Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite March 14
Abụ nke 132
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa March. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke March 15 na Teta! nke April 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke April 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe a na-eme nletaghachi na nke onye a na-ewegara magazin kwa ọnwa. Ná ngwụsị nke ihe ngosi ahụ, jiri ihe dị n’azụ Ụlọ Nche nke March 15 chetara onye nwe ụlọ banyere Ememe Ncheta ahụ na-abịanụ.
20 min: “Ilekwasịkwu Anya na Bible!”a
17 min: “Mkpọsa Pụrụ Iche Iji Kesaa Broshuọ Ọhụrụ.”b Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Mee ka e mee ihe ngosi nke ụzọ ndị a tụrụ aro ha isi nyefee ya. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, onye nwe ụlọ egosichaghị mmasị n’okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ a gwara ya, e nyezie ya traktị kama inye ya broshuọ ahụ.
Abụ nke 69 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 21
Abụ nke 140
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 7.”c Mgbe ị na-akwadebe isiokwu a, lee ihe dị n’Ụlọ Nche nke July 15, 2002, peeji nke 27, paragraf nke 5-6.
20 min: Gịnị Bụ Amagedọn? Mgbe e kwusịrị okwu mmeghe nke na-agaghị eru otu minit, duzie ntụle nke ajụjụ na azịza bụ́ nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke May 15, 1990, peeji nke 3 ruo 7. Gwa ndị na-ege ntị ka ha zaa ajụjụ ndị ahụ e ji mere isiokwu nta, na-eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e hotara ehota na ndị nke e zoro aka na ha na-eme ihe. Kwurịtanụ otú anyị pụrụ isi jiri ihe ọmụma a mee ihe n’ozi ubi.
Abụ nke 109 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 28
Abụ nke 144
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa March. Gbaa mmadụ nile ume ịkpọ ndị nwere mmasị òkù ka ha bịa gee okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu n’April 10. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa April na May.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Tụleghachi aro a tụrụ banyere ụzọ a ga-esi na-enyefekwu magazin, bụ́ nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke February 2005, peeji nke 8. Tụlee isiokwu ndị na-akpali mmasị na magazin ndị ọhụrụ. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 1 na Teta! nke April 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke April 8, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, kọwaa otú e si eji ego akwado ọrụ zuru ụwa ọnụ anyị na-arụ.—Lee Ụlọ Nche, p. 2, ma ọ bụ Teta! p. 5.
Abụ nke 116 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 4
Abụ nke 119
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: Nweenụ Ịhụnanya n’Etiti Onwe Unu. (Jọn 13:35) Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke February 1, 2003, peeji nke 15-18, paragraf nke 10-21. Gbalịa ịmalitere ndị mụworo akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ ọmụmụ Bible. Kwuo otú ndị nkwusa pụrụ isi soro ndị okenye rụkọọ ọrụ n’inyere ndị na-adịghị ike aka.
20 min: Ahụmahụ ndị e nwetara n’ókèala ọgbakọ unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara site n’ịgaghachi na nke ndị ha nyefere Nọrọ na Nche! Mee ndokwa tupu oge eruo ka e mee ihe ngosi nke ahụmahụ ndị dị ịrịba ama e nwetara. Jaa mmadụ nile mma maka otú ha si kwadoo mkpọsa ahụ pụrụ iche.
Abụ nke 137 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.