Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/06 p. 1
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpughe—Mmezu Ya nke Na-enye Obi Ụtọ!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Uru Akwụkwọ Mkpughe Ga-abara Gị Taa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ihe Akwụkwọ Mkpughe Kwuru Gbasara Ọdịnihu Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 11/06 p. 1

Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!

1 “Obi ụtọ na-adịrị onye na-agụpụta na ndị na-anụ okwu amụma nke a, na ndị na-eme ihe ndị e dere n’ime ya; n’ihi na oge ahụ a kara aka dị nso.” (Mkpu. 1:3) Okwu ndị ahụ na-egosi uru akwụkwọ Mkpughe bara, nke ka nke, ebe ọ bụ na anyị bi n’oge ahụ a kara aka, bụ́ oge ọtụtụ n’ime amụma ndị e buru na ya na-emezu. N’ihi ya, ọ dabara nnọọ adaba na anyị ga-amalite ịmụ akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ malite n’izu January 8, 2007.

2 Kemgbe ikpeazụ anyị mụrụ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, ụwa agbanweela n’ọtụtụ ụzọ. (1 Kọr. 7:31) E wezụga nke ahụ, ọtụtụ ndị maliterela ikwusa ozi ọma Alaeze kemgbe ahụ enwebeghị ohere nke iso mụọ akwụkwọ Mkpughe n’amaokwu n’amaokwu. Ịmụ akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! kwesịrị inyere anyị nile aka ịnọ na nche banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.—Mkpu. 16:15.

3 Gbalịsie ike ịhụ na ịnọ ya kwa izu n’oge a ga-amụ ya. Ọ bụghị nanị na ihe a ga-amụ ga-enyere anyị aka ịnọ na nche, kamakwa, ozi ahụ Jizọs ziri ọgbakọ asaa ahụ ga-enyere anyị aka izere ọnọdụ ndị pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke na ndị nke pụrụ ime ka anyị ghara iji ozi anyị na-ejere Ya kpọrọ ihe.—Mkpu. 1:11, 19.

4 Kwadebe nke Ọma: Tupu a na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke izu ọ bụla, gụọ amaokwu ndị a ga-amụ n’akwụkwọ Mkpughe n’izu ahụ. Ghọta otú e si kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ a ga-amụ. Gbalịa ịghọta ya nke ọma otú ọ ga-eru gị n’obi. (Neh. 8:8, 12) Wepụta oge tụgharịa uche na ya ma jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka ebe a na-agwa m banyere Jehova na mmezu nke nzube ya? Olee otú m pụrụ isi mee ihe kwekọrọ ná nzube ya ma nyere ndị ọzọ aka?’

5 Afọ 92 agafeela kemgbe ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ malitere na 1914. (Mkpu. 1:10) Ihe ndị ga-eme ka ụwa mee mkpatụ bụ́ ndị e buru amụma ha n’akwụkwọ Mkpughe eruwela oge ha ga-emezu. Ịmụ akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! ga-eme ka anyị chetaghachi ihe ndị ahụ, meekwa ka anyị kwenyesikwuo ike na ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,’ nakwa ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya, dị nso.—Mkpu. 16:14; 21:4, 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya