Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
Jehova ruru eru ka anyị nye ya otuto. Olee otú anyị si enye Jehova otuto? Olee nsogbu ụfọdụ ndị na-enwe ka ha na-eme nke a? Olee ngọzi ndị na-enye Chineke otuto ugbu a na-enweta? Usoro ihe omume mgbakọ sekit nke afọ ije ozi 2008 ga-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ na-eju afọ. Isiokwu ya bụ, “Na-emenụ Ihe Niile Iji Nye Chineke Otuto.” (1 Kọr. 10:31) Tụlee ihe ndị a ga-agwa anyị n’ụbọchị abụọ ahụ a ga-eji kụziere anyị nnọọ Okwu Chineke.
Onye nlekọta distrikti ga-ekwu okwu n’isiokwu ndị bụ́, “Gịnị Mere A Ga-eji Nye Chineke Otuto?” na “Na-esetịpụ Ezi Ihe Nlereanya n’Ime Ihe Chineke Chọrọ.” Ọ ga-ekwu okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ, “Ole Ndị Na-enye Chineke Otuto?,” na okwu mmechi nke isiokwu ya bụ, “Iji Otu Obi Na-enye Chineke Otuto n’Ụwa Dum.” Ọ bụkwa ya ga-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Onye nlekọta sekit ga-ekwu okwu n’isiokwu ndị bụ́, “Ka Igbukepụ Ebube Chineke Na-atọ Gị Ụtọ,” “Ilebara Mkpa Sekit Anya,” na “Nọsie Ike n’Eziokwu Ahụ,” bụ́ nke ga-adabere na 2 Pita 1:12. Ọzọkwa, anyị ga-amụta otú o si bụrụ na “Ozi Ịsụ Ụzọ Na-enye Chineke Otuto.” Okwu bụ́, “Inye Chineke Otuto n’Ihe Niile Anyị Na-eme ná Ndụ,” bụ́ nke mbụ n’ụzọ okwu abụọ mmadụ anọ ga-ekwu, ga-eme ka anyị ghọta ihe gbara ọkpụrụkpụ okwu ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee ná 1 Ndị Kọrint 10:31 pụtara. Okwu mmadụ anọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Ije Ozi Dị Nsọ Iji Nye Jehova Otuto,” ga-akọwa akụkụ dị iche iche nke ofufe anyị. A ga-achịkọtara anyị Ụlọ Nche, tụleekwa ihe mmụta dịịrị ụbọchị na Sunday. A ga-emekwa ndokwa ime ndị mmadụ baptizim.
Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ achọghị irubere Chineke isi. Atụmatụ ụmụ mmadụ anatụghị ekwe ọtụtụ ndị iche echiche banyere ịdị ukwuu Jehova. (Jọn 5:44) Ma anyị ji n’aka na ọ bara uru iwepụta oge iji tụlee otú anyị ga-esi ‘Na-eme Ihe Niile Iji Nye Chineke Otuto.’ Mee ndokwa ịbịa na ịnụrụ ihe nile a ga-ekwu n’ụbọchị abụọ ahụ.