Kwadebe Ndị Ọhụrụ Idi Mmegide
1 Mgbe ndị mmadụ malitere ịmụ Baịbụl ma ‘chọọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọro ná nsọpụrụ Chineke,’ Setan na-elekwasịzi ha anya dị ka anụ oriri. (2 Tim. 3:12) Mmegide nwere ike isi n’aka ndị ọrụ ibe ha, ụmụ akwụkwọ ibe ha, ma ọ bụ ndị agbata obi ha. O nwere ike isiri ndị ọhụrụ ike odidi karịsịa mgbe ndị ikwu ha buuru ha ezi ihe n’obi malitere imegide ha.—Mat. 10:21; Mak 3:21.
2 E Buru Amụma na A Ga-emegide Anyị: Ndị ọhụrụ aghaghị ịghọta na ha ga-atụ anya inweta mkpagbu nakwa na ọ na-egosi na ha aghọọla ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Jọn 15:20) Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ nwere ike ịdị na-emegide ha n’ihi na ha nụrụ ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Ndịàmà Jehova. Buru n’obi na ị ga-enwe ọṅụ dị ukwuu ma ọ bụrụ na e mee gị ihe ihere n’ihi na ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs nakwa n’ihi na ị na-erubere Chineke isi. (Ọrụ 5:27-29, 40, 41) Mesie ndị ọhụrụ obi ike na Jehova ga-eji ịhụnanya nyere ha aka. (Ọma 27:10; Mak 10:29, 30) Ha ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova na-egosi na ha nọ n’akụkụ ya n’ihe iseokwu ahụ metụtara onye o ruuru ịchị eluigwe na ala.—Ilu 27:11.
3 Uru Ezi Ihe Ọmụma Bara: Mee ka ndị ị na-amụrụ Baịbụl mata mkpa ọ dị ịnọgide na-enweta ezi ihe ọmụma n’agbanyeghị ule ndị ha nwere ike ịdị na-agabiga. Setan na-agba mbọ iji mkpagbu mee ka ihe ndị ha na-amụta ghara ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi ihe atụ ha. (Ilu 4:23; Luk 8:13) Ha aghaghị ịnọgide na-enweta ezi ihe ọmụma sitere n’Okwu Chineke iji wee gbanyesie mgbọrọgwụ ike n’okwukwe.—Ọma 1:2, 3; Kọl. 2:6, 7.
4 Mkpa Ntachi Obi Dị: N’ọnọdụ ọ bụla tara akpụ anyị nọ na ya, ntachi obi dị anyị mkpa, o nwekwara ike ịrụpụta ezi ihe. (Luk 21:16-19) Mgbe ndị ọhụrụ diri mmegide, ha na-abara onwe ha na ndị ọzọ uru. Ha na-ahụ na Jehova nwere ike ịgọzi ndị ji ikwesị ntụkwasị obi die mmegide.—Jems 1:12.
5 Pọl onyeozi ṅụrịrị ọṅụ mgbe ụmụnna ya nọ na Tesalonaịka nwere ọganihu n’ọgbakọ. O kelere Chineke maka ụmụnna ahụ, bụ́ ndị o nyeere ọtụtụ n’ime ha aka ịbata n’eziokwu. (2 Tesa. 1:3-5) Anyị onwe anyị kwa nwere ike inwe ụdị ọṅụ na afọ ojuju ahụ ma ọ bụrụ na anyị akwadebe ndị anyị na-amụrụ Baịbụl idi mmegide.