Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na Febụwarị: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma ọ bụ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Eprel na Mee: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2011 bụ “Ndụmọdụ Ndị Dị na Baịbụl—Hà Nwere Ike Inyere Anyị Aka Imeri Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Taa?”
◼ O nweghị ọmụmụ ihe ọ bụla ga-adị n’ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, ya bụ na Sọnde, Eprel 17, 2011. Naanị ihe a ga-enwe ụbọchị ahụ bụ nzukọ ozi ubi. Ọgbakọ ndị na-amụ ihe n’ụbọchị ahụ nwere ike ibugharị ọmụmụ ihe nke izu ahụ n’ụbọchị ọzọ n’izu ahụ. Ya bụrụ na e nwere ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze amụ ihe, ya bụrụkwa na o nweghị ụbọchị ọzọ e nwere ike ibufe ọmụmụ ihe ahụ, e nwere ike hapụ inwe nke izu ahụ. Ya dị otú ahụ, e kwesịrị ịgwa ezinụlọ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ka ha mụọ isiokwu a ga-amụ n’Ụlọ Nche n’izu ahụ ná mgbede ha ji enwe Ofufe Ezinụlọ.