Iwu Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe Na-efughị Oké Ego Na-ewetara Jehova Otuto
1, 2. (a) Olee ihe ndị ohu Chineke merela iji hụ maka uto a na-enwe n’oge ikpeazụ a? (b) Olee ajụjụ ụfọdụ anyị ga-atụle n’ihe metụtara nke a?
1 Uto ọgbakọ Jehova na-eto n’ike n’ike n’oge owuwe ihe ubi a emeela ka ọ dị mkpa ka ndị ohu Chineke nọ n’ụwa mee ka ihe dị mfe. N’ihi uto a e buru n’amụma, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, e meela ka ibipụta akwụkwọ na ikesa ha, ịhazi maka mgbakọ ukwu na ndị nke nta, na otú e si enweta ego maka ebe ndị a na-anọ efe ofufe dị mfe. (Aịza. 54:1-4; 60:22) N’otu aka ahụ, a gbanweela otú e si ewu ebe ndị Chineke na-anọ efe ofufe na otú e si eji ha eme ihe iji nwee ike ịrụzu ihe ndị a chọrọ.
2 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e wuola ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ na ihe karịrị ebe iri abụọ na anọ e ji eme mgbakọ (ma Ụlọ Nzukọ Alaeze a pụrụ iji mee mgbakọ ma Ụlọ Mgbakọ) gburugburu Nigeria. Olee otú iwu ihe owuwu ndị na-efughị oké ego si nye aka n’ịrụzu ihe a niile? Olee ihe ndị e merela ka ha ghara ịdị na-efu oké ego n’ebe ndị a a na-anọ efe ofufe? Olee otú anyị nwere ike isi kwado ebe ndị a a na-anọ efe ofufe na-efughị oké ego?
Ebe Ndị A Na-anọ Efe Ofufe Na-efughị Oké Ego
3. Olee otú e sizi arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ọ ghara ifu oké ego?
3 Ụlọ Nzukọ Alaeze: Isi ihe mere e ji mee ndokwa iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ndị na-abachaghị ọgaranya, gụnyere Nigeria, bụ iji hụ na e wuru ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọ dị mkpa ka e wuo. Iji hụ na a na-ewuchapụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa, nzukọ a ekpebiela otú Ụlọ Nzukọ Alaeze ga na-adịzi, na ụdị ágbá a ga na-etezi ya. Ụfọdụ n’ime ihe ndị e merela iji belata ego a na-emefu ná mba a ugbu a bụ inwe oche bench, inwe mposi nkịtị ma ọ bụ ndị nke a ga-eji bọket na-awụchapụ kama inwe mposi ndị na-awụchapụ n’onwe ha, ịghara ite akụkụ ụlọ ahụ niile ágbá, ịghara inwe ebe ndị na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ebi, ịghara ite ala ụlọ simenti otú ọ ga na-akwọ mụrụmụrụ, ịghara iji blọọkụ gbachie ụlọ nzukọ nke ọ bụla, nakwa ịghara itinyecha uko na ha niile. Ihe karịrị puku ọgbakọ atọ gburugburu Nigeria na-amụ ihe kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị otú ahụ na-efughị oké ego ma maa mma.
4. (a) Gịnị mere Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a pụrụ iji mee mgbakọ ji dị mkpa? (b) Olee otú e si arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a pụrụ iji mee mgbakọ ka ha ghara ifu oké ego?
4 Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndị A Pụrụ Iji Mee Mgbakọ: Ugboro atọ n’afọ, ndị Chineke na-agbakọta maka mgbakọ ukwu ha na ndị nke nta. N’ebe ụfọdụ na Nigeria, ụmụnna na-eme ogologo njem iji gaa mgbakọ ndị a. N’ebe ndị ọzọ, ụfọdụ na-agafe mmiri iji gaa mgbakọ. Iji rụtara ụmụnna ndị a ebe ndị dị mma ha ga-anọ na-eme mgbakọ, a rụọla ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a pụrụ iji mee mgbakọ. Iji belata ego ụlọ nzukọ ndị a ga-efu, ebe ikpo okwu ha na-adị ala, akụkụ ha na-eghe oghe, ebe ndị mmadụ na-anọ anaghịkwa akpọda akpọda, ha na-enwekwa bench ndị na-enweghị ebe ndabere iji mee ka ha bakwuo ndị mmadụ. N’ihi na ụlọ nzukọ ndị a pere mpe, a na-eke sekit ụfọdụ eke maka mgbakọ sekit ha.
5. (a) Olee otú e sizi arụ Ụlọ Mgbakọ ka ọ ghara ifu oké ego? (b) Olee ihe a kwụsịrịla ime ma a bịa n’otú e si arụ ụlọ obibi?
5 Ụlọ Mgbakọ: Mgbe ọtụtụ sekit chọrọ ebe ha ga na-anọ eme mgbakọ, alaka ụlọ ọrụ ga-atụle ma à ga-arụrụ ha Ụlọ Mgbakọ. Ọ bụ ezie na a na-arụchapụ Ụlọ Mgbakọ ndị a na-arụchabughị arụcha, a na-arụkwa ndị ọhụrụ na-ebuchaghị ihe ndị nke mbụ bu. Ha na-abụ ụlọ nzukọ ndị na-asaghị mbara, ndị akụkụ ha ghekwa oghe, ndị ebe ndị mmadụ na-anọ na ha kpọdatụrụ obere, ndị nwere ọfịs ole na ole, na ndị nwere mposi ndị a na-eji bọket awụchapụ kama inwe mposi ndị nke na-awụchapụ n’onwe ha. Ọzọkwa, e nwere ike ịrụ otu ebe ọgbakọ na-ebi ma ọ bụ abụọ, ma a na-arụ ha naanị n’ebe inweta ụlọ n’ebe ndị ọzọ na-esi ezigbo ike. Ụlọ obibi ndị a anaghị ama oké mma, a na-ejikwa naanị blọọkụ arụ ha, n’eteghị ahụ́ ha simenti, a na-awụkwa ala ha awụ. Ihe e bu n’obi rụọ ha abụghị ka ha baa mmadụ niile bịara mgbakọ chọrọ ụlọ obibi, kama nke ahụ, ọ bụ naanị maka ndị ụlọ obibi kacha dịrị mkpa. Mgbe ụfọdụ, n’ebe a chọrọ ụlọ obibi karịrị ndị e nwere, a na-atụ anya na ngalaba na-enye ụlọ ga-achọtara ndị fọrọ afọ ụlọ n’ụlọ ndị mmadụ, na họtel, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’ebe ndị ọzọ.
Iwu Ihe Owuwu Ndị Na-efughị Oké Ego Arụpụtala Ezi Ihe
6. Olee ihe anyị iwu ebe ndị a na-anọ efe ofufe na-efughị oké ego rụpụtarala?
6 Olee ihe mgbanwe ndị a e mere rụpụtarala? Nzukọ a na-ejizi obere ego o nwere arụ ọtụtụ ụlọ nzukọ. N’ihi ya, ọtụtụ ụmụnna na-enwezi ike inwe ebe ndị dị mma ha ga na-ezukọ. (2 Kọr. 8:10-15) Ịrụ ụlọ nzukọ ndị a n’ụzọ dị mfe na iji ihe ndị na-adaghị oké ọnụ arụ ha na-emekwa ka ọ dịkwuoro ọtụtụ ndị mfe iwepụta onwe ha iso rụọ ha, bụ́ nke na-eme ka a rụọ ha ọsọ ọsọ, belatakwa oge ọ na-ewe iji rụọ ha. Ebe ọ bụ na a naghị eji ihe ndị dara oké ọnụ ete ahụ́ ha, ọ naghị efu oké ego ilekọta ha, n’ihi ya, ọgbakọ na sekit dị iche iche na-enwe ike ilekọta ha n’onwe ha.—Gal. 6:5; Fil. 1:10.
7, 8. Jehova ọ̀ gọziela mgbalị anyị na-eme ime ka ihe dị mfe? Nye ihe atụ.
7 O doro anya na Jehova na-agọzi ndokwa a e mere ịrụ ebe ndị a na-anọ efe ofufe n’emefughị oké ego. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ March 2008, a rụchaala Ụlọ Nzukọ Alaeze dị puku iri na isii, narị itoolu na iri itoolu na abụọ n’otu narị ala na iri na anọ kemgbe ndokwa a malitere na November 1999. A rụrụ puku abụọ na iri na otu n’ime ha na Nigeria. N’otu oge ahụ, a rụchakwara ebe iri abụọ na ise a na-anọ eme mgbakọ na Nigeria—Ụlọ Nzukọ Alaeze a pụrụ iji mee mgbakọ ma ọ bụ Ụlọ Mgbakọ. Ihe a niile esorola mee ka a mara aha Jehova na Alaeze ya.
8 Mgbe a na-arụ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Delta State, ihe ka ọtụtụ ná ndị nkwusa nke ọgbakọ a na-arụrụ ya kpọchiri ụlọ ahịa ha ma wepụta onwe ha iso rụọ ọrụ. Mgbe otu onye nwere mmasị nke wepụtara onwe ya iso rụọ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze rụchara ọrụ otu ụbọchị, o kwuru, sị: “Ọ bụ unu na-akụzi eziokwu. M ga-achọ nnọọ ịghọ onye òtù unu.” O nwere nnọọ ọganihu n’ọmụmụ ihe ya, n’oge na-adịghịkwa anya, o ruru eru ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. N’Akwa Ibom State, mgbe otu eze nụrụ na a wụsara okwute e butere maka otu Ụlọ Nzukọ Alaeze a na-arụ n’ebe ahụ n’ebe dị anya site n’ebe a na-arụ ọrụ n’ihi otú ụzọ ha si jọọ njọ, ọ kpọkọtara ndị obodo ya niile ka ha gaa rụọ ọrụ n’okporo ụzọ ahụ ruo otu izu. Ha ji blọọkụ kụwasịrị akụwasị wụchisie olulu niile dị n’ụzọ ahụ. Ọzọkwa, o kwere ka nwunye ya na nwa ya nwoke soro anyị na-aga ọmụmụ ihe. O kwuru, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na ụdị ihe a na-eme n’obodo m.”
Ịkwado Ebe Ofufe Ndị Na-efughị Oké Ego
9. Olee ihe atọ anyị ga na-eme iji na-akwado ebe anyị na-anọ efe ofufe?
9 Ebe anyị bụ ndị Jehova, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado ndokwa ndị a. Anyị ji ebe ofufe anyị ndị a kpọkwasịrị aha Jehova kpọrọ ihe. Anyị achọghị ka ụlọ ndị a wetara ofufe anyị nkọcha. N’ihi ya, olee ihe anyị nwere ike ime? Anyị nwere ike inye aka (1) na-elekọta ha, (2) jiri ha na-eme ihe e ji maka ya rụọ ha, ma (3) na-enye onyinye maka ịnọ na ha amụ ihe na maka ilekọta ha. Dị ka ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, anyị kwesịkwara ime “nnọọ otú ahụ” n’akụkụ ndị a.—Jen. 6:22; Ọpụ. 7:6.
10. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịdị na-eme iji nye aka ilekọta ebe ndị anyị na-anọ efe ofufe?
10 Ilekọta Ha: Ụlọ niile chọrọ nlekọta, ilekọta ụlọ chọkwara ihe n’aka anyị. Ihe ọ chọrọ anyị n’aka bụ ịdị na-enye onyinye ma na-ewepụta onwe anyị n’afọ ofufo. Ọ bụ ihe ùgwù inye aka n’ụzọ ebe abụọ a. Iji lekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị okenye ọgbakọ na-ahazi otú a ga-esi na-elekọta ya. Nke a nwere ike ịgụnye ịza ụlọ nzukọ ahụ mgbe ọ bụla a gbasara ọmụmụ ihe, ịsa ya nke ọma kwa ọnwa, ịsụchasị ahịhịa dị gburugburu ya, ịcha okooko osisi ndị dị na ya, na ịrụ nnukwu ọrụ na ya mgbe ụfọdụ, dị ka itegharị ya ágbá na ịrụzi ihe ndị mebiri na ya. Iji hụ na e lekọtara Ụlọ Mgbakọ, a na-akpọ sekit na ọgbakọ dị iche iche òkù ka ha bịa nye aka ime ka ọ dị ọcha na ilekọta ya. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịchọ enyemaka nke ndị ọrụ nkà, dị ka ndị plọmba, ndị ọrụ ọkụ eletrik, ndị na-edo ụlọ, ndị kapịnta, na ndị ọzọ, iji rụzie ihe ụfọdụ na ya. Anyị na-egosi na anyị na-akwado ndokwa a site n’ịdị njikere iwepụta onwe anyị iji nkà anyị nye nnọọ aka mgbe ọ bụla a kpọrọ anyị, ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe a na-anọ eme mgbakọ.—Ọma 110:3.
11. Olee otú anyị nwere ike isi kwanyere ebe ofufe anyị ùgwù ma anyị gaa ọmụmụ ihe na mgbakọ?
11 Iji Ha Eme Ihe nke Ọma: Anyị kwesịrị ịdị na-eji ebe ndị anyị na-ezukọ eme ihe e ji maka ya rụọ ha, nke bụ́ ịnọ na ha efe ofufe. Nke ahụ pụtara na anyị ga na-eme ihe otú ga-egosi na anyị na-akwanyere ebe ndị a ùgwù nakwa na anyị ji ihe ndị metụtara ofufe Chineke kpọrọ ihe. (1 Kọr. 10:31) Dị ka ihe atụ, ejighị ụlọ mposi mee ihe nke ọma nwere ike imebi ihe ga-efu nnukwu ego iji rụzie ya. Ịgbafusị mmiri na-eme ka ndị ọzọ ghara ịhụ nke ga-ezuru ha, meekwa ka a na-emefusị ego a raara nye Jehova. Isi ihe n’ekwu ma ọ bụ na stoovu na-akwụ anwụrụ n’ebe a na-eme mgbakọ nwere ike iso mee ka ebe a na-anọ esi ihe ghara ịdị mma n’anya. Ọ dị mkpa ka a na-agbasochi ntụziaka ndị e nyere banyere otú a ga-esi na-eji ebe ndị a eme ihe anya. E kwesịrị iji ihe niile e nyere anyị n’ebe ndị anyị na-ezukọ, bụ́ ndị gụnyere ọfịs ndị dị n’Ụlọ Mgbakọ, eme ihe e ji maka ya nye anyị ha. N’otu Ụlọ Mgbakọ, ihe otu nwatakịrị mebiri n’ebe a na-eje mposi furu nnukwu ego iji rụzie ya. N’ihi ya, ọ bụ naanị ụdị akwụkwọ e mere maka ịga mposi na mmiri ka e nwere ike iji hichaa ike mgbe a gara mposi iji zere ịsụchi mposi ahụ. N’Ụlọ Mgbakọ na n’Ụlọ Nzukọ Alaeze niile, ịkwụnye ihe n’ọkụ, gụnyere ekwe ntị, na-adọpụ uche ndị na-ege ntị, o nwekwara ike ime ka ọkụ ghara ibuli ígwè okwu. A raara ebe anyị na-anọ efe ofufe nye Jehova, n’ihi ya, e kwesịrị iji ha mee naanị ihe metụtara ofufe ya. O nweghị onye kwesịrị iji ọbịbịa ọ na-abịa ebe ahụ achụ nta ego ma ọ bụ ekwu okwu ego dịịrị ya na ndị mmadụ. Anyị aghaghị ime ihe niile anyị nwere ike ime iji hụ na àgwà anyị na àgwà ụmụ anyị na-akpa n’ebe ndị a na-akwanyere ezi ofufe ùgwù.
12. Olee otú e si enweta ego ndị e ji elekọta ebe ndị anyị na-ezukọ? (Lee igbe dị na peeji nke 5 na nke dị n’okpuru ebe a.)
12 Inye Onyinye: Iji nweta ego anyị ga-eji na-akwụ ụgwọ mmefu ma na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị ga na-etinye onyinye n’igbe e dere “Maka Mkpa Ọgbakọ” bụ́ nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Iji nweta ego a ga-eji na-elekọta ebe ndị a na-anọ eme mgbakọ ma kwụọ ụgwọ mmefu ndị a na-eme na ya, anyị ga na-etinye onyinye na nke ọ bụla n’igbe ndị dị n’ebe ahụ a na-enwe mgbakọ mgbe anyị gara mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. (Lee igbe dị na peeji nke 5 iji ghọtakwuo ihe banyere onyinye ndị anyị na-enye maka ebe ndị anyị na-ezukọ.) Olee otú anyị kwesịrị isi lee nke a anya? Anyị kwesịrị ile ya anya dị ka ihe so n’ofufe anyị na-efe Jehova.—Ilu 3:9, 10; 2 Kọr. 9:7.
13, 14. Olee otú anyị niile na onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi kwado mgbanwe a e mere ibelata ego e ji ewu ebe ofufe anyị ma gosi na o juru anyị afọ?
13 Anyị ekwesịghị inwe “nkụda aka” ma ọ bụkwanụ ‘leghara ụlọ Chineke anyị anya’ mgbe a bịara n’inye onyinye maka ojiji anyị ji ebe ndị anyị na-ezukọ eme ihe na maka ilekọta ha. Nke a bụ ihe ga-egosi na anyị nwere obi ụtọ maka inweta ebe ndị dị otú ahụ nakwa na anyị chọrọ ka ndị ọzọ ritekwa uru ná ndokwa ahụ. (2 Ihe 15:7; Nehe. 10:32, 39b) A na-ere ala ndị a na-enweghị ike iji wuo ebe ofufe ma jiri ego e retara na ha wuo ebe ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ gaara achọ ka a rụọrọ ha Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ka buo ibu na ndị ka maa mma, otú e kwurula a ga-esi na-ewu ha n’emefughị nnukwu ego, dabere n’ebe a ga-ewu ha, kwesịrị iju anyị afọ. (2 Kọr. 8:14, 15) Ihe ọ bụla mebie na ha, e kwesịrị imezi ha ozugbo tupu ha emebie ihe ndị ọzọ.
14 Oge a bụ oge dị oké mkpa, bụ́ mgbe ndị Chineke na-anụ nnọọ ọkụ n’obi. “Ebe [anyị] nwere ntụkwasị obi na [unu] ga-ekwere” ihe e kwuru n’ihe ntinye a, anyị ji n’aka na otú unu ga na-esi ewepụta onwe unu ịrụ ọrụ, ọrụ ndị unu ga na-arụ, onyinye unu, nakwa otú unu ga-esi jiri nlezianya na-eji ebe ndị anyị na-ezukọ, bụ́ ndị na-efughị oké ego ma dị ùgwù, eme ihe ga-egosi nnọọ na unu dị njikere irubere nzukọ Jehova isi.—Faị. 21.
[Igbe dị na peeji nke 5]
INYE ONYINYE MAKA ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE
◼ Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze A Ga-ewu n’Ọdịnihu: Ọgbakọ ndị na-eme atụmatụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nwere ike ime mkpebi ịdị na-edokọta ego maka ya. A na-etinye onyinye maka nke a n’igbe e dere “Maka Mkpa Ọgbakọ,” bụ́ nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-eji Contribution Remittance Form (S-20) ezitere alaka ụlọ ọrụ onyinye a kwa ọnwa.
◼ Maka Ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Amụ Ihe: Ọgbakọ niile nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze a rụchara arụcha na-eme mkpebi ego ole ha ga na-enye alaka ụlọ ọrụ kwa ọnwa maka ọnụnọ ha na-anọ na ya amụ ihe. A na-etinye onyinye maka nke a n’igbe e dere “Maka Mkpa Ọgbakọ” nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-eji Contribution Remittance Form (S-20) ezitere alaka ụlọ ọrụ onyinye a kwa ọnwa.
◼ Maka Ndokwa Enyemaka Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze: Ọgbakọ niile nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme mkpebi ego ole ha ga na-enye n’onyinye maka ndokwa a nke na-eme ka e nwee ego a ga-eji kwụọ ụgwọ ihe mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ụgwọ ọ bụla a chọrọ ka a kwụọ n’ihi ihe mere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-etinye onyinye maka nke a n’igbe e dere “Maka Mkpa Ọgbakọ” nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-eji Contribution Remittance Form (S-20) ezitere alaka ụlọ ọrụ onyinye a kwa ọnwa ma ọ bụ kwa afọ.
◼ Maka Ịkwụ Ụgwọ Mmefu Ndị A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze: Ọ bụ ọgbakọ nke ọ bụla ka ọ dịịrị ịkwụ ụgwọ mmefu ọ bụla e mere iji lekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, ma ndị a na-eme kwa mgbe kwa mgbe ma ndị a na-eme mgbe ogologo oge gafesịrị. Otu ugboro n’afọ, òtù ndị okenye na-atụle ihe ndị a na-emefu ma gwa ọgbakọ ego ole ọ dị mkpa ka ha na-enye n’onyinye kwa ọnwa maka nke a. A na-etinye onyinye maka nke a n’igbe e dere “Maka Mkpa Ọgbakọ” nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-agba ọgbakọ ume ka ha malite idebe ego n’ụlọ akụ̀ maka nke a. Ma ọ bụkwanụ, ha ana-ezitere alaka ụlọ ọrụ ego a ka ha dowere ha.
◼ Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze A Na-arụ n’Ụwa Niile: Onyinye a bụ iji kwado ndokwa e mere iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma n’obodo a, ma n’obodo ndị ọzọ. A na-etinye onyinye maka nke a n’igbe e dere “Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze A Na-arụ n’Ụwa Niile,” a na-ewekọtakwa ya ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ kwa ọnwa. Ọgbakọ niile nwere ihe ùgwù nke inye onyinye a, ọbụna ma a sị na ha na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha ugbu a. Igbe a abụghị ebe a na-etinye onyinye maka ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu amụ ihe, kama ọ bụ maka Ụlọ Nzukọ Alaeze a na-arụ n’ụwa niile.
Igbe dị na peeji nke 6]
ONYINYE MAKA EBE NDỊ A NA-ANỌ EME MGBAKỌ
◼ Maka Ịnọ Ebe A Na-anọ Eme Mgbakọ Enwe Mgbakọ: Ọgbakọ niile na-eme mkpebi ego ole ha ga na-enye alaka ụlọ ọrụ n’onyinye kwa ọnwa maka ịnọ n’ebe a enwe mgbakọ, ma ọ̀ bụ Ụlọ Mgbakọ ma ọ̀ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze a pụrụ iji mee mgbakọ. A na-etinye onyinye maka nke a n’igbe e dere “Maka Mkpa Ọgbakọ” nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-eji Contribution Remittance Form (S-20) ezitere alaka ụlọ ọrụ onyinye a kwa ọnwa. A na-eji onyinye niile e nwetara n’igbe onyinye ndị dị ná mgbakọ distrikti ahụ maka ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ, bụ́ nke gụnyere iwu Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze.
◼ Maka Ịkwụ Ụgwọ Mmefu Ndị A Na-eme n’Ebe Ndị A Na-anọ Eme Mgbakọ: Ọ bụ sekit dị iche iche ka ọ dịịrị ịhụ maka ego ndị e ji elekọta ebe ndị ha na-anọ eme mgbakọ, dabere n’ego ole ha mere atụmatụ na ha ga na-emefu maka nke a n’afọ. Onye nkwusa ọ bụla na-etinye onyinye ya maka nke a n’igbe onyinye ndị dị n’ebe a na-enwe mgbakọ mgbe ọ gara mgbakọ sekit ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. Mgbe e nwere mkpa, dị ka ihe atụ, mgbe onyinye ndị sekit dị iche iche nyere maka ilekọta ebe a na-eme mgbakọ na-ezughị, onye nlekọta sekit ga-agwa ọgbakọ dị iche iche ka ha mee mkpebi ma nye onyinye kpọmkwem maka nke a.—Lee od-IB peeji nke 130.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ụlọ Nzukọ Alaeze a pụrụ iji mee mgbakọ, nke dị na Kaduna
[Foto dị na peeji nke 4]
Ụlọ Nzukọ Alaeze, nke dị na Mayowa
[Foto dị na peeji nke 5]
Ụlọ Mgbakọ dị na Benin City