Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na Mee: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha anaghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike jiri akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, ndị nkwusa nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla merela ochie ọgbakọ nwere. Julaị na Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inyefe nke ọ bụla e nwere n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Nyefee broshuọ ọ bụla merela ochie unu nwere n’ọgbakọ.
◼ N’abalị 27 na 28 nke ọnwa Mee, 2010, a gaghị anabata ndị ọbịa n’alaka ụlọ ọrụ Betel dị n’Igieduma. N’ihi ya, biko, abịakwala nleta ma ọ bụ iburu akwụkwọ n’ụbọchị ndị ahụ.