Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/05 p. 1
  • Ilekwasịkwu Anya na Bible!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ilekwasịkwu Anya na Bible!
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nye Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
    Teta!—2006
  • Ụlọ Nche na Teta!—Akwụkwọ Eziokwu Ndị Na-abịa n’Oge Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Nyefee Magazin Ndị Na-agbara Eziokwu Àmà
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 3/05 p. 1

Ilekwasịkwu Anya na Bible!

1. Na mbụ, olee ndị e bu n’uche na-ebipụta Ụlọ Nche, oleekwa ndị e bu n’uche na-ebipụta The Golden Age?

1 N’October 1, 1919, e bipụtara mbipụta mbụ nke magazin bụ́ The Golden Age (Ọgbọ Dị Ebube). Ọ bịara bụrụ akwụkwọ kasị baa uru n’ọrụ nkwusa. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ọha na eze ka e bu nnọọ n’uche na-ebipụta ya. Ọ bụghị otú ahụ ka Ụlọ Nche dị, bụ́ nke e weere, ruo ọtụtụ afọ, dị ka magazin a na-ebipụta nnọọ maka “ìgwè atụrụ nta” ahụ. (Luk 12:32) Ndị nkwusa Alaeze ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata akwụkwọ ọhụrụ a nke na, ruo ọtụtụ afọ, a ka kesaa magazin The Golden Age karịa Ụlọ Nche.

2. Olee ihe bụ́ aha magazin The Golden Age taa, oleekwa nzube e jiworo na-ebipụta ya site ná mmalite?

2 E bipụtara magazin The Golden Age iji gosi ndị mmadụ na ihe ga-agwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie bụ Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst, bụ́ nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ọgbọ dị ebube n’ezie. N’afọ ndị sochirinụ, e mere ọtụtụ mgbanwe na magazin The Golden Age iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe e nwere. N’afọ 1937, a gbanwere aha ya ịbụ Consolation (Nkasi Obi). N’afọ 1946, a gbanwere ya ịbụ Teta!, nke bụ́ aha anyị ji mara ya taa.

3. Olee amụma Teta! kerewooro òkè dị ukwuu n’ịhụ na e mezuru?

3 Site ná mmalite, magazin a enyewo aka nke ukwuu ná nnukwu ọrụ ịgba àmà a nọworo na-arụ kemgbe afọ 1919. (Mat. 24:14) Otú ọ dị, n’ihi otú oge anyị a si bụrụ oge chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa na ya, o yiri ihe amamihe dị na ya ịgbanwekwu ihe na Teta!

4. (a) Gịnị ka ọ dị mkpa ka mmadụ mee iji bụrụ onye a ga-ezobe “n’ụbọchị iwe Jehova”? (b) Dị ka Mkpughe 14:6, 7 si kwuo, gịnị ka ‘mmụọ ozi ahụ na-efegharị n’etiti eluigwe’ na-agwa mmadụ nile ka ha mee?

4 Ọtụtụ nde mmadụ na-enwe mmasị ịgụ Teta! n’ihi na ọ na-atụle isiokwu dị iche iche na-agbasaghị okpukpe, ọ na-emekwa ya n’ụzọ na-akpali mmasị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-abịa Ememe Ncheta kwa afọ na-agụchi Teta! anya. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla ga-atụ anya ịbụ onye a ga-ezobe “n’ụbọchị iwe Jehova,” ọ ga-achọ ka e nyere ya aka ime ihe karịrị ịgụchi akwụkwọ anyị anya.—Zef. 2:3; Mkpu. 14:6, 7.

5. (a) Malite na Teta! nke January 2006, gịnị ka Teta! ga-aka na-ekwu banyere ya? (b) Gịnị ka a pụrụ ịkpali ọtụtụ ndị ime, oleekwa amụma nke a ga-emezu?

5 N’ihi ya, malite na January 2006, Teta! ga na-elekwasịkwu anya n’Alaeze Chineke. Ọ ga-agba ndị na-agụ ya ume n’ezoghị nnọọ ọnụ ilega anya na Bible maka ihe ngwọta nke nsogbu ha. Ọ ga-emekwa ka nkọwa Bible na-enye banyere ihe ndị na-eme n’oge a pụtakwuo ìhè karị. N’ụzọ dị otú a, ndị na-agụ ya ga-aka aghọta ihe ndị na-eme n’oge a, ma eleghịkwa anya, bụrụ ndị ihe ha gụtara ga-akpali ịmụtakwu banyere Jehova.—Zek. 8:23.

6, 7. (a) Olee otú Teta! ga-esi lekwasị anya n’inyere ọtụtụ mmadụ aka itinye 1 Ndị Tesalonaịka 2:13 n’ọrụ? (b) Ugboro ole ka a ga na-ebipụta Teta!, asụsụ ole ka mgbanwe a ga-emetụta?

6 Teta! ka ga-anọgide na-atụle isiokwu ndị ọha mmadụ na-enwe mmasị na ha. Otú ọ dị, ọ ga-aka elekwasị anya na Bible. (1 Tesa. 2:13) Ebe ọ bụ na Ụlọ Nche na-atụle ihe ọmụma ndị siri ike sitere na Bible, ihe Teta! ga-aka na-atụle abịakwa bụrụ ihe ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ, o yighị ka ọ̀ dị mkpa ịnọgide na-ebipụta Teta! ugboro abụọ n’ọnwa n’asụsụ ọ bụla. N’ihi ya, malite ná mbipụta ya nke January 2006, a gazi na-ebipụta Teta! otu ugbo n’ọnwa n’asụsụ nile. Nke a ga-eme ka ihe dị nnọọ mfe n’ịkwadebe, n’ịsụgharị, nakwa n’ibupụ magazin anyị.

7 Mgbanwe a ga-emetụta ihe dị ka pasent iri anọ nke asụsụ ndị a na-ebipụta Teta! na ha. N’ihe ka ọtụtụ n’asụsụ ndị a na-ebipụta Teta!, a dịla mbụ na-ebipụta ya otu ugboro n’ọnwa ma ọ bụ ugboro anọ n’afọ. A gaghị eme mgbanwe ọ bụla n’Ụlọ Nche.

8. Olee otú ndị nkwusa pụrụ isi jiri Teta! na Ụlọ Nche na-eme ihe?

8 Ndị nkwusa pụrụ inyefekọta Teta! nke ọnwa ọ bụla na nke ọ bụla n’ime Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’ọnwa ahụ. Ndị na-enyefe Teta! pụrụ inyefe otu mbipụta n’ọnwa ahụ dum n’agbanweghị ụzọ ha si enyefe ya ma ọnwa gaa ọkara, dị ka a na-eme ugbu a.

9. Olee ọrụ Teta! ga-anọgide na-arụ?

9 Kemgbe a malitere ibipụta ya laa azụ n’afọ 1919, magazin a a magasịịrị dị ka The Golden Age, Consolation, na Teta! ugbu a, ekerewo òkè dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ahụ. Ekpere anyị bụ, n’agbanyeghị mgbanwe a a ga-eme na magazin a, ka Jehova nọgide na-agọzi nkesa ya ma nyere ọtụtụ ndị si “ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta” aka ilekwasị anya n’Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya ha nwere.—Mkpu. 7:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya