Ihe Ndị Anyị Na-atụ Anya Ha ná Mgbakọ Sekit nke Afọ 2009
Olee otú anyị nwere ike isi guzogide ndị ji ike ha niile na-emegide ezi ofufe? Olee otú anyị nwere ike isi merie ihe ndị na-anwa mgbe niile ịdọbaghachi anyị n’ụwa a nke na-anaghị asọpụrụ Chineke? Mgbakọ sekit nke afọ 2009 ga-aza ajụjụ ndị a dị oké mkpa. Isiokwu ya bụ “Jiri Ihe Ọma Na-emeri Ihe Ọjọọ.” (Rom 12:21) Ka anyị tụlee ihe ndị anyị ga-atụ anya ha.
Onye nlekọta distrikti ga-ekwu okwu ndị bụ́ “Ndị E Mere Ka Ha Sie Ike Iji Ihe Ọma Merie Ihe Ọjọọ,” “Kpachara Anya Ka Ị Ghara Iche na I Nweghị Ike Ịda!,” “Ihe Ọjọọ Niile Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya!,” na “Ime Ka Okwukwe Anyị Sie Ike Imeri Ụwa.” Onye nlekọta sekit ga-agwa anyị okwu n’isiokwu abụọ bụ́ “Ugbu A Bụ Oge Ịmụrụ Anya!,” bụ́ nke dabeere ná Ndị Rom 13:11-13, na “Enwela Obi Ịda Mbà n’Ụbọchị Ahụhụ,” bụ́ nke dabeere n’Ilu 24:10. Anyị na-atụkwa anya ịnụ ihe onye nlekọta sekit ga-agwa anyị n’okwu bụ́ “Ilebara Mkpa Sekit Anya.” Okwu ọzọ ga-ekpo ọkụ bụ “Ì Nwere Ike ‘Ịnọgide n’Ozi A’—Site n’Ịbanye n’Ozi Ịsụ Ụzọ?” Isiokwu nke okwu mbụ mmadụ anọ ga-ekwu bụ “Guzosienụ Ike Megide Atụmatụ Aghụghọ Ekwensu.” Ọ ga-enyere anyị aka ịmata aghụghọ ndị Ekwensu ji achọ ịrata anyị n’ihe ndị metụtara nkà na ụzụ, ntụrụndụ, na agụmakwụkwọ ma nyere anyị aka izere aghụghọ ndị a. Okwu ọzọ mmadụ anọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Nweta Ike Iji Guzogide Setan n’Ajọ Ụbọchị A” ga-egosi anyị otú anyị ga-esi mekwuo ihe kwekọrọ na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ dị ná Ndị Efesọs 6:10-18.
O nwere ihe jikọrọ imeri onye na-akpata ihe ọjọọ na ikwusa ozi Alaeze ahụ. (Mkpu. 12:17) Ka a sịkwa ihe mere Setan ji ebuso Ndịàmà Jehova agha n’eleghị anya n’azụ! (Aịza. 43:10, 12) Ma Ekwensu ga-akụ afọ n’ala n’ihi na anyị ekpebisiela ike ‘iji ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.’ Mee ndokwa ndị doro anya iji hụ na i ritere uru n’okwu niile a ga-ekwu ná mgbakọ sekit a.