Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/06 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na November 13
  • Izu Na-amalite na November 20
  • Izu Na-amalite na November 27
  • Izu Na-amalite na December 4
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 11/06 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije ozi

Izu Na-amalite na November 13

Abụ nke 152

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa November. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche November 15 na Teta! October–December. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a pụrụ isi zaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Amataworị m ọrụ unu nke ọma.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Gaa n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 12.

Minit 20: Ndị Ozi nke Ozi Ọma Ahụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 77 ruo peeji nke 83 n’isiokwu nta bụ́ “Ịkọ Banyere Ọganihu nke Ozi Ahụ.”

Minit 15: “Ndị Na-adịghị Atụ Egwu, Ma Ha Na-eme Udo.”a Gụnye ihe e kwuru n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 252-253, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Mgbe A Ga-ekwenye n’Ihe.”

Abụ nke 39 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na November 20

Abụ nke 132

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Minit 15: Mkpa ọgbakọ.

Minit 20: Inyefe Akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu n’Ọnwa December. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ndị masịrịla ha n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu na ahụmahụ ndị bụ́ ịgba ha nwetarala n’oge ndị gara aga mgbe ha nyefere ya. Tụleghachi ụzọ ndị a pụrụ isi nyefee akwụkwọ a, bụ́ ndị e depụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2005. Jiri otu n’ime ụzọ ndị ahụ a tụrụ aro isi nyefee ya ma ọ bụ ụzọ ndị ọzọ dabara adaba isi nyefee ya n’ókèala unu mee ihe ngosi.

Abụ nke 203 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na November 27

Abụ nke 111

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa November. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo.

Minit 15: Ijikọta Aka Na-ewu Ihe Owuwu Iji Wetara Chineke Otuto. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche November 1, 2006, peeji nke 17-21.

Minit 20: “Otú E Si Akwadebe Ihe A Ga-ekwu Mgbe A Chọrọ Inyefe Magazin.”b Gụnye ihe ngosi ga-ewe minit atọ nke ndị nkwusa abụọ, ikekwe di na nwunye, ga-eme. A ga-egosi ebe ha sapetara peeji nke 8 ma họrọ otu n’ime ụzọ ndị a tụrụ aro isi nyefee Ụlọ Nche December na Teta! October–December, ha ekpebiekwa otú ha ga-esi jiri ya nyefee magazin ahụ, ha ekwuokwa ya n’okwu nke aka ha. Ha mesịa nke ahụ, ha ejiri aro ndị nke a tụrụ n’isiokwu a a tụlere ugbu a kwadebe ụzọ ha ga-esi jiri isiokwu ọzọ dị na magazin ahụ, bụ́ nke ha chọpụtara na ndị bi n’ókèala unu ga-enwe mmasị na ya, nyefee ya. Ha kwadebesịa ya, ha emee ihe ngosi ya.

Abụ nke 120 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na December 4

Abụ nke 155

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Minit 15: “Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!”c Gbaa ọgbakọ ume iji ihe ndị pụrụ iche dị n’akwụkwọ ahụ, dị ka igbe na ihe osise, mee ihe nke ọma. A mụsịa ihe ọmụmụ nke izu ọ bụla, e kwesịrị iji Bible tụleghachi ihe ahụ a mụrụ.

Minit 20: Jiri Bible Na-eme Ihe Mgbe Ị Na-aza Ajụjụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’Ụlọ Nche August 15, 2002, peeji nke 17-18, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Igosipụta Ịhụnanya Maka Eziokwu Ndị Anyị Na-akụzi.” Gwa ndị na-ege ntị ka ha zaa ajụjụ nke ọ bụla. Mee ihe ngosi nke ebe onye nkwusa ji akwụkwọ Bible Na-akụzi, isi nke 16, paragraf nke 6-10, na-enye onye ọrụ ibe ya azịza dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mgbe onye ọrụ ibe ya ahụ jụrụ ya, sị, “Gịnị mere unu anaghị agba Krismas?”

Abụ nke 168 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya