Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na November 10
Abụ nke 205
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa November. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị nkwusa enyefewela Ụlọ Nche nke November 1 na Teta! nke October-December enyefewe n’ozi, jụọ ndị na-ege ntị otú ha sirila nwee ike inyefe magazin ndị ahụ.
Nkeji 15: Mụta Igosi Ịhụnanya na Imesapụ Aka. Okwu okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke November 15, 2008, peeji nke 6-7.
Nkeji 20: “Anyị Nwere Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ikesa.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, jụọ ndị na-ege ntị eziokwu Baịbụl ndị mere ka ha nwee mmasị ná nzukọ Jehova ma ọ bụ ndị nke ha ghọtarala nke ọma karịa kemgbe e mesịrị ha baptizim.
Abụ nke 71
Izu Na-amalite na November 17
Abụ nke 80
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
Nkeji 15: Igbe Ajụjụ.b
Nkeji 20: “I Nwere Ike Ịbụ Onye Nkụzi”c Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ nke cheburu na ya erughị eru iduzi ọmụmụ Baịbụl ma ya emesịa malite iduzi ọmụmụ Baịbụl ajụjụ ọnụ. Olee otú o si dabere n’ebe Jehova nọ maka enyemaka? Olee ụzọ ndị nzukọ a siworo nyere ya aka iru eru? Olee uru ndị o riterela n’ihi iso na-arụ ọrụ iduzi ọmụmụ Baịbụl?
Abụ nke 143
Izu Na-amalite na November 24
Abụ nke 217
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na December, meekwa otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke otú e nwere ike isi nyefee ya.
Nkeji 20: “Iwu Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe Na-efughị Oké Ego Na-ewetara Jehova Otuto.”d Paragraf nke 1-8. Ọ bụ okenye ga-eme ya. Mgbe a na-atụle paragraf nke 8, ka ndị na-ege ntị kọọ ahụmahụ ndị dị mkpirikpi na-egosi otú ha sirila rite uru site n’inye aka n’iwu ebe ndị a na-anọ efe ofufe n’ógbè ha. E nwere ike ibu ụzọ gwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ka ha kwadebe akwadebe.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Ụlọ Nche December 1 na Teta! October-December. Kọwatụ isi ihe ndị dị na magazin ndị ahụ, jụọkwa ndị na-ege ntị isiokwu ndị nwere ike ịka masị ndị bi n’ókèala unu. Olee ajụjụ ndị e nwere ike ịjụ na amaokwu Baịbụl ndị e nwere ike ịgụ iji nyefee magazin ndị ahụ? Mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi jiri aro dị n’Ozi Alaeze Anyị nyefee ha. Ka otu okenye mee ihe ngosi nke otú ọ chọrọ isi jiri isiokwu dabara adaba n’ókèala unu nyefee otu n’ime magazin ndị ahụ.
Abụ nke 208
Izu Na-amalite na December 1
Abụ nke 84
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa November.
Nkeji 15: “Iwu Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe Na-efughị Oké Ego Na-ewetara Jehova Otuto.”e Paragraf nke 9-14, gụnyere igbe ndị dị na peeji nke 5 na nke 6. Ọ bụ odeakwụkwọ ga-eme ya. Mgbe a na-atụle paragraf nke 12, chetara ọgbakọ mkpebi ndị yiri nke a ha merela n’oge gara aga. Jaa ọgbakọ mma n’ebe ndị ha mezurula ihe ndị e kpebiri. Mee ka ha mara ihe ndị ọzọ ha nwere ike ime iji na-enye onyinye ma ọ bụ iji hụ na a na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze anya.
Nkeji 20: “Kwadebe Ndị Ọhụrụ Idi Mmegide.”f Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, kọwatụ otú ihe dị n’akwụkwọ Reasoning n’okpuru isiokwu bụ́ “Jehovah’s Witnesses” (Ndịàmà Jehova) nwere ike isi nyere ndị a na-amụrụ Baịbụl aka ịza ajụjụ ndị ikwu ha na ndị enyi ha na-eche banyere ha jụrụ ha.
Abụ nke 105
[Ihe odide ala alal peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
d Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
e Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
f Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.