Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na December 8
Abụ nke 19
Nkeji 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Ihe Ndị Anyị Na-atụ Anya Ha ná Mgbakọ Sekit nke Afọ 2009.” Maa ọkwa mgbe unu ga-aga mgbakọ sekit unu ma ọ bụrụ na unu amatala ya. Jiri obere oge tụlee aro ndị a tụrụ maka ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche December 1 na Teta! January–March, bụ́ ndị dị na peeji nke 8. Jụọ ndị na-ege ntị nwerela ike inyefe magazin ndị a otú ha si nyefee ha. Olee isiokwu ha ji nyefee ha, olee ajụjụ ha jụrụ, oleekwa amaokwu Baịbụl ndị ha gụrụ?
Nkeji 15: Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke Afọ 2009. Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Tụlee ihe ndị dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke October 2008 bụ́ ndị ọ dị mkpa ka e mesiere ọgbakọ unu ike. Kwuo ihe bụ́ ọrụ onye ndụmọdụ inyeaka. Gbaa mmadụ niile ume ịdị na-agba mbọ ime ihe omume ha, ịdị na-ekwu ihe ndị ha gụtara mgbe a na-atụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl, nakwa ịdị na-eme ihe ndị a tụrụ aro ka e mee kwa izu, bụ́ ndị sitere n’akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
Nkeji 15: “Akwụkwọ Ndị Na-enye Aka Iji Malite Nkwurịta Okwu Baịbụl Ì Ji Ha Na-eje Ozi?”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, mee ihe ngosi nke ebe onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nkwusa ọzọ ruru eru ji Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu, nke dị n’azụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-aza ajụjụ bụ́, ‘Olee ihe mere na Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas?’ mgbe ọ nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ.
Abụ nke 6
Izu Na-amalite na December 15
Abụ nke 178
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa December. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
Nkeji 10: Na-ekwughachi Ihe Iji Mesie Okwu Ike Mgbe Ị Nọ n’Ozi. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Jiri obere oge mee ihe ngosi nke otu aro ma ọ bụ abụọ dị n’akwụkwọ ahụ.
Nkeji 25: “‘Na-agbasi Àmà Ike’—Site n’Ịgba Àmà ná Nnukwu Ụlọ Ebe Ọtụtụ Ndị Bi.”b Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ ga-eme ya. Mee ka ihe e kwuru n’isiokwu ahụ kwekọọ n’ọnọdụ dị n’ókèala unu. Ya bụrụkwanụ na e nweghị nnukwu ụlọ ebe ọtụtụ ndị bi n’ókèala unu, onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ kwesịrị ikwu okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke January 1, 2005, peeji nke 13-17, paragraf nke 8-24.
Abụ nke 157
Izu Na-amalite na December 22
Abụ nke 75
Nkeji 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Ihe Ndị Anyị Na-atụ Anya Ha n’Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche nke Afọ 2009.” Maa ọkwa mgbe unu ga-aga ụbọchị mgbakọ pụrụ iche unu ma ọ bụrụ na unu amatala ya. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na January, meekwa ndokwa ka otu okenye mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee ya.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Ụlọ Nche nke January 1 na Teta! nke January–March. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Mgbe ị kọwatụsịrị isi ihe ndị dị na magazin ndị ahụ, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu na ihe mere ha ga-eji masị ha. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị ha ga-ajụ banyere isiokwu ụfọdụ dị na magazin ndị ahụ iji malite mkparịta ụka, na amaokwu Baịbụl ha ga-agụzi tupu ha enyefee magazin ndị ahụ. Mechie site n’ime ihe ngosi nke otú e nwere ike isi jiri aro ndị dị na peeji nke 8 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu nyefee magazin ndị ahụ.
Nkeji 15: “Ụbọchị Pụrụ Iche A Ga-eji Na-amalitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl.”c Maa ọkwa ngwụsị izu nke ọgbakọ unu wepụtara ha ga-eji lekwasị anya n’ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na January. Tụlee aro ndị a tụrụ na paragraf nke 3 ma jiri otu ma ọ bụ abụọ n’ime ha mee ihe ngosi.
Abụ nke 133
Izu Na-amalite na December 29
Abụ nke 60
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jd-IB isi 12 ¶1-10
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Mkpughe 15-22
Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 153
Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa December.
Nkeji 10: Igbe Ajụjụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle.
Nkeji 20: “Ikwusa Ozi Ọma Chọrọ Ntachi Obi.”d Dabere n’oge e nwere, jụọ ndị na-ege ntị ihe ndị dị n’amaokwu Baịbụl ndị a kpọtụrụ uche na ha.
Abụ nke 155
Izu Na-amalite na January 5
Abụ nke 35
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jd-IB isi 12 ¶11-22
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 1-5
Nke 1: Jenesis 3:1-15
Nke 2: Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu (lr-IB isi 1)
Nke 3: Olee Ihe Na-abụghị Ihe Efu? (1 Kọr. 15:58)
Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 98
Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Nkeji 10: Na-ele Ozi Gị Anya Otú Jizọs Si Lee nke Ya. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke dabeere n’akwụkwọ bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M,’ peeji nke 84-86, paragraf nke 16-21.
Nkeji 20: “Nkesa Pụrụ Iche A Ga-ekesa Traktị Malite na January 19 Ruo February 15, 2009!”e Ọ bụrụ na unu enwetala traktị ahụ, nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu. Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, jiri obere oge tụlee isi ihe ndị dị na traktị ahụ. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee traktị ahụ. Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, mee ihe ngosi nke ebe onye nkwusa ji traktị ahụ na-amalite ọmụmụ Baịbụl mgbe ọ gara nletaghachi.
Abụ nke 114
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji ma malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji ma malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji ma malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
d Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji ma malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
e Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji ma malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.