Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na January 8
Abụ nke 12
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gbaa mmadụ nile ume ka ha kirie vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge iji kwadebe maka ihe omume a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe n’izu nke January 22. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche January 15 na Teta! January–March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi zaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Eji m ọrụ n’aka.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 11.
Minit 35: “Iwusawanye Alaka Ụlọ Ọrụ Dị na Nigeria.”a
Abụ nke 53 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na January 15
Abụ nke 93
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa January. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
Minit 15: Kwusaara Onye Ọ Bụla Ozi Ọma Ahụ. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 92 ruo n’isiokwu nta dị na peeji nke 102.
Minit 20: “Enweghị M Mmasị.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, jụọ ndị na-ege ntị ihe na-echegbukarị ndị bi n’ókèala unu. Mee ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi nke ga-egosi otú e si azaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Enweghị m mmasị.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 8.
Abụ nke 135 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na January 22
Abụ nke 224
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche February 1 na Teta! January–March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe a gara nletaghachi na nke onye a na-ewegara magazin mgbe nile.
Minit 10: Ọ̀ Dị Ihe Na-adọla Gị Azụ? Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche April 1, 2002, peeji nke 13-15.
Minit 25: “Olee Ụdị Ọgwụgwọ Kasị Mma E Nwere?” Ọ bụ okenye ga-eme ya. Gị na ndị na-ege ntị malite ozugbo tụlewe vidio bụ́ No Blood site n’iji ajụjụ ndị e depụtara n’isiokwu ahụ mee ihe. Mechie site n’ịgụ paragraf nke ikpeazụ na ịgba mmadụ nile ume iji nlezianya tụlee isiokwu ndị ahụ e zoro aka na ha n’Ụlọ Nche.
Abụ nke 188 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na January 29
Abụ nke 55
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa January. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa February, ma mee otu ihe ngosi nke otú a pụrụ isi nyefee ya.
Minit 10: Ọ bụrụ na I Kwere Nkwa Ịgaghachi, Gaghachi. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’Ụlọ Nche September 15, 1999, peeji nke 11. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị na-egosi otú Jehova si gọzie ha n’ihi na ha gaghachiri dị ka ha kwere nkwa ime.
Minit 25: “Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme na February 19–March 18!” Nkwurịta okwu na-ekpo ọkụ nke okenye ga-eduzi. Mgbe ị gụchara ịma ọkwa ahụ dị n’akwụkwọ ozi nke June 6, 2006, bụ́ nke e degaara ndị okenye, hụ na e nyere onye ọ bụla bịara nzukọ otu Akụkọ Alaeze nke 37. E nyesịa ha ya, i jirizie ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu ahụ sochie ya. Kwuo ndokwa ọgbakọ unu merela iji hụ na e kesara Akụkọ Alaeze nke 37 ahụ n’ókèala unu nile. Gbaa ndị nkwusa nile ume ka ha soro mee mkpọsa a pụrụ iche. Mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke otú a pụrụ isi kesaa Akụkọ Alaeze ahụ.
Abụ nke 50 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na February 5
Abụ nke 3
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Minit 15: Rite Uru site n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, bụ́ nke ga-adabere n’okwu mmalite nke akwụkwọ bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị.—2007. Kwuo mkpa ọ dị mmadụ nile ịhụ na ha na-ewepụta minit ole na ole kwa ụbọchị iji tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kọọ usoro ha na-agbaso iji hụ na ha na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị na otú o sirila baara ha uru. Mechie site n’ịtụle, n’ụzọ dị mkpirikpi, isiokwu dịịrị afọ 2007.
Minit 20: “Ịhụnanya—Isi Ihe Na-eme Ka Anyị Na-arụpụta Ihe n’Ozi Ubi.”c Gụnye ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche February 1, 2003, peeji nke 23, paragraf nke 16-17.
Abụ nke 83 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.