Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 22
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 22
Abụ nke 191
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Ikpe 19-21
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 28
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enyefe na Mach. Gbaa ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Gwa ha ka ha kọwaa ihe ndị mere akwụkwọ ahụ ji maa mma iji ya duzie ọmụmụ Baịbụl nakwa otú ka mma ha chọpụtarala e nwere ike isi nyefee ya n’ókèala unu. Gwa onye nke ọ bụla n’ime ha ka o mee ihe ngosi otú e nwere ike isi jiri ya malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ mee ihe ngosi otú e sirila jiri ya malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl.
Nkeji 10: Iso Ndị Mmadụ Tụgharịa Uche Na-eme Ka Ha Gee Anyị Ntị. Okwu ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 251 ruo peeji nke 253, paragraf nke 2.
Nkeji 10: “Iche Ndị Nwere Mmasị Ihu ná Nzukọ Jehova.” Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, n’isiokwu nta dị na peeji nke 99. Jụọ ndị na-ege ntị ụzọ ndị ha sirila chee ndị nwere mmasị ihu ná nzukọ Jehova. Gbaa otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ, bụ́ onye onye duziiri ya ọmụmụ Baịbụl chere ihu ná nzukọ Jehova.
Abụ nke 127