Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/06 p. 5-6
  • Jụ Omenala Ndị Ụwa Mgbe A Na-eli Ozu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jụ Omenala Ndị Ụwa Mgbe A Na-eli Ozu
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 5/06 p. 5-6

Jụ Omenala Ndị Ụwa Mgbe A Na-eli Ozu

1 Onye na-achị ụwa a, bụ́ Setan, na-emegide okwukwe anyị. N’ihi ya, ọ nọgidela na-agbasi mbọ ike ịhụ na anyị mere ihe n’ụzọ megidere ụkpụrụ Bible. Anyị aghaghị iguzogidesi ya ike mgbe nile iji zere ịbụ akụkụ nke ụwa a nke dị n’aka ya, bụ́kwa nke a ga-ebibi kpamkpam n’oge na-adịghị anya.—Jems 4:7; 1 Jọn 2:15-17.

2 Otu ebe ọ dị nnọọ mkpa ka a mụrụ anya na ya bụ n’ihe metụtara olili ozu. Anyị aghaghị ịjụ nnọọ omenala olili ozu nile dabeere na nkwenkwe okpukpe ụgha, ofufe ndị mmụọ ọjọọ, na omume ndị ụwa, otú ọ sọkwara ya siri yie ihe a ma ama na ihe e ji mara obodo anyị. Dị ka ọ dị n’ihe ndị ọzọ, mgbe a na-eli ozu, ihe kwesịrị ịdị anyị n’obi bụ ịghara ime ihe ọ bụla ga-emetọ ofufe dị ọcha, mebie akọ na uche anyị e ji Bible zụọ, mebie akọ na uche nke ndị ọzọ, ma ọ bụ wetara aha Jehova nkọcha. Ọ ka mma na a kparịrị anyị, kwaa anyị emo, megide nakwa ọbụna kpagbuo anyị n’ihi nguzo anyị guzosiri ike n’ihe anyị kweere, karịa itinye aka n’omenala olili ozu ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị iji mee ka ndị ikwu anyị na ndị enyi anyị na-ekweghị ekwe ghara iwesa anyị iwe.

3 Ihe A Na-enye Ndị Bịara Mgbaru: Ihe ndị a bụ ihe ndị a na-enye ka ha bụrụ ihe ncheta. È kwesịrị inye ihe ndị dị otú ahụ n’onyinye n’oge a na-eli ozu? Ihe mere e ji aga ebe mmadụ nwụrụ bụ iji kasie ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ obi. Ihe ga-akpali mmadụ ịga ebe ahụ kwesịrị ịbụ ezigbo ịhụnanya na nchegbu o nwere maka ezinụlọ ahụ mmadụ nwụnahụrụ, ọ bụghị ọchịchọ onwe onye nanị o nwere ịnata onyinye ma ọ bụ nke inye ndị bịara mgbaru onyinye. N’ihi ya, e kwesịghị ịtụ anya na ndị mmadụ nwụnahụrụ ga-enye ndị bịaara ha mgbaru onyinye. Ọbụna mgbe ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ bara ọgaranya ruo n’ókè nke inwe ike iji ọchịchọ obi ha nye onyinye dị otú ahụ, ha kwesịrị icheta na oge a na-eli ozu bụ oge iru újú na nke ntụgharị uche, ọ bụghị oge oriri na nkwari, ma ọ bụkwanụ oge mmadụ ji egosi ihe ndị o nwere dị ka site n’ikesara ndị mmadụ onyinye, bụ́ ndị na-ebukarị aha ndị nyere onyinye ahụ. (Ekli. 7:2; 1 Jọn 2:16) Ihe ndị bịara mgbaru bịara abụghị ịnata onyinye. Ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya Ndị Kraịst, anyị ga-aghọta na ọ bụ ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ ka ọ pụrụ ịdị mkpa ka e nyere aka kwụọ ihe ndị e mefuru n’olili ozu ahụ.—Jems 1:27.

4 Ọ bụ ya mere isiokwu ahụ bụ́ “Ili Ozu n’Ụzọ Ndị Kraịst—Akụkụ nke 4,” bụ́ nke e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke February 1994, peeji nke 3, ji kwuo, sị: “Ndị mmadụ n’otu n’otu ndị chọrọ inye onye mmadụ nwụnahụrụ enyemaka ego pụrụ ime nke ahụ na nzuzo. Nzube nke onyinye ndị dị otú ahụ e mere na nzuzo abụghị iji nye ndị ikwu na ndị ọbịa, bụ́ ndị na-adịghị echebara ndị ọzọ echiche nri na mmanya, kama iji dochie ego igbe ozu na mmefu ndị ọzọ dị mkpa.” N’ihi ya, anyị na-agba ume ka a kwụsị inye ndị bịara mgbaru onyinye n’ihi na omume a enweghị ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ na Bible, ọ dịghịkwa ezigbo uru ọ na-abara ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka e towe ndị mmadụ, na-emekwa ka omume ndị ụwa na-abata n’olili ozu Ndị Kraịst.—Rom 12:2.

5 Ito Onye Nwụrụ Anwụ: Mgbe a na-eli ozu, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịkasi ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ obi. (2 Kọr. 1:3-5) Ọ dịghị ndokwa ọ bụla e mere ka onye ọ bụla ọzọ gụọ ma ọ bụ kwuo ihe ọ bụla banyere onye ahụ nwụrụ anwụ tupu e kwuwe okwu olili ozu ma ọ bụ mgbe e kwusịrị ya. Onye ga-ekwu okwu olili ozu ekwesịghị ikwu ma ọ bụ mee ihe ọ bụla iji too onye ahụ nwụrụ anwụ. Kama ime ka ihe omume ahụ ghọọ oge ọtụtụ mmadụ ga-eji pụta kwuwe okwu otuto (okwu ịja mma) maka onye ahụ nwụrụ anwụ, oge olili ozu bụ oge magburu onwe ya iji too àgwà ọma Chineke, tinyere obiọma o gosiri anyị site n’ime ka anyị nwee olileanya nke mbilite n’ọnwụ. Onye na-ekwu okwu olili ozu kwesịrị ịgbasochi ihe ndepụta e nyere ya anya, dịkwa ka e nyere ntụziaka na ya, o kwesịrị iji ụzọ akọ kwuo ụfọdụ àgwà ọma e ji mara onye ahụ nwụrụnụ. Ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụnụ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo ọnwụ ya, ọ ga-adị mma ịtụgharị uche n’ụzọ o si guzosie ike n’ezi ihe. (Hib. 6:12) Ikwurịta ihe ndị a dị mma n’oge a na-eli ozu na-akasi ndị dị ndụ obi ma na-eme ka e nwee ezigbo ihe a ga-eji na-echeta onye ahụ nwụrụ anwụ.

6 Iri Oriri n’Oge A Na-eli Ozu: Bible gosiri n’ụzọ doro anya na e nwere ọdịiche dị n’etiti “mgbe ịkwa ákwá, na mgbe ịchị ọchị; mgbe iru újú, na mgbe ite egwú.” (Ekli. 3:4) N’Eklisiastis 7:2, e gosiri nnọọ ọdịiche dị n’etiti ‘ụlọ oruru újú’ na ‘ụlọ ọṅụṅụ mmanya vaịn.’ Ihe a na-eme n’ebe a na-eli ozu kwesịrị ịdị nnọọ iche n’ihe a na-eme n’ebe a na-agba akwụkwọ. O doro anya na oge Ndị Kraịst na-eli ozu abụghị oge ememe, iri ihe, ịṅụ mmanya, na ịkpọ egwú na-ada oké ụda.

7 Ya mere, ọ bụrụgodị na e siri nri n’oge a na-eli ozu, e kwesịrị ile ya anya dị ka ihe ezinụlọ ahụ mmadụ nwụnahụrụ mere iji lee ndị mmadụ ọbịa, nke ka nke ndị si ebe dị anya bịara ha mgbaru, bụ́ ndị ọ pụrụ isiri ike imere onwe ha ndokwa maka nri n’ihi amaghị ala. (Tụlee Matiu 15:32.) N’ihi ya, ndị bi n’obodo ndị dị nso ekwesịghị ikwe ka e nye ha nri iji ghara ịtụkwasị ihe n’ego ezinụlọ ahụ mmadụ nwụnahụrụ ga-emefu. Kama nke ahụ, ịhụnanya kwesịdịrị ime ka ha wepụta ebe obibi ha ka ndị si ebe dị anya bịa mgbaru nwee ike ihi na nke ha. Nke a ga-abụkwa àmà nye ndị na-abụghị Ndịàmà bụ́ ndị na-eri ihe, na-aṅụ mmanya, ma na-agba egwú n’oge ha na-eli ozu. (Ekli. 3:4, 8) Ya mere, mgbe ị na-aga olili ozu, buru n’uche ndụmọdụ a e nyere n’Ụlọ Nche nke December 1, 1978, peeji nke 7 nke kwuru na “ndi nile biara nleta ahu kwesiri ichọ igosi ọmiko n’ighara iji ọchichọ onwe-nani neme ihe n’uzọ nke gatukwasi ihe ná nmefu-ego nile nke ezi-na-ulo ahu nọri neme, n’ikwadebe maka ememe-ili-ozu ahu. Kama nke ahu, ọ gabu ihe di nma nye ha iweputa onwe-ha iyere ezi-na-ulo ahu aka ilu ọlu nile nke ezi-na-ulo, ma-ọbu ije ozi nile ọzọ.”

8 Ịmụ Anya Abalị na Akwamozu nke Abụọ: Omenala nke ịmụ anya, nọrọ na-ele ma ọ bụ na-eche ozu nche n’abalị dum, a nọrọkwa na-eri ihe, na-aṅụ mmanya, na-abụ abụ, ma na-akpọ egwú, bụ na nkwenkwe ụgha ka ọ dabeere. Ihe e jikarị eme ya bụ iji chụọ ndị ajọ mmụọ na iji hụ na mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ enweghị nsogbu n’ịgafe ná ndụ ọzọ. Biko ghọtanụ na ime ndokwa maka ịmụ anya abalị na ịga ebe a na-amụ anya abalị megidere ụkpụrụ Ndị Kraịst. N’ihi ya, ọ dịghị Onye Kraịst kwesịrị ime ndokwa maka ịmụ anya abalị ma ọ bụ ịga ịmụ anya abalị, ọ sọkwa ya ya bụrụ ịmụ anya n’abalị ahụ dum ma ọ bụ ịmụ anya ruo etiti abalị. Nke a metụtakwara akwamozu nke abụọ bụ́ nke ndị na-eme ya kwuru na “a na-emekarị iji nyere onye ahụ nwụrụ anwụ aka ịkwadebe ndụ ‘n’ụwa ọzọ,’ na iji rịọ maka enyemaka na nchebe n’isi onye ahụ nwụrụ anwụ.” Setan—nna ụgha—bụ isi sekpụ ntị na-akwalite omenala abụọ a, bụ́ ndị dabeere na nkwenkwe ụgha bụ́ na ọ dị ihe a na-akpọ mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ nke na-adịghị anwụ ma ahụ́ nwụọ. (Jen. 2:7; Ezik. 18:4, 20a; Ọma 22:29; Jọn 8:44) Ya mere, onye ọ bụla nke na-aga ịmụ anya abalị, nke na-eme akwamozu nke abụọ, ma ọ bụ nke na-ekere òkè na ha n’ụzọ ọ bụla, na-efe onye nwụrụ anwụ ofufe. Ọ bụ ezie na nanị ikiri ozu enyi ma ọ bụ onye ikwu anyị anyị hụrụ n’anya adịghị njọ ma ọ bụrụ na mmadụ achọọ ime otú ahụ, anyị kwesịrị izere ịdọba ozu ebe ndị bịara mgbaru ga-abịa kiriwe ya ma mewere ya ihe ụfọdụ iji gosi na ha na-akwanyere ya nnọọ ùgwù.

9 Ihe Ndị Ọzọ: Omenala ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, bụ́ ndị a na-eme iji sọpụrụ onye nwụrụ anwụ na ndị a na-eme n’ihi egwu a na-atụ ndị nwụrụ anwụ, bụ́kwanụ ndị Ndịàmà na-ekwesịtụghị ikere òkè na ya, na-agụnye: ime ngagharị n’ihi onye nwụrụ anwụ bụ́ nke a na-eme n’ụbọchị nke asatọ, nke iri na ise, ma ọ bụ nke iri anọ onye ahụ nwụsịrị; ịkpụ isi; ibe mbọ aka n’ụzọ pụrụ iche; iyinye ákà n’akụkụ ahụ́ ụfọdụ; mmadụ igbu egbugbu n’ahụ́ ya; na ịkwanyere onye ahụ nwụrụ anwụ ùgwù site n’iburu ozu ya banye n’ụlọ dị iche iche nakwa ‘n’ebe ndị dị mkpa,’ tupu e lie ya. (Lev. 19:28; Rom 1:21-25) Ọzọkwa, ihe mere e ji eyi ụdị uwe ụfọdụ mgbe a na-eli ozu n’ebe dị iche iche na Nigeria bụ iji sọpụrụ onye ahụ nwụrụnụ nakwa n’ihi ụjọ a na-atụ ndị nwụrụ anwụ. N’ebe ụfọdụ na Nigeria, ndị ikwu, eze obodo, ma ọ bụ ndị obodo na-ekwu na a ga-enye ha ehi ma ọ bụ ewu, ọkụkọ, mmanya, na ji. Ha na-eke anụ ndị ahụ rie. Ma tupu ha eriwe anụ ndị ahụ, ha pụrụ ịwụsa ọbara ha n’ala, dịkwa ka a na-eme ná mmanya. Ihe mere ha ji awụsa ọbara ahụ n’ala bụ iji mee ka obi jụrụ mmụọ nke ndị nna nna ha nwụrụla anwụ. Ndị ohu Jehova bụ́ ndị eziokwu nke Okwu Chineke merela ka ha nwere onwe ha pụọ n’ozizi ụgha, nkwenkwe ụgha, na omenala ụgha hà kwesịrị iso na-eme ihe ndị a? Malakaị 3:18 mere ka ọ pụta ìhè na ezi ndị ohu Jehova kwesịrị ịdị iche n’ebe ndị ụwa nọ. Ọzọkwa, na 1 Jọn 5:21, a dọsiri anyị aka ná ntị ike ‘iche onwe anyị nche pụọ n’arụsị.’

10 Dị ka Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi, anyị na-eru újú ma na-echeta ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Ma, eziokwu Bible nke bụ́ na ndị nwụrụ anwụ adịghị ata ahụhụ nakwa na e nwere olileanya mbilite n’ọnwụ, na-eme ka mwute anyị na-enwe na újú anyị na-eru belata. N’ihi ya, n’oge anyị na-eli ozu, dịkwa ka anyị na-eme n’oge ndị ọzọ, anyị kwesịrị ijidesi eziokwu Bible ike ma jụ kpamkpam omenala Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nakwa omume ndị ụwa.—1 Kọr. 10:31; 2 Kọr. 6:14-18; Jọn 17:16.

11 Site n’ịṅa ntị nke ọma na ndụmọdụ nakwa n’ihe ncheta ndị a dabeere na Bible, anyị ga na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Chineke iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.—Kọl. 1:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya