbụ ndị ‘na-anụ okwu ahụ,’ ma o siri ike na ha ga-aghọ ndị na-eme ya ma a hapụ nanị ha. (Jes. 1:22-25) Ole na ole ga-emesịa ghọọ ndị na-eso ụzọ ọ gwụla ma ọ dị onye duziri ha ụzọ. (Ọrụ 8:30, 31) Onye nkụzi dị ha mkpa inyere ha aka ịnwapụta n’onwe ha eziokwu a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:2, 3) Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ inyere ha aka inwe ọganihu ruo ná nraranye na baptism na ịzụ ha ịbụ ndị ruru eru nke ọma izi ndị ọzọ ihe.—2 Tim. 2:2.
7 Mkpa Kasị Ukwuu Bụ Inwekwu Ndị Nkụzi: Mgbe anyị na-eme nkwusa, anyị na-akpọsa ozi ọma ahụ n’ihu ọha. Ma, nkụzi na-agụnye izi onye ọzọ ihe nwayọọ nwayọọ. Ọ bụ ezie na ime nkwusa na-eme ka ndị ọzọ mara banyere ozi Alaeze ahụ, ịkụzi ihe na-enyere ndị mmadụ aka ịnakwere ozi ọma ahụ ma jiri ya mee ihe. (Luk 8:15) Onye nkụzi na-eme ihe karịrị ịkpọsa; ọ na-enye nkọwa, na-eji arụmụka dị mma atụgharị uche, na-enye ihe nnwapụta, na-emekwa ka e kwere.
8 Anyị nile dị ka o kwere omume kwesịrị ịbụ ndị nkụzi, ọ bụghị nanị ndị nkwusa. (Hib. 5:12a) Ikesa akwụkwọ bụ akụkụ dị mkpa nke ọrụ anyị, ma imezu nzube nke abụọ nke ozi anyị dabeere kpọmkwem n’ihe anyị na-eme dị ka ndị nkụzi. Ọ bụ ezie na obi pụrụ ịdị anyị ụtọ mgbe anyị tinyere akwụkwọ, iji jezuo ozi anyị nke ọma, anyị ekwesịghị ile ntinye akwụkwọ anya dị ka mgbaru ọsọ ikpeazụ anyị. (2 Tim. 4:5) Ntinye akwụkwọ bụ ụzọ dị irè isi mepee ụzọ maka ohere ịkụziri ndị ọzọ eziokwu.
9 Mee Nletaghachi Iji Malite Ọmụmụ Bible: Ma eleghị anya, anyị nile etinyewo akwụkwọ ụfọdụ, broshuọ, na magazin, na-enwe ndekọ nke nletaghachi. Anyị kwesịrị ime ndokwa oge chiri anya ịdị na-agaghachi iji kpalie mmasị. Nzube anyị bụ isi n’ịlaghachi abụghị nanị itinyekwu akwụkwọ kama ịgba ndị mmadụ ume ịgụ na irite uru site n’ihe ha nwewororị. Ọganihu ime mmụọ hà aṅaa ka anyị onwe anyị gaara enwewo ma e wezụga na ọ dị onye laghachiri ugboro ugboro inyere anyị aka inweta ezi ihe ọmụma?—Jọn 17:3.
10 Sochie mmasị nile n’echiche nke ịmalite ọmụmụ Bible na broshuọ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ abụọ a na-ezi ozi Alaeze ahụ n’ụdị dị mfe nghọta. Broshuọ Na-achọ nwere usoro ọmụmụ ihe zuru ezu, na-atụlezu nkụzi ndị bụ isi nke Bible. Akwụkwọ Ihe Ọmụma na-enyere mmadụ aka ịkụzi eziokwu ahụ n’ụzọ ka saa mbara, ma bụrụ n’ụzọ dị mfe, doo anya, ma dị nkenke.
11 Usoro nkụzi e mere ka ọ ka mfe, dị ka a kọwara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, na-eme ka ọ dị mfe onye nkụzi ahụ izi ihe na ka onye a na-amụrụ ihe mụta. Debe otu ihe ntinye ahụ ebe aka ga-eru ya ngwa ngwa iji tụleghachi ụzọ na usoro izi ihe ndị ahụ dịworo irè. Aro ụfọdụ ọ na-atụ gụnyere ụzọ isi nwee ezigbo mmasị onwe onye n’onye a na-amụrụ ihe, ókè ihe a ga-atụle n’otu nnọkọ, ụzọ isi hụ maka ajụjụ ndị na-emetụtaghị isiokwu a na-amụ, ụzọ ma onye nkụzi ma onye a na-amụrụ ihe pụrụ isi buru ụzọ kwadebe maka ọmụmụ ihe, na ụzọ isi duzie onye a na-amụrụ ihe gaa ná nzukọ Jehova. Site n’ịgbaso aro ndị ahụ, ọtụtụ n’ime anyị karị, gụnyere ndị ka ọhụrụ, ga-enwe ike iduzi ọmụmụ ihe na-aga n’ihu n’ihu.
12 Akụkọ nke Ezi Ihe Ịga nke Ọma Site n’Ubi: Broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma abụwo ihe enyemaka bara uru n’ime ka usoro ime ndị na-eso ụzọ gaa ngwa ngwa. Mgbe ọ natara broshuọ Na-achọ, otu nwanna na Bolivia jiri ya ozugbo malitere otu nwoke ọmụmụ ihe. Ọnwa anọ n’ihu ná mgbakọ distrikti, nwoke a so ná ndị nwere obi ụtọ a ga-eme baptism!
13 A na-akpali ọtụtụ ịrara ndụ ha nye Jehova mgbe ha mụchara akwụkwọ Ihe Ọmụma. N’otu ọgbakọ n’Angola, ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible ndị nkwusa na-eduzi rịrị elu site na 190 ruo 260, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa ọmụmụ ihe mụbakwara okpukpu abụọ site na 180 ruo 360 n’ime nanị ọnwa anọ ka a malitesịrị iji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe n’ógbè ahụ. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ọ dịrị mkpa ihiwe ọgbakọ ọzọ.
14 Mgbe ọ malitesịrị ọmụmụ ihe mbụ ya n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, otu nwanna kwuru na iduzi ya “dị mfe ma ọ bụrụ na onye nduzi ya na-ajụ nanị ajụjụ, gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ dabara adaba, ma hụ na onye ahụ a na-amụrụ ihe ghọtara.” Ọ bụ ezie na ọ nọwo na-eche na nanị ndị nkwusa ruru nnọọ eru pụrụ iduzi ọmụmụ Bible na-aga n’ihu n’ihu nakwa na ya apụghị imeli ya ma ọlị, ọ chọpụtara na ya pụrụ, na-asị: “Ọ bụrụ na m pụrụ ime ya, onye ọ bụla pụrụ.”
15 Ọ bụ site n’iduzi ọmụmụ Bible dị ka otu akụkụ nke ozi anyị ka anyị si emezu nzube anyị nke ime ndị na-eso ụzọ. Ndị wuliteworo ikike ikere òkè n’akụkụ a nke ozi ahụ na-ahụ na ọ na-eju afọ n’ezie ma na-enye ụgwọ ọrụ bara ụba. Ka e kwuo banyere anyị na anyị ‘na-ekwusakwa alaeze Chineke, na-ewerekwa nkwuwa okwu nile zie ihe nile banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.’—Ọrụ 28:31.