Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/06 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na May 8
  • Izu Na-amalite na May 15
  • Izu Na-amalite na May 22
  • Izu Na-amalite na May 29
  • Izu Na-amalite na June 5
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 5/06 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na May 8

Abụ nke 2

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche May 15 na Teta! April-June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa weere Ụlọ Nche May 1 na nke May 15 nakwa Teta! April-June wegara onye ọ na-ewegara magazin mgbe nile nke na-enwetabeghị Ụlọ Nche May 1. Mgbe a na-enyefe magazin atọ ahụ, ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. Ndị nkwusa nwere ike ịga na nke ndị ha na-ewegara magazin mgbe nile otu ugbo ma ọ bụ ugbo abụọ n’ọnwa.

Minit 12: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Iji Amara Emeso Ha Ihe.”a

Minit 23: “Zere Ime Ihe Otú Ndị Ụwa Si Eme Ya.”b Ọ bụ okenye ruru eru ga-eme ya. Gụpụta paragraf nile.

Abụ nke 91 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na May 15

Abụ nke 9

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa May. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Noah—He Walked With God iji kwadebe maka Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe n’izu nke May 29.

Minit 10: Ịrụkọ Ọrụ n’Ịdị n’Otu n’Okpuru Nduzi Kraịst. Okwu ndị na-ege ntị na-agaghị etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’isiokwu nta bụ́ “Ihe Ịnakwere Ọkwá Ọrụ Ya Pụtara,” nke dị na peeji nke 13-15 nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.

Minit 25: “Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze—Akụkụ Dị Mkpa nke Ozi Dị Nsọ.”c Gbaa ụfọdụ n’ime ndị sonyerela n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ịrụzigharị ya ajụjụ ọnụ.

Abụ nke 133 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na May 22

Abụ nke 86

Minit 12: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche June 1 na Teta! April-June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. Ihe a ga-eme n’ihe ngosi abụọ ahụ ga-abụ ebe ezinụlọ na-amụgharị otú ha ga-esi enyefe magazin ndị ahụ n’ozi ubi.

Minit 15: ‘Nọgide Na-eso M.’d Gbaa otu onye nkwusa na-esetịpụ ezi ihe nlereanya ajụjụ ọnụ n’ụzọ dị nkenke. Ọ ga-abụ onye na-agbasi mbọ ike ibi ndụ dị mfe na ibelata oge ọ na-etinye n’ịchụso ihe nke onwe ya iji nwee ike ijere ndị ọzọ ozi na ime ka ihe ndị metụtara Alaeze gaa n’ihu. Mee ka ngọzi ndị ọ na-enweta n’ime nke a pụta ìhè.

Minit 18: Ọdịdị Onwe Onye Dị Mma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 131-133. Tụlee ụkpụrụ ise ahụ e depụtara bụ́ ndị metụtara uwe na ejiji anyị. Kwuo na anyị pụrụ iji akọ jiri isiokwu a nyere ndị anyị na-amụrụ Bible aka ịghọta otú ha kwesịrị isi na-eji ejiji dị mma ma ha bịawa nzukọ ọgbakọ.

Abụ nke 215 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na May 29

Abụ nke 42

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa May.

Minit 10: Nyefee akwụkwọ Onye Ozizi na June. Jiri aro ndị dị na peeji nke 3-4 nke Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ọma ndị sirila n’iji akwụkwọ ahụ mee ihe n’ozi ubi ma ọ bụ n’ezinụlọ ha pụta.

Minit 25: “Onye Ndị Nọ n’Afọ Ndụ Nile Kwesịrị Iṅomi.” I kwusịa okwu mmeghe nke na-agaghị eru otu minit, malite jụwa ndị na-ege ntị ajụjụ ndị ahụ dabeere na vidio bụ́ Noah. Jụọ ajụjụ nile e depụtara n’isiokwu ahụ. Ma ọ bụkwanụ, kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Ị̀ Na-ele Ndị na-eme Ihe Ike Anya Dị Ka Chineke Si Ele Ha?” bụ́ nke dị n’Ụlọ Nche nke April 15, 2000, peeji nke 26-29.

Abụ nke 9 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na June 5

Abụ nke 176

Minit 5: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Minit 15: Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ime Nletaghachi. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’igbe dị na peeji nke 16 nke Ụlọ Nche November 15, 2003. Tụlee nke ọ bụla n’ime aro asaa ndị a tụrụ ebe ahụ, ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ n’ókèala unu. Gbaa ndị nkwusa ume ka ha na-eburu ịmalite ọmụmụ Bible n’uche mgbe ha na-aga nletaghachi na nke ndị nile natara akwụkwọ ma ọ bụ ndị gosiri mmasị. Jiri otu n’ime aro ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị nke March 2006, peeji nke 6, mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi malite ọmụmụ Bible mgbe a gara nletaghachi.

Minit 25: “Jụ Omenala Ndị Ụwa Mgbe A Na-eli Ozu.”e Ọ bụ okenye ruru eru ga-eme ya. Gụpụta paragraf nile.

Abụ nke 57 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya