Nyere Ndị Nkwusa Gafere Ọgbakọ Ọzọ Aka Ịkwụsi Ike
1. (a) Ọ bụrụ na onye nkwusa agafee ọgbakọ ọzọ, olee ihe odeakwụkwọ ọgbakọ ọ nọbu na nke ọ gafere kwesịrị ime? (b) Olee ihe a ga-eme akwụkwọ ozi e ji akọwa onye nkwusa? (ch) Olee mgbe e kwesịrị iziga kaadị onye nkwusa n’ọgbakọ ọzọ?
1 Mgbe ụfọdụ, ndị nkwusa ọgbakọ na-akwapụ n’obodo ha bi kwaga obodo ọzọ. Ozugbo onye nkwusa ọ bụla kwagara obodo ọzọ, o kwesịrị iso ọgbakọ dị nso ebe ọ kwagara na-aga ọmụmụ ihe, meekwa ka ndị okenye mara onye ọ bụ n’egbughị oge. Nke a ga-eme ka ọ kwụsie ike n’ọgbakọ. (Ilu 18:1) Ọ bụrụ na ọ ga-anọfe ọnwa atọ n’ebe ahụ ọ gara, o kwesịrị ịgwa odeakwụkwọ ọgbakọ o sozi na-amụ ihe aha ọgbakọ ọ nọbu. Nke ahụ ga-eme ka odeakwụkwọ ahụ gwa ọgbakọ ahụ ozugbo ka ha zite Congregation’s Publisher Record kaadị ya (Kaadị Ihe Ndekọ Onye Nkwusa), ya na akwụkwọ ozi e ji akọwa onye nkwusa, bụ́ nke kọmitii ije ozi ọgbakọ ọ nọbu bịanyere aka na ya. Ọ bụrụ na ọ ma aha ọgbakọ ọ ga-eso na-amụ ihe tupu ya akwaga ebe ahụ, o kwesịrị ịgwa ya odeakwụkwọ ọgbakọ ha tupu ya akwapụ. Kọmitii ije ozi agaghịzi echewe ka ọgbakọ ahụ ọ ga-eso amụ ihe gwa ha agwa tupu ha ezigara ha ihe ndị ahụ.—Gụọ akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 88.
2. Gịnị ka a ga-eme ka akwụkwọ ozi e ji akọwa onye nkwusa na kaadị ya e zigaara ọgbakọ ọ gafere ghara ifu?
2 Ọ bụrụ na ọgbakọ ọ gafere dị ezigbo anya, e kwesịrị isi n’aka alaka ụlọ ọrụ ziga kaadị ahụ n’ọgbakọ ahụ. Ọ ga-eme ka ọ ghara ifu. Ọ bụrụ na ọgbakọ ahụ dị nso, ndị okenye nwere ike jiri aka ha nye ya ndị okenye ọgbakọ ahụ ọ gafere. Ọgbakọ ahụ ọ nọbu ga-eji ígwè photocopier mepụtaghachi kaadị ahụ na akwụkwọ ozi ahụ, tinye ya na faịlụ ruo mgbe o doro ha anya na ọgbakọ ahụ ọ gafere enwetala kaadị ahụ na akwụkwọ ozi ahụ.
3. Olee otú a ga-esi eme akụkọ ozi ndị nkwusa gafere n’ọgbakọ ọzọ, oleekwa ihe a ga-eme ma kaadị ha rute ọgbakọ ahụ aka?
3 Ọ bụrụ na e nwee ihe mere na kaadị ahụ eruteghị n’oge, odeakwụkwọ ọgbakọ ahụ o sozi na-amụ ihe e kwesịghị imepere ya kaadị ọhụrụ, kama ọ ga na-ejide akụkọ ozi onye nkwusa ahụ ruo mgbe kaadị ahụ ruru ya aka. Ya rute ya aka, ọ ga-edebanyezi akụkọ ozi ndị ahụ na kaadị ahụ, gbakọta ha na akụkọ ozi ọgbakọ nyere n’ọnwa ahụ otú ahụ a gwara ha ka ha na-eme akụkọ ozi a na-ewetaghị n’oge.
4. Olee otú anyị niile ga-esi enyere ndị gafetara n’ọgbakọ anyị aka?
4 Ndị okenye, ndị nne na nna, na Ndị Kraịst niile kwesịrị ichetara ndị nkwusa gafetara n’ọgbakọ ha ihe ha kwesịrị ime ka ha na ha nwee ike na-akpachi anya. Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ahụ, ma karịchaa ndị okenye, kwesịrị inwe mmasị n’ebe ndị nkwusa ahụ nọ. Ha kwesịrị ịmata ebe ha bi ozugbo ma nyere ha aka mee ka ahụ́ ruo ha ala n’ebe ọhụrụ a ha kwafetara.—Rom 15:7; 2 Kọr. 6:11-13.