Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/05 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite January 10
  • Izu Na-amalite January 17
  • Izu Na-amalite January 24
  • Izu Na-amalite January 31
  • Izu Na-amalite February 7
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 1/05 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite January 10

Abụ nke 223

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa January. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke January 15 na Teta! nke February 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke February 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’otu ihe ngosi, gosi otú a pụrụ isi nyefee magazin n’aka onye ikwu na-abụghị Onyeàmà.

15 min: “Ndị E Ji Okwu Okwukwe Zụọ.”a Ruo ókè oge kwere mee, gụọ ma kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

20 min: “Nwalee Ụzọ Ndị Dị Mfe Isi Na-enyefe Akwụkwọ.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere na peeji nke 5 nke ihe ntinye. Mee ihe ngosi abụọ nke ụzọ a pụrụ isi jiri aro ndị a tụrụ ebe ahụ nyefee akwụkwọ e ji eje ozi n’ọnwa a. N’ihe ngosi nke ọ bụla, mee ka onye nkwusa gụọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ihe onye nwe ụlọ sị na ọ na-enye ya nsogbu n’obi.

Abụ nke 143 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 17

Abụ nke 34

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Ndị Ntorobịa—Ùnu Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ? Okwu okenye ga-ekwu bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke April 1, 2003, peeji nke 8-10. Kwuo ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ ezi uche dị na ha a pụrụ iru eru, gbaakwa ndị ntorobịa ume isetịpụrụ onwe ha ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị doro anya.

20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 5.”b Gụnye ihe ngosi nke ebe onye nkwusa nwere ahụmahụ so onye nkwusa na-enwechaghị ahụmahụ na-ekwurịta ụzọ a pụrụ isi zere nsogbu ndị e kwuru banyere ha na paragraf nke 4-5.

Abụ nke 78 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 24

Abụ nke 163

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu.

25 min: “Ụzọ A Ga-esi Na-eji Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Na-ezi Ozi Ọma Eme Ihe.”c Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Kwuo na, na peeji nke 3-4 n’ihe ntinye nke ọnwa a, e depụtara ụzọ ndị a ga-esi nyefee ndị mmadụ akwụkwọ anyị. Chekwaa ihe ntinye a maka iji ya mee ihe n’afọ a dum. Mgbe a tụlesịrị isiokwu ahụ, tụlee otú anyị pụrụ isi nyefee akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso n’ọnwa February. Mee ihe ngosi abụọ. Ha pụrụ ịdabere n’ụzọ ndị a tụrụ aro ha isi nyefee akwụkwọ bụ́ ndị dị na peeji nke 3 ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ ga-adaba adaba n’ókèala unu.

Abụ nke 200 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 31

Abụ nke 157

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa January. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ a ga-esi nyefee Ụlọ Nche nke February 1 ma ọ bụ Teta! nke February 8. Ọ bụrụ na ọ bụ Teta! nke February 8 ka a na-enyefe, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe.

15 min: “Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi.” Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Ruo ókè oge kwere mee, gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa ha.

20 min: Ị̀ Na-enyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị? Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’okwu mmalite nke Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2005. Kwuo mkpa ọ dị mmadụ nile ịhụ na ha na-ewepụta minit ole na ole kwa ụbọchị iji mee ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kọọ usoro ha na-agbaso n’ime ihe mmụta dịịrị ụbọchị na otú ha siworo rite uru na ya. Mechie site n’ịtụle, n’ụzọ dị mkpirikpi, isiokwu dịịrị afọ 2005.

Abụ nke 184 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 7

Abụ nke 97

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Nyere Ndị Ọhụrụ Aka Ịmụta Ịhụ Chineke na Ndị Agbata Obi Ha n’Anya. Okwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke July 1, 2004, peeji nke 16, paragraf nke 7-9. Ihe a ga-eme ka ọ pụta ìhè bụ otú onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ si ekere òkè n’inyere ndị ọhụrụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.

20 min: Jehova Adịghị Egbochi Ezi Ihe. (Ọma 84:11) Gbaa ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ole na ole ajụjụ ọnụ bụ́ ndị nọgideworo na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọnwụnwa. Olee ihe isi ike ndị ha nwetaworo? Gịnị nyewooro ha aka ịnagide ya? Olee ọṅụ na ngọzi ndị ha nwetaworo?

Abụ nke 104 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya