Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Febụwarị 22, 2010. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Jenụwarị 4 ruo izu Febụwarị 22, 2010.
1. Olee àgwà anyị kwesịrị izere? (Jọsh. 22:9-12, 21-33) [w04 12/1 p. 12 para. 3]
2. Olee ihe doro anya mere Jọshụa ji kwuo ihe e dere na Jọshụa 24:14, 15, oleekwa otú o kwesịrị isi gbasa anyị? [w08 5/15 p. 17-18 para. 4-6]
3. Olee otu ụzọ ndị na-efe Bel na otú ha si efe ofufe si ghọọrọ ụmụ Izrel ọnyà na ihe ụrà? (Ikpe 2:3) [w08 2/15 p. 27 para. 2-3]
4. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Ihọd si jiri mma agha ya lụọ agha? (Ikpe 3:16, 21) [w97 3/15 p. 31 para. 4]
5. Olee otú nnapụta Jehova napụtara Gidiọn na narị ndị ikom atọ ya si agba anyị ume? (Ikpe 7:19-22) [w05 7/15 p. 16 para. 8]
6. Olee otú o si bụrụ na “nsogbu Izrel ekweghị” mkpụrụ obi Jehova “odidi”? (Ikpe 10:16) [cl p. 254-255 para. 10-11]
7. Mgbe Jefta na-ekwe nkwa na ya ga-achụrụ Jehova àjà, ò bu n’obi iji mmadụ chụọ ya? (Ikpe 11:30, 31) [w05 1/15 p. 26 para. 1]
8. Ọ̀ bụ eziokwu na ike Samsịn si ná ntutu isi ya? (Ikpe 16:18-20) [w05 3/15 p. 28 para. 5-6]
9. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị ghọta ihe dị ịtụnanya Samsịn mere, bụ́ nke a kọrọ ná Ndị Ikpe 16:3? [w04 10/15 p. 15-16 para. 7-8]
10. N’okwu gbasara mkpụrụ obi mmadụ, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe e kwuru ná Ndị Ikpe 16:30? [w90 9/1 p. 5 para. 5; sp p. 13-14]