Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/08 p. 1
  • Ikwusa Ozi Ọma Chọrọ Ntachi Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikwusa Ozi Ọma Chọrọ Ntachi Obi
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-anọ Nzukọ Jehova Nso
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 12/08 p. 1

Ikwusa Ozi Ọma Chọrọ Ntachi Obi

1 Pọl onyeozi ji afọ iri atọ rụọ ọrụ na-enye ọṅụ nke bụ́ ikwusa ozi ọma. Dịkwa ka ọ na-adị n’ihe ọ bụla bara uru mmadụ na-eme, o nwetara nsogbu ụfọdụ n’ọrụ ikwusa ozi ọma ya. (2 Kọr. 11:23-29) N’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ, Pọl akwụsịghị ikwusa ozi ọma. (2 Kọr. 4:1) Ọ ghọtara na Jehova ga-enye ya ike ịtachi obi ná nsogbu ndị ọ na-enweta n’ozi ya. (Fil. 4:13) N’ihi otú Pọl si tachie obi ma nọgide n’ozi ya, o kwuru, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.”—1 Kọr. 11:1.

2 Ịtachi Obi n’Ọnwụnwa Ndị Na-abịara Anyị Taa: Kwa ụbọchị, a na-akparị ọtụtụ ụmụnna anyị, na-emegide ha, ma ọ bụkwanụ ndị ezinụlọ ha, ndị ọrụ ibe ha, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha ana-eburu ha ihu. (Mat. 10:35; Jọn 15:20) Ma eleghị anya, ị nọ n’ọnọdụ ahụ. O nwekwara ike ịbụ na gị na ọrịa na-alụ, ma ọ bụ ya abụrụ na kwa ụbọchị, ị na-agba mbọ izere ihe ndọpụ uche na ọnwụnwa ndị nwere ike ime ka ị dapụ n’okwukwe ma ọ bụ kwụsị ịtachi obi. Anyị nwere ike inweta ike site n’ịtụle akụkọ nke ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge gara aga nakwa nke Ndị Kraịst ibe anyị nwerela ụdị nsogbu ndị ahụ n’oge a ma merie ha.—1 Pita 5:9.

3 Anyị nwere ike inweta ike iji nọgidesie ike n’ozi anyị site n’ịhụ na anyị “[yi] ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke.” (Efe. 6:10-13, 15) Ọ dịkwa ezigbo mkpa ka anyị na-ekpegara Chineke ekpere ka o nyere anyị aka ịtachi obi. Chineke na-enye anyị mmụọ nsọ ya iji nyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa. (2 Kọr. 6:4-7) Iji merie n’agha ime mmụọ anyị na-alụ, anyị aghaghị ige Chineke ntị ka ọ na-echetara anyị ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi. (Ọma 119:24, 85-88) Dị nnọọ ka nwata nwere ike ịgụ akwụkwọ ozi nna ya ji ịhụnanya deere ya ugboro ugboro, anyị ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. Ọmụmụ ihe onwe onye na-eme ka anyị nweta amamihe ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ule, si otú ahụ na-eme ka mkpebi ndị anyị na-eme kwekọọ n’echiche Chineke ma mee ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.—Ilu 2:10, 11.

4 Ntachi Obi Na-eweta Ngọzi: Dị ka ọ dị Pọl, ịnọgide na-atachi obi ka anyị na-eje ozi anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa ma na-ewetara anyị na ndị ọzọ ngọzi. (Ilu 27:11) Ka anyị kpebisie ike ịnọgidesi ike n’ozi anyị, si otú ahụ gosi na okwukwe anyị siri ike nakwa na ọ “bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya.”—1 Pita 1:6, 7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya