Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/10 p. 4
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 3/10 p. 4

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ndị nkwusa kwesịrị ịgbalịsi ike malitere onye ha nyefere akwụkwọ a ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụ malitere ndị nwerela ya ọmụmụ Baịbụl. Eprel na Mee: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha anaghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike jiri akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, e nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla merela ochie ọgbakọ nwere.

◼ Ozugbo ọgbakọ nwetara Ụlọ Nche na Teta! ndị ọhụrụ, e kwesịrị ịhụ na ha ruru ndị nkwusa aka ka ha nwee ike ịma ihe magazin ndị ahụ na-ekwu tupu ha e jiri ha gawa ozi ọma.

◼ A ga-echeta ọnwụ Jizọs na Tuzdee, abalị iri atọ nke ọnwa Mach, afọ 2010. Ọ bụrụ na e nwere ọgbakọ na-amụ ihe n’ụbọchị Tuzdee, ha kwesịrị iyigharị ọmụmụ ihe nke izu ahụ ka ọ bụrụ n’ụbọchị ọzọ. Ọ bụrụkwa na ọtụtụ ọgbakọ na-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, nke na ọgbakọ na-amụ ihe n’ụbọchị Tuzdee agaghị eyigharịli ọmụmụ ihe ha n’izu ahụ, ha nwere ike ịhapụ ya. Ha nweziri ike gbubilata ihe omume Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ ma webata nke izu ahụ ma ọ bụrụ na ọ gbasara nnọọ ọgbakọ ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya