Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 22
IZU NA-AMALITE NA MACH 22
Abụ nke 59
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:1 Samuel 10-13
Na 1: 1 Samuel 10:17-27
Na 2: Sayensị nke Ziri Ezi Na-akwado Ihe Baịbụl Kọrọ Banyere Okike (td 35A)
Na 3: Ihe Mere Ozizi Evolushọn na Ozizi Ndị Kraịst Abụghị Otu
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 87
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Maakwa ọkwa gbasara ndokwa e mere maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Ụlọ Nche Pụrụ Iche, ya bụ Eprel 1. Kwuo isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche a. Jụọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha kpebiri ịjụ onye ha ga-enye ya na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ onye ahụ. Gwa ndị nkwusa abụọ ka onye nke ọ bụla n’ime ha mee ihe ngosi otú a ga-esi enyefe ya.
Nkeji 15: Nyere Ndị Nwere Mmasị Ga-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs Aka. Okwu okenye ga-ekwu iji chetara ndị nkwusa ihe ha kwesịrị ime ma ndị ha na-amụrụ ihe, ndị nkwusa na-anaghị ejekwa ozi, na ndị ọbịa bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Kwuo isi ihe e dere n’Ozi Alaeze Anyị nke Mach 2008, peeji nke 4.) Gwa otu onye nkwusa ka o mee ihe ngosi ihe e kwesịrị ime ma ha bịa. Chetara mmadụ niile ka ha gụọ ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Abụ nke 105